Akụkọ Ozi
Jehova Chineke, bụ́ Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ, anọgidela na-aza arịrịọ a na-arịọ ya ka o zitekwuo ndị ọrụ n’ubi Nigeria. (Mat. 9:37, 38) Anyị ahụla nke a n’ọnụ ọgụgụ ndị ọsụ ụzọ oge niile nyere akụkọ ozi ha n’ọnwa October 2008, bụ́ ndị dị 28,318. Ọ bụrụ na e jiri ya tụnyere ndị ọsụ ụzọ oge niile nyere akụkọ ozi ha n’ọnwa October afọ gara aga, o ji ihe dị ka pasent iri mụbaa. Ì nwere ike ịkwado ma nyere, ma ọ dịghị ihe ọzọ, otu onye ezinụlọ gị aka ka ọ malite ọrụ ọsụ ụzọ oge niile?