Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enye n’ọnwa Mee: Ụlọ Nche na Teta! Mgbe ị gara nletaghachi na nke ndị nwere mmasị, ma hà bụ ndị bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs ma ọ̀ bụkwanụ ndị na-abịa nzukọ anyị ndị ọzọ ma ha anaghị eso eme ihe ndị a na-eme n’ọgbakọ, gbaa mbọ nye ha akwụkwọ Bible Na-akụzi, gbalịakwa jiri ya malitere ha ọmụmụ Baịbụl. Jun: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ nwere akwụkwọ a, e nwere ike inye ha akwụkwọ ọ bụla merela ochie ọgbakọ nwere. Ma ọ bụkwanụ nye ha akwụkwọ Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe. Julaị na Ọgọst: Ndị nkwusa nwere ike inye ndị mmadụ nke ọ bụla n’ime broshuọ ndị a dị peeji 32: Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi, Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!, Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!, Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ̀ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie?, na Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya?
◼ Na Fraịdee, abalị 27 nke ọnwa Mee, 2011, a gaghị anabata ndị ọbịa na Betel dị n’Igieduma. N’ihi ya, biko, abịakwala ileta Betel n’ụbọchị ahụ ma ọ bụkwanụ iburu akwụkwọ unu.