Septemba 19-25
ABỤ ỌMA 135-141
Abụ nke 59 na Ekpere
Okwu Mmeghe (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“E Kere Anyị n’Ụzọ Dị Ebube”: (Nkeji 10)
Ọma 139:14—Iche echiche banyere ọrụ aka Jehova na-eme ka anyị hụkwuo ya n’anya (w07 6/15 21 ¶1-4)
Ọma 139:15, 16—Mkpụrụ ndụ ndị dị anyị n’ahụ́ na-egosi na Chineke nwere ike dị ukwuu, nweekwa amamihe (w07 6/15 22-23 ¶7-11)
Ọma 139:17, 18—Anyị dị iche n’ihe ọ bụla ọzọ dị ndụ n’ihi na anyị nwere ike ịsụ asụsụ, nweekwa ike iche echiche (w07 6/15 23 ¶12-13; w06 9/1 16 ¶8)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 8)
Ọma 136:15—Gịnị ka amaokwu a mere ka anyị ghọtakwuo gbasara ihe mere n’Oké Osimiri Uhie? (it-1 783 ¶5)
Ọma 141:5—Gịnị ka anyị mụtara n’ihe Eze Devid kwuru ebe a? (w15 4/15 31 ¶1)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a gbasara Jehova?
Olee ihe ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a nke ị ga-eji zie ndị mmadụ ozi ọma?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Ọma 139:1-24
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Ozi Ụlọ n’Ụlọ: (Nkeji 2 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) wp16.5 16
Nletaghachi: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) wp16.5 16—Gwa onye ahụ ka ọ bịa ọmụmụ ihe.
Ọmụmụ Baịbụl: (Nkeji 6 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) fg Isi nke 8 ¶8—Nyere onye ahụ aka ka ọ ghọta otú ọ ga-esi eme ihe unu na-amụ.
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
“Emela Ihe Ndị A Mgbe Ị Na-amụrụ Mmadụ Ihe”: (Nkeji 15) Kwurịtanụ ihe ndị e kwuru n’isiokwu ahụ. E mechaa, kpọnye vidio. Na vidio a, e mere ihe ngosi abụọ gosiri otú e kwesịrị isi na-akụzi ihe na otú a na-ekwesịghị isi na-akụzi ihe. Ihe ngosi a si n’akwụkwọ Baịbụl Na-akụziri Anyị, Peeji nke 31, paragraf nke 7. Ụmụnna kwesịrị iji akwụkwọ nke ha na-eso mgbe a na-ele ya. Unu lechaa ya, kwurịtanụ ihe ndị e gosiri na ya. Chetara ụmụnna ndị a na-enye ihe omume ụmụ akwụkwọ na ọ bụrụ na ha ezere ime ihe ndị ahụ na-adịghị mma, ọ ga-eme ka ha ghara iri oge.
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) kr Akwụkwọ Ozi Si n’Aka Òtù Na-achị Isi na isi nke 1 ¶1-10
Ịchịkọta ihe a mụrụ n’ọmụmụ ihe na ikwu ihe a ga-amụ n’izu ọzọ (Nkeji 3)
Abụ nke 30 na Ekpere