Akụkọ Ozi
Akụkọ ozi anyị nke ọnwa Julaị 2011 magburu onwe ya. O nweghị ọnwa anyị nyere akụkọ ozi hà ka ya n’afọ ije ozi 2010. Ndị nkwusa ndị nyere akụkọ ozi ha dị 306,817. N’ihi ya, a gbakọọ ndị nkwusa nyere akụkọ ozi ha n’afọ ije ozi 2011 ma jiri iri na abụọ kee ha, ndị nkwusa anyị nwere na Naịjirịa ugbu a dị 301,430. Nke a pụtara na anyị ji obere ihe karịa ole anyị dị n’afọ ije ozi 2010.