Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb16 Mach p. 7
  • Ọnwụ Jizọs Mere Ka Mbilite n’Ọnwụ Nwee Isi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọnwụ Jizọs Mere Ka Mbilite n’Ọnwụ Nwee Isi
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ (2016)
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ezigbo Olileanya nke Dịịrị Ndị Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Ọ Bụ Ezie na Anyị Na-eru Újú, Anyị Anọghị n’Enweghị Olileanya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Nanị Ihe Ga-emeri Ọnwụ!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Ndị Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ Ga-adị Ndụ Ọzọ
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ (2016)
mwb16 Mach p. 7

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ọnwụ Jizọs Mere Ka Mbilite n’Ọnwụ Nwee Isi

Ebe otu ezinụlọ na ndị enyi ha na-eru uju onye ha nwụrụ anwụ, nwanne nwaanyị onye ahụ nwụrụ ana-eche gbasara mbilite n’ọnwụ

O nwere ọtụtụ ihe ọma Chineke ga-emere anyị n’ọdịnihu, ndị ọnwụ Jizọs mere ka ha nwee isi. Anyị na-echetakarị ihe ọma ndị ahụ n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs. Otu n’ime ha bụ mbilite n’ọnwụ. Jehova ekeghị ndị mmadụ ka ha na-anwụ anwụ. Ọ bụ ya mere o ji ewutekarị anyị ma onye nke anyị nwụọ. (1 Kọr. 15:26) O wutere Jizọs mgbe ndị na-eso ụzọ ya na-eru uju mgbe Lazarọs nwụrụ. (Jọn 11:33-35) Jizọs yiri nna ya bụ́ Jehova n’ihe niile. N’ihi ya, obi kwesịrị isi anyị ike na uju anyị na-eru ma onye nke anyị nwụọ na-ewute Jehova. (Jọn 14:7) Ọ na-agụsi Jehova agụụ ike ka oge ọ ga-akpọlite ndị ohu ya nwụrụ anwụ mee ruwe eru. Anyịnwa kwesịkwara ịna-atụsi anya oge ahụ ike.—Job 14:14, 15.

Jehova na-eme ihe ya n’usoro. N’ihi ya, obi siri anyị ike na ọ ga-ahazi otú ọ ga-esi kpọlite ndị nwụrụ anwụ. (1 Kọr. 14:33, 40) Ndị mmadụ ga na-anabata ndị nwụrụ anwụ kama ịgbakọ na-eli ozu. Ị̀ na-echeta mbilite n’ọnwụ, nke ka nke ma onye nke gị nwụọ, wee kwe ka ọ kasie gị obi? (2 Kọr. 4:17, 18) Ị̀ na-ekele Jehova maka otú o si jiri Jizọs gbapụta anyị, jirikwa Baịbụl mee ka anyị mata na ndị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ ọzọ?—Kọl. 3:15.

  • Olee ndị enyi gị ma ọ bụ ndị ikwu gị nwụrụ anwụ ị na-atụ anya ịhụ ọzọ?

  • Olee ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl ị ga-achọ ịgakwuru ka gị na kpaa nkata?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya