Akụkọ Ozi
N’ọnwa Disemba 2010, anyị duziiri narị puku mmadụ isii na narị mmadụ anọ na iri ise na isii ọmụmụ Baịbụl. O doro anya na ọtụtụ n’ime ndị a anyị duziiri ọmụmụ Baịbụl nwere obi ụtọ. Ha dị ka otu onye nwe ụlọ e duziiri ọmụmụ ihe n’otu obodo, bụ́ onye sịrị: “Anyị nọ na-ekpe ekpere kemgbe ka ndị mmadụ bịa kụziere anyị eziokwu banyere Chineke. Ọbịbịa unu bịara kụziere anyị Baịbụl gosiri na Chineke zara ekpere anyị. Unu wepụtara nnọọ oge zaa anyị ajụjụ ndị anyị jụrụ unu, unu kọwakwaara anyị Baịbụl otú dị mma.” Ka anyị kpebisie ike inyere ndị chọrọ ịmụta ihe Baịbụl na-akụzi aka ka ha mụta ya.—Mat. 7:13, 14.