Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na March: Nyefee akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Gbaa mbọ ịmalitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl. April na May: Magazin Ụlọ Nche na Teta! A ga-eme mgbalị pụrụ iche ileta ndị malitere inwe mmasị ọhụrụ, bụ́ ndị bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs na okwu ihu ọha ahụ pụrụ iche, bụ́ ndị na-abatabeghị n’ọgbakọ. Ihe mere a ga-eji eleta ndị a bụ iji malite ịmụrụ ndị a na-amalitebeghịrị ọmụmụ Baịbụl ọmụmụ ihe. June: Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe.
◼ Ọgbakọ niile kwesịrị inye ụmụnna Ụlọ Nche na Teta! ndị ọhụrụ ozugbo e nwetara ha. Nke a ga-enye ndị nkwusa ohere ịmata ihe ndị dị na ha tupu ha enyefewe ha n’ozi ubi.
◼ Onye onyeisi oche ndị nlekọta họpụtara kwesịrị inyocha ihe ndekọ ego ọgbakọ nke ọnwa December, January, na February. Ọ bụghị otu onye ahụ kwesịrị inyocha nke na-eso ya. Mgbe e nyochasịrị ya, e kwesịrị ịma ọkwa na e nyochaala ya mgbe ọzọ a ga-agụrụ ọgbakọ akụkọ ndekọ ego.—Lee Instructions for Congregation Accounting (S-27).
◼ Isiokwu nke mgbakọ distrikti nke afọ 2008 bụ “Ndị Mmụọ Chineke Na-edu.” Ozi Alaeze Anyị nke April ga-ebu ihe ndị ga-enyere gị aka ime ndokwa iji gazuo ụbọchị atọ ahụ. Ọ bụrụ na ọ dị gị mkpa ịrịọ onye were gị n’ọrụ ka o nye gị oge iji gazuo ụbọchị atọ ahụ, egbula oge ime otú ahụ.
◼ Isiokwu okwu ihu ọha pụrụ iche maka oge Ncheta Ọnwụ Jizọs nke afọ 2008 bụ “Ònye Ruru Eru Ịchị Ụmụ Mmadụ?” Lee ịma ọkwa yiri ya n’Ozi Alaeze Anyị nke September 2007.
◼ E kwesịrị iji kaadị Memorial Report (S-7) zitere alaka ụlọ ọrụ ọnụ ọgụgụ ndị bịaranụ ozugbo Ncheta Ọnwụ Jizọs gasịrị, e nwekwara ike iji akwụkwọ ozi zite ya. Mgbe ihe karịrị otu ọgbakọ mekọtara ya ọnụ, ọ bụ naanị otu ọgbakọ kwesịrị inye ọnụ ọgụgụ ndị niile bịaranụ ma depụtasịa aha ọgbakọ niile zukọtara ọnụ.
◼ Anyị chọrọ ichetara unu na ọgbakọ niile kwesịrị ịgwa alaka ụlọ ọrụ oge ha ji amụ ihe ka ọ na-erule January 1, 2008. Ọ bụrụ na unu emebeghị nke a, odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ime ya ozugbo site n’idejupụta na izitere alaka ụlọ ọrụ kaadị bụ Congregation Meeting Information (S-5). N’ihi nke a, anyị na-ezitere ọgbakọ ọ bụla kaadị a mkpụrụ abụọ.