Akwụkwọ Ozi Sitere n’Aka Òtù Na-achị Isi
Ezi Ndịàmà Jehova Ibe Anyị:
Obi dị anyị nnọọ ụtọ idetara unu bụ́ ezigbo ụmụnna anyị akwụkwọ ozi! Ọ dị anyị otú ọ dị Jọn onyeozi, bụ́ onye sịrị na ya ‘hụrụ ndị kwere ekwe ibe ya n’anya n’ezie’ ma ṅụrịa ọṅụ na ha “na-eje ije n’eziokwu ahụ.” (2 Jọn 1, 4) Lee nnọọ otú eziokwu ahụ sirila wetara anyị niile ngọzi! Eziokwu ahụ emeela ka ọ gharazie inwe ihe jikọrọ anyị na Babịlọn Ukwu ahụ, ozizi ya na omenala ya ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke. Irube isi n’Okwu Chineke enyerela anyị aka ịbụ ndị nwere ịhụnanya, ndị dị umeala n’obi, na ndị na-eme ebere. Eziokwu ahụ emeekwala ka anyị na Chineke nwee ike ịdị ná mma, meekwa ka anyị nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi.
Anyị nwekwara nnọọ obi ekele maka mmụọ Jehova, bụ́ nke na-eduzi anyị ma na-enye anyị ike kwa ụbọchị! Obi siri anyị ike na ntụle a tụlere akụkụ dị iche iche nke onyinye a sitere n’aka Jehova ná Mgbakọ Distrikti “Ndị Mmụọ Chineke Na-edu” anyị nwere na nso nso a mere unu obi ụtọ. Ka ọnọdụ ụwa na-akawanye njọ, ọ dị oké mkpa ka anyị tụkwasị Jehova obi na ọ ga-enye anyị mmụọ nsọ ya dị ike iduzi anyị n’oge tara akpụ nke na-abịanụ.
Obi siri anyị nnọọ ike na ahụmahụ ndị na-emetụ n’ahụ́ unu gụrụ n’akwụkwọ mgbaafọ anyị banyere ụmụnna anyị ndị tachirila obi n’ọtụtụ ahụhụ ha tara maka okwukwe ha metụrụ unu n’obi. Ọ bụkwa ihe na-atụ n’anya na ọ dịbeghị anya e mere ọtụtụ n’ime ndị a kwesịrị ntụkwasị obi baptizim tupu a malite ịkpagbu ha, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na e mebeghị ha baptizim. Anyị hụrụ ha nnọọ n’anya n’ihi otú ha si kwesị ntụkwasị obi ma nọgide na-eme ihe dị mma! N’eziokwu, ihe nlereanya ha magburu onwe ya emeela ka anyị kpebisikwuo ike ịnọgide na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ n’agbanyeghị ahụhụ ndị anyị nwere ike ịta n’ihi ya.—1 Tesa. 1:6-8.
Ezi ụmụnna anyị, anyị maara na unu na-enwe ọtụtụ nsogbu, ma nsogbu ego ma ụdị nsogbu ndị ọzọ, bụ́ ndị unu na-edi iji hụ na ịhụnanya dị n’ezinụlọ unu. Ọ na-esidịrị ụfọdụ n’ime unu ike ijechi ozi ọma na ọmụmụ ihe anya. Ọ bụ ya mere na mgbe anyị tụlechara ihe ndị a niile ma kpee ekpere banyere ha, anyị mere mgbanwe ụfọdụ n’otú a ga-esizi na-enwe ọmụmụ ihe ọgbakọ malite na January 1, 2009. Obi siri anyị ike na mgbanwe a ga-enyere unu aka inwekwu oge maka ọmụmụ ihe onwe onye na nke ezinụlọ.
Ná mgbakọ ukwu na mgbakọ nta dị iche iche e mere n’afọ 2008, anyị niile nwere nnọọ obi ụtọ ịhụ ka e mere ọtụtụ ndị baptizim. Ụfọdụ n’ime ha ka bụ ụmụaka. Anyị na-aja unu bụ́ ndị mụrụ ụmụ mma maka ịzụlite ụmụ unu ka ha mara eziokwu ahụ na ịgba ha ume ịrara onwe ha nye Jehova ma jeere ya ozi mgbe ha ka dị obere. Na ndị a na-eto eto anyị hụrụ n’anya ruru ịbụ ndị e mere baptizim n’agbanyeghị ọtụtụ ule ndị ha na-enwe n’ụlọ akwụkwọ, na-egosi na ndị mụrụ ha zụrụ ha nke ọma.—Ọma 128:1-6.
Ihe ọzọ anyị chọrọ ikwu banyere ya bụ mmụba dị egwu e nwere n’ọnụ ọgụgụ ndị e duziiri ọmụmụ Baịbụl—ndị ozi ala ọzọ na ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche rụsikwara ọrụ ike n’ịhụ na e nwere mmụba a. Anyị niile so n’Òtù Na-achị Isi nwere nnọọ obi ụtọ maka ezigbo mbọ ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị n’ụwa niile na-agba n’ịsị ndị nwere obi eziokwu, “Bịa!,” na-akpọkwa ndị niile akpịrị na-akpọ nkụ òkù ka ha bịa “nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.” (Mkpu. 22:17) Anyị na-asị mmadụ narị puku abụọ na iri puku asatọ na itoolu na narị isii na iri asaa na asatọ, bụ́ ndị e mere baptizim n’afọ gara aga, nnọọnụ!
Ọ dị mma ka anyị na-echetara onwe anyị mgbe mgbe ihe Jọn onyeozi kwuru, nke bụ́: “Ụwa na-agabiga, ọchịchọ ya na-agabigakwa, ma onye na-eme uche Chineke ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” (1 Jọn 2:17) Ọ dị oké mkpa ka anyị na-echeta mgbe niile na anyị bi nnọọ nso n’oge ahụ ụwa a ‘ga-agabiga’! Anyị ga-abụ ndị maara ihe ma anyị mee ka ndụ anyị hiwe isi ‘n’ime uche Chineke’ na ịdị ‘na-eche nche.’ (Mat. 24:42) Anyị agatụghị akwa ụta ma anyị mee otú ahụ, Jehova ga-ejikwa obiọma ya kwụọ anyị ụgwọ ọrụ.—Aịza. 63:7.
Anyị nwere olileanya na ahụmahụ ndị na-emetụ n’ahụ́ si ná mba dị iche iche, bụ́ ndị dị n’akwụkwọ mgbaafọ anyị nke afọ a, ga-agba unu niile ume ibute ihe ndị metụtara Alaeze ahụ ụzọ ná ndụ unu. Anyị chọrọ ime ka unu mara na anyị na-echeta unu ma na-etinye unu n’ekpere mgbe niile. Maranụ na anyị hụrụ unu n’anya nke ukwuu. Ka Jehova wụsa unu ngọzi ya n’ụba.
Ụmụnna unu,
Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova