Akụkọ Ozi
N’ọnwa Jun, ndị nkwusa 300,264 nyere akụkọ ozi ha. Malite n’ọnwa Septemba 2009 ruo n’ọnwa Jun 2010, ndị nyere akụkọ ozi ha n’ọnwa Jun kacha ndị nyere akụkọ ozi ha n’ọnwa ọ bụla ọzọ. Ọnụ ọgụgụ a jikwa ndị nkwusa 9,612 karịa ndị nkwusa nyere akụkọ ozi ha n’ọnwa Jun afọ 2009. Ebe ọ bụ na oge fọdụrụ dị ntakịrị, ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma.—1 Kọr. 7:29; 2 Tim. 4:2.