Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enye ndị mmadụ n’ọnwa Jun: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Gbalịa malitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl n’ụbọchị mbụ i ziri ha ozi ọma. Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ nwere akwụkwọ Bible Na-akụzi ma ha achọghị ka e duziwere ha ọmụmụ Baịbụl, e nwere ike nye ha magazin ọ bụla merela ochie ma ọ bụkwanụ broshọ ọ bụla ga-amasị ha. Julaị na Ọgọst: Ndị nkwusa nwere ike inye ndị mmadụ nke ọ bụla n’ime broshọ ndị a dị peeji 32: Gee Chineke Ntị, Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi ma ọ bụ Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke! Gbalịakwa malitere ha ọmụmụ Baịbụl. Ị gaa nletaghachi na nke onye nwere mmasị, jiri akwụkwọ Bible Na-akụzi malitere ya ọmụmụ Baịbụl. Ma, ọ bụrụ na ị chọpụta na otu n’ime broshọ ndị a ga-akara onye ahụ mma, jiri ya malitere ya ọmụmụ Baịbụl. Septemba: Ụlọ Nche na Teta! Mgbe ị gara nletaghachi na nke ndị nwere mmasị, gbaa mbọ nye ha akwụkwọ Bible Na-akụzi, gbalịakwa jiri ya malitere ha ọmụmụ Baịbụl. Ma, ọ bụrụ na ị chọpụta na Gee Chineke Ntị ma ọ bụkwanụ Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi ga-akara ndị ahụ mma, jiri ya malitere ha ọmụmụ Baịbụl.
◼ Anyị na-agba mmadụ niile ume ka ha lee vidio isiokwu ya bụ: Our Whole Association of Brothers. Ọ bụrụ na unu enweghị ya, unu kwesịrị ịtụ ọda ya n’ọgbakọ unu.
◼ Anyị chọrọ ịgwa unu na anyị agbanweela adres e ji ezitere ọfịs anyị dị na Lagos ozi. Adres anyị bụzi: P.M.B. 21845, Alausa 100212, Ikeja, Lagos State.