Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite n’Eprel 26, 2010. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi a, bụ́ nke ga-ewe nkeji iri abụọ. Ihe ndị a ga-atụle ga-abụ ihe ndị a mụrụ n’izu Mach 1 ruo izu Eprel 26, 2010.
1. Gịnị ka Neomi bu n’obi kwuo, sị: ‘Ọ bụ Jehova wedara m ala, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile kpatakwaara m ọdachi’? (Rut 1:21) [w05 3/1 p. 27 para. 1]
2. Olee àgwà ndị mere ka Rut bụrụ “ezigbo nwaanyị”? (Rut 3:11) [w05 3/1 p. 28 para. 6]
3. Olee otú okwu ahụ Elkena kwuru na ‘ọ̀ bụ na ya akaghị ụmụ ndị ikom iri mma’ si gbaa nwunye ya ume? (1 Sam. 1:8) [w90 3/15 p. 27 para. 5-6]
4. Gịnị mere o kwesịghị ekwesị ụmụ Izrel ịrịọ ka e nye ha eze? (1 Sam. 8:5) [w05 9/15 p. 20, para. 17]
5. Mgbe Samuel ‘mere agadi ma chaa isi awọ́,’ olee otú o si bụrụ onye e ji ama atụ n’ihe gbasara ikpe ekpere maka ndị ọzọ, oleekwa ihe nke ahụ na-egosi? (1 Sam. 12:2, 23) [w07 6/1 p. 29 para. 14-15]
6. Olee ihe mere Sọl ji meere ndị Kenaịt ebere? (1 Sam. 15:6) [w05 3/15 p. 22 para. 10]
7. Gịnị mere Sọl ji jụọ Devid, sị: “Nwa m, ị̀ bụ nwa onye?” (1 Sam. 17:58) [w07 8/1 p. 31 para. 3, 5]
8. Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe Devid mere mgbe ọ banyere n’ezigbo nsogbu na Gat? (1 Sam. 21:12, 13) [w05 3/15 p. 24 para. 4]
9. Mgbe Devid nọ ná nsogbu, chọọ onye ga-agba ya ume ma kwado ya, olee otú Jọnatan enyi ya si gosi na ya hụrụ ya n’anya, dịrịkwa umeala n’obi? (1 Sam. 23:17) [lv p. 28 para. 10, ihe e dere n’ala ala peeji nke 30.]
10. Olee ihe anyị na-amụta n’ọgịga Sọl gara na nke nwaanyị mgbaasị bi na En-dọọ? (1 Sam. 28:8-19) [w05 3/15 p. 24 para. 7]