Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 1/13 p. 4
  • Ịma Ọkwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịma Ọkwa
  • Ozi Alaeze Anyi—2013
Ozi Alaeze Anyi—2013
km 1/13 p. 4

Ịma Ọkwa

◼ Akwụkwọ a ga-enye ndị mmadụ n’ọnwa Jenụwarị na Febụwarị: Ndị nkwusa nwere ike inye ndị mmadụ nke ọ bụla n’ime broshọ ndị a dị peeji 32: Gee Chineke Ntị, Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi ma ọ bụ İ Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke! Gbalịakwa malitere ha ọmụmụ Baịbụl. Ị gaa nletaghachi na nke onye nwere mmasị, jiri akwụkwọ Bible Na-akụzi malitere ya ọmụmụ Baịbụl. Ma, ọ bụrụ na ị chọpụta na otu n’ime broshọ ndị a ga-akara onye ahụ mma, jiri ya malitere ya ọmụmụ Baịbụl. Mach na Eprel: Ụlọ Nche na Teta! Ị gaa nletaghachi na nke onye nwere mmasị, jiri akwụkwọ Bible Na-akụzi malitere ya ọmụmụ Baịbụl. Ma, ọ bụrụ na ị chọpụta na Gee Chineke Ntị ma ọ bụkwanụ Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi ga-akara onye ahụ mma, jiri ya malitere ya ọmụmụ Baịbụl.

◼ Obi dị anyị ụtọ ịgwa unu na n’afọ 2013, a ga-enwe mgbakọ sekit na ụbọchị mgbakọ pụrụ iche n’asụsụ ndị ogbi (ASL) n’ebe ndị a: Na Badagrị, ọ ga-abụ na Mach 16-17 nakwa n’Ọgọst 18. Na Bini Siti, ọ ga-abụ na Febụwarị 8-9 nakwa na Jun 30. Ndị ogbi ndị ga-aga mgbakọ Sekit n’Ịbadan na Mach 23-24, ga-aga ụbọchị mgbakọ pụrụ iche na Leki na Jun 9. Na Kwali, ọ ga-abụ na Febụwarị 16 nakwa na Jun 22-23. Na Leki, ọ ga-abụ na Mach 30-31 nakwa na Jun 8. N’Uli, ọ ga-abụ na Febụwarị 24 nakwa na Mee 4-5. A ga-enwekwa mgbakọ sekit na ụbọchị mgbakọ pụrụ iche n’asụsụ French. A ga-enwe ha na Badagrị na Mach 24 nakwa na Jun 15-16. Ná ndị nke a ga-enwe n’asụsụ ndị ogbi, okwu niile a ga-ekwu ga-abụ n’asụsụ ndị ogbi. Na nke ahụ a ga-enwe n’asụsụ French, okwu niile ga-abụkwa n’asụsụ French. Ọ bụrụ na ị na-aghọta asụsụ ndị a, gbalịa gaa mgbakọ ndị ahụ.

◼ Malite n’ọnwa Febụwarị 2013, isiokwu okwu ihu ọha ndị nlekọta sekit ga na-ekwu bụ: ‘Ozi Ọma A Ga-ezisara Mba Niile, Ebo Niile, na Ndị Na-asụ Asụsụ Niile.’

◼ Ozugbo e buteere ọgbakọ Ụlọ Nche na Teta!, e kwesịrị iwepụtara ha ndị nkwusa. Nke a ga-eme ka ha gụọ ha ma mara ihe ha na-ekwu. Ọ ga-emekwa ka ha mara isiokwu ha na onye ha gara nletaghachi na nke ya ma ọ bụkwanụ onye ha na-amụrụ Baịbụl ga-ekwurịta. E kwesịrị ịhapụ ndị nkwusa ka ha nye ndị mmadụ Ụlọ Nche na Teta! mgbe ọ bụla ha chọrọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya