Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na July na August: Ndị nkwusa nwere ike inyefe nke ọ bụla n’ime broshuọ ndị a dị peeji 32: Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi, Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile, Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!, Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!, “Lee! Ana M Eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ,” Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ̀ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie?, Nọrọ na Nche!, Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs, na Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya? September: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Mgbe ọ bụla o kwere mee, ndị nkwusa ga-agba mbọ ịmalite ọmụmụ Baịbụl n’oge mbụ ha ga-enyefe ndị nwe ụlọ akwụkwọ a. Jiri nkeji ole na ole gosi ndị nwe ụlọ otú ha ga-esi erite uru n’ọmụmụ Baịbụl. October: Ụlọ Nche na Teta! N’ebe ọ bụla ndị nwe ụlọ gosiri mmasị, nye ha traktị bụ́ Ị̀ Chọrọ Ịma nke Bụ́ Eziokwu?, gị na ha tuleekwa ya. Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ enweela traktị ahụ, ndị nkwusa kwesịrị ịgbalịsi ike malitere ha ọmụmụ Baịbụl.
◼ Ebe ọ bụ na ọnwa August nwere ngwụsị izu ise zuru ezu, ọ ga-abụ ọnwa magburu onwe ya iji rụọ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka.
◼ Kaseet Ọhụrụ A Na-egere Egere E Nwere:
Buru Ụbọchị Jehova n’Uche Na-ebi Ndụ—On Compact Disc (Ọ Dị na CD) —Bekee
Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ—On Compact Disc (Ọ Dị na CD) —Bekee
Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!—On Compact Disc (Ọ Dị na CD) —French