Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enye ndị mmadụ n’ọnwa Mach na Eprel: Ụlọ Nche na Teta! Mee na Jun: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? ma ọ bụ Ị̀ Chọrọ Ịma nke Bụ́ Eziokwu?
◼ A ga-ekwu okwu ihu ọha pụrụ iche nke afọ 2015 n’izu na-amalite n’Eprel 6. Isiokwu ya bụ “Mgbe Ezinụlọ Niile Ga-enwe Obi Ụtọ.” Ọgbakọ ọ bụla ha na onye nlekọta sekit nọ n’izu ahụ ma ọ bụ ọgbakọ ọ bụla ga-aga mgbakọ n’izu ahụ ga-ekwu okwu ihu ọha ahụ pụrụ iche n’izu na-esonụ. Ọgbakọ ọ bụla ekwesịghị ikwu ya tupu Eprel 6.
◼ A ga-echeta ọnwụ Jizọs na Fraịdee, Eprel 3, 2015. Ọ bụrụ na ọgbakọ unu na-amụ ihe n’ụbọchị Fraịdee, unu kwesịrị iyigharị ụbọchị unu na-amụ ihe n’izu ahụ. Ọ bụrụkwa na unu agaghị eyigharịli ọmụmụ ihe unu n’izu ahụ, unu nwere ike ịhapụ ya. Onye na-ahaziri ndị okenye ọrụ nweziri ike gbubilata ihe omume Nzukọ Ije Ozi nke izu ọzọ n’ọnwa Eprel ma webata nke izu ahụ e chetara ọnwụ Jizọs ma ọ bụrụ na ọ gbasara ọgbakọ unu.