Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na Septemba: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Gbalịa ka ị malitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl n’ụbọchị mbụ i ziri ha ozi ọma. Ọktoba: Magazin Ụlọ Nche na Teta! E nwee onye gosiri mmasị, nye ya traktị bụ́ Ị̀ Chọrọ Ịma nke Bụ́ Eziokwu?, gbalịakwa ịmalitere onye ahụ ọmụmụ Baịbụl. Nọvemba: Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu? E mechaa, anyị ga-agwa unu ihe niile gbasara otú a ga-esi ekesa broshuọ a a ga-ekesa n’ụwa niile. Ka unu na-enyefe broshuọ ọhụrụ a, na-enyefekwanụ broshuọ ndị a: Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ̀ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie?, Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!, na Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya? Disemba: Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ. Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ nwere ụmụaka, nye ha akwụkwọ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ.
◼ A ga-ekwu okwu ihu ọha pụrụ iche maka oge e ji echeta ọnwụ Jizọs n’afọ 2011 n’izu Eprel 25, 2011. A ga-agwa unu isiokwu ya ka oge na-aga. Ọgbakọ ndị ga-enwe onye nlekọta sekit ma ọ bụ mgbakọ ná ngwụsị izu ahụ ga-ekwu okwu ihu ọha ahụ pụrụ iche n’izu na-esonụ. Ọ dịghị ọgbakọ kwesịrị ikwu ya tupu Eprel 25.
◼ Malite n’izu Mach 14, 2011, akwụkwọ a ga-amụ n’Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ bụ ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke.’ Ọgbakọ ndị chọrọ akwụkwọ a kwesịrị ịtụ ọda ya n’oge ọzọ ha ga-atụ ọda akwụkwọ.