Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enye ndị mmadụ n’ọnwa Septemba na Ọktoba: Ụlọ Nche na Teta! Nọvemba na Disemba: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?, Ị̀ Chọrọ Ịma nke Bụ́ Eziokwu?, ma ọ bụ traktị ọ bụla unu nwere.
◼ A ga-ekwu okwu ihu ọha pụrụ iche nke afọ 2014 n’izu na-amalite n’Eprel 21, 2014. A ga-agwa unu isiokwu ya ka oge na-aga. Ọgbakọ ọ bụla ha na onye nlekọta sekit nọ n’izu ahụ ma ọ bụ ọgbakọ ọ bụla ga-aga mgbakọ ná ngwụcha izu ahụ ga-ekwu okwu ihu ọha ahụ pụrụ iche n’izu na-esonụ. Ọgbakọ ọ bụla ekwesịghị ikwu ya tupu Eprel 21.