Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enye ndị mmadụ n’ọnwa Jenụwarị na Febụwarị: Ndị nkwusa nwere ike inye ndị mmadụ nke ọ bụla n’ime broshọ ndị a dị peeji 32: Gee Chineke Ntị, Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi ma ọ bụ İ Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke! Gbalịakwa malitere ha ọmụmụ Baịbụl. Ị gaa nletaghachi na nke onye nwere mmasị, jiri akwụkwọ Bible Na-akụzi malitere ya ọmụmụ Baịbụl. Ma, ọ bụrụ na ị chọpụta na otu n’ime broshọ ndị a ga-akara onye ahụ mma, jiri ya malitere ya ọmụmụ Baịbụl. Mach na Eprel: Ụlọ Nche na Teta! Ị gaa nletaghachi na nke onye nwere mmasị, jiri akwụkwọ Bible Na-akụzi malitere ya ọmụmụ Baịbụl. Ma, ọ bụrụ na ị chọpụta na Gee Chineke Ntị ma ọ bụkwanụ Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi ga-akara onye ahụ mma, jiri ya malitere ya ọmụmụ Baịbụl.
◼ Obi dị anyị ụtọ ịgwa unu na n’afọ 2013, a ga-enwe mgbakọ sekit na ụbọchị mgbakọ pụrụ iche n’asụsụ ndị ogbi (ASL) n’ebe ndị a: Na Badagrị, ọ ga-abụ na Mach 16-17 nakwa n’Ọgọst 18. Na Bini Siti, ọ ga-abụ na Febụwarị 8-9 nakwa na Jun 30. Ndị ogbi ndị ga-aga mgbakọ Sekit n’Ịbadan na Mach 23-24, ga-aga ụbọchị mgbakọ pụrụ iche na Leki na Jun 9. Na Kwali, ọ ga-abụ na Febụwarị 16 nakwa na Jun 22-23. Na Leki, ọ ga-abụ na Mach 30-31 nakwa na Jun 8. N’Uli, ọ ga-abụ na Febụwarị 24 nakwa na Mee 4-5. A ga-enwekwa mgbakọ sekit na ụbọchị mgbakọ pụrụ iche n’asụsụ French. A ga-enwe ha na Badagrị na Mach 24 nakwa na Jun 15-16. Ná ndị nke a ga-enwe n’asụsụ ndị ogbi, okwu niile a ga-ekwu ga-abụ n’asụsụ ndị ogbi. Na nke ahụ a ga-enwe n’asụsụ French, okwu niile ga-abụkwa n’asụsụ French. Ọ bụrụ na ị na-aghọta asụsụ ndị a, gbalịa gaa mgbakọ ndị ahụ.
◼ Malite n’ọnwa Febụwarị 2013, isiokwu okwu ihu ọha ndị nlekọta sekit ga na-ekwu bụ: ‘Ozi Ọma A Ga-ezisara Mba Niile, Ebo Niile, na Ndị Na-asụ Asụsụ Niile.’
◼ Ozugbo e buteere ọgbakọ Ụlọ Nche na Teta!, e kwesịrị iwepụtara ha ndị nkwusa. Nke a ga-eme ka ha gụọ ha ma mara ihe ha na-ekwu. Ọ ga-emekwa ka ha mara isiokwu ha na onye ha gara nletaghachi na nke ya ma ọ bụkwanụ onye ha na-amụrụ Baịbụl ga-ekwurịta. E kwesịrị ịhapụ ndị nkwusa ka ha nye ndị mmadụ Ụlọ Nche na Teta! mgbe ọ bụla ha chọrọ.