Akụkọ Ozi
N’agbanyeghị na ọtụtụ ụmụnna anyị anaghị enwecha efe, ha na-ahazi oge ha kwa afọ ka ha nwee ike ịga zie ndị mmadụ ozi ọma n’agbata ọnwa Ọgọst na ọnwa Nọvemba n’ókèala ndị a na-anaghị ejekarị ozi ọma. O nwere otu nwanna nwaanyị ji oge ọ nọ ezumike gaa ozi ọma ụdị ebe ahụ. Ọ sịrị: “Agatụbeghị m ezumike dị ka nke a. M naghị akwa mmakwaara na m gara ya.” Ụmụnna anyị ndị gara ebe ndị ahụ na-ahụkarị ndị chọrọ ịmata eziokwu dị na Baịbụl ma chọọ ime ihe Chineke na-achọ. Lee ihe ụfọdụ ụmụnna anyị ndị garala ụdị ozi a kọrọ:
• O nwere ụmụnna iri abụọ na ise si Ogun Steeti gaa Kogi Steeti ikwusa ozi ọma n’ókèala a na-anaghị ejekarị ozi ọma. Mgbe ha lọtara, ha sịrị: “Mmadụ iri itoolu na asatọ bịara gere Okwu Ihu Ọha anyị kwuru n’obodo a na-akpọ Ejuku. Mgbe e kwuchara ya, a mara ọkwa ka onye ọ bụla chọrọ ka a bịa na-amụrụ ya Baịbụl gafeta n’oche ihu. Ọ tụrụ anyị n’anya na mmadụ iri abụọ na asatọ pụtara. Ha nwekwara ndidi ruo mgbe e debachara aha ha, adres ha, na nọmba ekwentị ha n’akwụkwọ.”
• Ihe ọzọ ụmụnna anyị kọrọ na-egosi otú eziokwu dị na Baịbụl si enyere ụfọdụ ndị aka. Ụmụnna abụọ kọrọ ihe mere otu ụbọchị ha nọ na-amụrụ otu nwatakịrị ihe n’ihu ụlọ ha. Ha hụrụ ụmụ nwaanyị abụọ na-alụ ọgụ n’ihi ego. Otu n’ime ha dị ime. Ndị agbata obi ha gbalịrị igbo ha, ma ha ekweghị. Nke ahụ dị ime mechara laa ga jikere ọgụ ọzọ. Ka ọ na-abịaghachi, ụmụnna abụọ ahụ gakwuuru ya gwawa ya okwu. Ha gwara ya na e nwere ike imerụ ya ahụ́ ma ọ bụkwanụ merụọ nwa o bu n’afọ ahụ́. Ha gwakwara ya na Jehova ejighị ndụ nwa e bu n’afọ egwu egwu. (Ọpụ. 21:22-25) N’ihi ihe ndị a ha gwara ya, o kpebiri ka nwaanyị ahụ ji ya ụgwọ rie ego ahụ kama ya ga-akpasu Jehova iwe. Ụmụnna ahụ mechakwara mụwara ya ihe.
N’afọ ije ozi 2013, puku ụmụnna atọ na narị anọ na iri na ise gara n’ókèala ndị a na-anaghị ejekarị ozi ọma zie ndị mmadụ ozi ọma. Ị̀ ga-enwe ike ịhazi oge gị ka i soro ná ndị ga-aga nke afọ ije ozi a?—Ọma 110:3.