Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 7/08 p. 2-3
  • Ịma Ọkwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịma Ọkwa
  • Ozi Alaeze Anyi—2008
Ozi Alaeze Anyi—2008
km 7/08 p. 2-3

Ịma Ọkwa

◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na July na August: E nwere ike inyefe nke ọ bụla n’ime broshuọ ndị a dị peeji 32: Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi, Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile, Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!, Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!, “Lee! Ana M Eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ,” Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ̀ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie?, Nọrọ na Nche!, Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs, na Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya? September: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Gbalịsie ike ịmalite iduziri ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl n’oge mbụ ị gara na nke ha. Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ enweela akwụkwọ a enwee, mee ka ha hụ otú ha pụrụ isi rite uru na ya site n’igosi ha, n’ụzọ dị nkenke, otú e si eji ya amụ Baịbụl. October: Magazin Ụlọ Nche na Teta! Ebe ndị mmadụ gosiri mmasị, nye ha traktị bụ́ Ị̀ Ga-achọ Ịmatakwu Banyere Bible? ma kọwaara ha ihe dị na ya iji mara ma ị̀ ga-amalite iduziri ha ọmụmụ Baịbụl.

◼ Ebe ọ bụ na ọnwa August nwere ngwụsị izu ise zuru ezu, ọ ga-abụ ọnwa magburu onwe ya ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka.

◼ Malite na September, isiokwu okwu ihu ọha ndị nlekọta sekit ga na-ekwu bụ “Na-eje Ije n’Ikwesị Ntụkwasị Obi.”

◼ A na-atụ aro ka a na-ezitere alaka ụlọ ọrụ fọm ndị chọrọ ịbanye n’ozi ọsụ ụzọ oge niile dejupụtara, ọ dịkarịa ala iri ụbọchị atọ tupu ụbọchị ha chọrọ ịmalite eruo. Odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ịtụleghachi fọm ndị ahụ iji jide n’aka na e dejupụtara ha nke ọma. Ọ bụrụ na ndị dejupụtara ya apụghị icheta kpọmkwem ụbọchị e mere ha baptizim, ha kwesịrị ịhọrọ otu ụbọchị ma buru ya n’uche. Odeakwụkwọ kwesịrị idetu ụbọchị ahụ na Congregation’s Publisher Record (S-21).

◼ Alaka ụlọ ọrụ anaghị ahụ maka ọda akwụkwọ nke ndị nkwusa n’otu n’otu. Onyeisi oche ndị nlekọta kwesịrị ime ndokwa maka ịma ọkwa kwa ọnwa tupu e zigara alaka ụlọ ọrụ ọda akwụkwọ nke ọgbakọ kwa ọnwa ka ndị niile nwere mmasị inweta akwụkwọ nke onwe ha nwee ike ịgwa nwanna na-elekọta akwụkwọ. Biko buru n’uche akwụkwọ ndị bụ́ ndị a na-emere ọda pụrụ iche.

◼ Dị ka a na-eme kwa afọ, e kwesịrị ịgụkọ akwụkwọ na magazin niile e nwere n’ọgbakọ n’August 31, 2008, ma ọ bụ n’ụbọchị kasị dị ya nso, dị ka o kwere mee. Ngụkọ a yiri ọgụgụ nwanna ihe karịrị otu ọgbakọ na-esi n’aka ya atụ ọda akwụkwọ na-agụ akwụkwọ ole e nwere kwa ọnwa, e kwesịkwara idebanye ọnụ ọgụgụ ha na fọm Literature Inventory (S-18). E kwesịrị ịjụta onye ma ọ bụ ndị na-elekọta magazin, magazin ole e nwere. Odeakwụkwọ nke ọgbakọ a na-esi n’aka ya atụ ọda akwụkwọ kwesịrị ịhụ maka ngụkọ ahụ. Ya na onyeisi oche ndị nlekọta nke ọgbakọ a na-esi n’aka ya atụ ọda akwụkwọ ga-abịanye aka na fọm ahụ. Ọgbakọ ọ bụla a na-esi n’aka ya atụ ọda akwụkwọ ga-enweta fọm Literature Inventory atọ. Biko ziterenụ alaka ụlọ ọrụ otu fọm tupu September 6 agafee. Debenụ otu na faịlụ unu. Unu pụrụ iji fọm nke fọdụrụnụ mee mgbakọ na mwepụ unu ga-eme na ya.

◼ A na-ezitere ọgbakọ nke ọ bụla mpempe akwụkwọ Literacy Report abụọ. E kwesịrị idejupụta fọm a ma ọgbakọ ò nwere klas na-akụzi ka e si agụ na ka e si ede ma ọ bụ na o nweghị. Biko weghachirinụ alaka ụlọ ọrụ otu n’ime fọm ahụ n’August 1. Debenụ nke ọzọ na faịlụ ọgbakọ unu.

◼ E kwesịrị iji akwụkwọ Bible Na-akụzi na-amalite iduziri ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl kama iji broshuọ Na-achọ. E nwere ike ịnọgide na-enye ndị mmadụ broshuọ Na-achọ n’ozi ruo mgbe nke e nwere gwụrụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya