Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enye ndị mmadụ n’ọnwa Disemba: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? ma ọ bụ Ị̀ Chọrọ Ịma nke Bụ́ Eziokwu? Jenụwarị na Febụwarị: Ozi Ọma Si n’aka Chineke!, Gee Chineke Ntị ma ọ bụ Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi. Mach: Ụlọ Nche na Teta!
◼ A ga-echeta Ọnwụ Jizọs n’abalị iri abụọ na atọ n’ọnwa Mach 2016.
◼ Malite n’abalị mbụ n’ọnwa Jenụwarị afọ 2015, a gaghịzi na-ewepụta Satọdee mbụ n’ọnwa ka e jiri ya na-amalitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl. Kama, a ga-eji ya na-aga ozi magazin dị ka a na-eme n’ụbọchị Satọdee ndị ọzọ. Anyị nwere ike iji magazin ma ọ bụ akwụkwọ ọ bụla ọzọ anyị ji amụrụ ndị mmadụ Baịbụl malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl n’ụbọchị ọ bụla.