Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enye ndị mmadụ n’ọnwa Disemba: Jiri traktị ọ bụla unu nwere gaa ozi ọma. Ọ bụrụ na onye nwe ụlọ achọọ ka a mụwara ya Baịbụl, jiri akwụkwọ Bible Na-akụzi gosi ya otú anyị si amụrụ ndị mmadụ Baịbụl ma ọ bụkwanụ gị ejiri broshọ bụ́ Gee Chineke Ntị ma ọ bụkwanụ Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi. Jenụwarị na Febụwarị: Ndị nkwusa nwere ike inye ndị mmadụ nke ọ bụla n’ime broshọ ndị a dị peeji 32: Gee Chineke Ntị, Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi ma ọ bụ Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke! Gbalịakwa malitere ha ọmụmụ Baịbụl. Ị gaa nletaghachi na nke onye nwere mmasị, jiri akwụkwọ Bible Na-akụzi malitere ya ọmụmụ Baịbụl. Ma, ọ bụrụ na ị chọpụta na otu n’ime broshọ ndị a ga-akara onye ahụ mma, jiri ya malitere ya ọmụmụ Baịbụl. Mach: Ụlọ Nche na Teta! Ị gaa nletaghachi na nke onye nwere mmasị, jiri akwụkwọ Bible Na-akụzi malitere ya ọmụmụ Baịbụl. Ma, ọ bụrụ na ị chọpụta na Gee Chineke Ntị ma ọ bụkwanụ Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi ga-akara onye ahụ mma, jiri ya malitere ya ọmụmụ Baịbụl.
◼ A ga-echeta Ọnwụ Jizọs na Mọnde, abalị iri na anọ, n’ọnwa Eprel 2014.
◼ Ndị nkwusa ndị ga-asụ ụzọ inyeaka n’ọnwa Mach afọ 2013 ga-eji aka ha kpebie ma hà ga-enye awa iri atọ n’ọnwa ahụ ma ọ̀ bụkwanụ awa iri ise. Ọ bụrụkwa na onye nlekọta sekit ga-eleta ọgbakọ unu n’ọnwa Mach 2013, ndị niile na-asụ ụzọ inyeaka n’ọnwa ahụ ga-eso ndị ọsụ ụzọ oge niile gaa nzukọ ha na onye nlekọta sekit ga-enwe. Ha ga-anọ ná nzukọ ahụ ruo n’isi.