Ọktoba 17-23
ILU 12-16
Abụ nke 69 na Ekpere
Okwu Mmeghe (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Amamihe Dị Mma Karịa Ọlaedo”: (Nkeji 10)
Ilu 16:16, 17—Onye maara ihe na-amụ Okwu Chineke, na-emekwa ihe ọ na-amụta na ya (w07 7/15 8)
Ilu 16:18, 19—Onye maara ihe na-agbara nganga na mpako ọsọ (w07 7/15 8-9)
Ilu 16:20-24—Onye maara ihe na-ekwu okwu na-eru mmadụ n’obi, nke na-agbakwa ume (w07 7/15 9-10)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 8)
Ilu 15:15—Olee otú anyị ga-esi na-enwekwu obi ụtọ ná ndụ? (g 1/14 16)
Ilu 16:4—Olee otú o si bụrụ na Jehova kere onye ajọ omume “maka nzube ya”? (w07 5/15 18-19)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a gbasara Jehova?
Olee ihe ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a nke ị ga-eji zie ndị mmadụ ozi ọma?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Ilu 15:18–16:6
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Ozi Ụlọ n’Ụlọ: (Nkeji 2 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Jọn 11:11-14—Na-akụzi Eziokwu. Gwa onye ahụ ka ọ bịa ọmụmụ ihe ngwụcha izu.
Nletaghachi: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Jen. 3:1-6; Rom 5:12—Na-akụzi Eziokwu. Gwa onye ahụ ka ọ bịa ọmụmụ ihe ngwụcha izu.
Ọmụmụ Baịbụl: (Nkeji 6 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) bhs 202 ¶18-19—Gwa onye ahụ ka ọ bịa ọmụmụ ihe.
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
“Otú Ị Ga-esi Eme Ka Azịza Gị Na-adị Mma”: (Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnye vidio Bụrụ Enyi Jehova—Na-akwadebe Ihe Ị Ga-aza n’Ọmụmụ ihe. Unu lechaa ya, gwa ụmụaka ndị ị họọrọ ka ha gbagote n’ikpo okwu. Jụọ ha ajụjụ ndị a: Olee ihe anọ mmadụ ga-eme ma ọ na-akwadebe ihe ọ ga-aza n’ọmụmụ ihe? Gịnị mere anyị ekwesịghị iwe iwe ma ọ bụrụ na a kpọghị anyị ka anyị zaa ajụjụ?
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) kr isi nke 2 ¶23-34
Ịchịkọta ihe a mụrụ n’ọmụmụ ihe na ikwu ihe a ga-amụ n’izu ọzọ (Nkeji 3)
Abụ nke 102 na Ekpere