Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite n’Ọktoba 26, 2015.
Olee otú akụkọ a kọrọ ná 2 Ndị Eze 13:18, 19, si egosi na anyị kwesịrị iji obi anyị niile na-ejere Chineke ozi? [Sep. 7, w10 4/15 p. 26 para. 11]
Olee onye na-achị Izrel mgbe Jona bụ onye amụma n’ala ahụ? Oleekwa ihe 2 Ndị Eze 14:23-25 kwuru ga-enyere anyị aka ịghọta otú ihe dị n’oge Jona nọ na-ebu amụma? [Sep. 7, w09 1/1 p. 25 para. 4]
Olee otú Ehaz si gosi na ọ tụkwasịghị ihe Chineke si n’ọnụ Aịzaya onye amụma kwuo obi? Oleekwa ajụjụ onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike ịjụ onwe ya ma e nwee ihe dị ya mkpa ọ chọrọ ikpebi? (2 Eze 16:7) [Sep. 14, w13 11/15 p. 17 para. 5]
Olee otú ndị na-emegide anyị si agwa anyị okwu taa nke yiri otú Rabshake si gwa ndị Juu okwu n’oge ochie? Ma, gịnị ga-enyere anyị aka ịjụ ụdị okwu ahụ? (2 Eze 18:22, 25) [Sep. 14, w10 7/15 p. 13 para. 3-4]
Olee otú ịdị umeala n’obi ka Josaya ga-esi baara anyị uru ma anyị mụwa Baịbụl? (2 Eze 22:19, 20) [Sep. 21, w00 3/1 p. 30 para. 2]
Olee otú ihe ndị ọkachamara gwutere n’ala si gosi na eze abụọ a kpọrọ aha ná 2 Ndị Eze 25:27-30 chịrị n’oge ochie n’eziokwu? [Sep. 28, w12 6/1 p. 5 para. 2-3]
Gịnị bụ ihe atọ Jebez rịọrọ Jehova? Gịnịkwa ka arịrịọ a ọ rịọrọ Jehova na-akụziri anyị gbasara ekpere? (1 Ihe 4:9, 10) [Ọkt. 5, w10 10/1 p. 23]
Olee otú agha ahụ 1 Ihe E Mere 5:18-22 kọrọ akụkọ ya si eme ka obi sie anyị ike n’agha ime mmụọ anyị na-alụ? [Ọkt. 12, w05 10/1 p. 9 para. 7]
Gịnị nyeere Devid aka ịghọta ihe mere Jehova ji nye ụmụ mmadụ iwu ka ha zere ọbara? Gịnịkwa ka anyị na-amụta n’aka Devid? (1 Ihe 11:17-19) [Ọkt. 19, w12 11/15 p. 6-7 para. 12-14]
Gịnị ka Devid na-emeghị mgbe ọ chọrọ ibubata igbe ọgbụgba ndụ na Jeruselem? Gịnịkwa ka anyị mụtara n’akụkọ a? (1 Ihe 15:13) [Ọkt. 26, w03 5/1 p. 10-11 para. 11-13]