AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JEREMAYA 51-52
Okwu Jehova Na-emezu Otú Ahụ O Si Kwuo Ya
Jehova na-ekwu kpọmkwem ihe ga-eme n’ọdịnihu
Onye nche Peshia na-agba ụta
“Pịanụ akụ́ unu”
Ndị Midia na ndị Peshia bụ ndị ọkà n’ịgba ụta. Ọ bụ ụta bụ ngwá agha ha bụ́ isi. Ha na-apị akụ́ ha nke ọma otú ọ ga-abụ ha gbaa ya, ya abamie abamie n’ime ahụ́ mmadụ
“Ndị dike nke Babịlọn akwụsịwo ịlụ agha”
Ihe Ndekọ Nabonidus kwuru, sị: “Ụsụụ ndị agha Saịrọs banyere Babịlọn n’alụghị ọgụ.” Nke a pụtara na o nwere ike ịbụ na ndị agha Babịlọn alụsoghị ha ọgụ, otú ahụ Jeremaya buru n’amụma
Ihe Ndekọ Nabonidus
“Babịlọn ga-aghọ ikpo nkume [na] ebe tọgbọrọ n’efu ruo mgbe ebighị ebi”
Malite n’afọ 539 T.O.N.K., Babịlọn malitere ịna-ada. Alegzanda Onye Ukwu chọburu iji Babịlọn mere isi obodo nke alaeze ya, ma ọ nwụrụ ná mberede. N’ihe dị ka n’agbata afọ 1 na afọ 100 O.N.K., ndị Juu ka fọrọ na Babịlọn, n’ihi ya, Pita onye ozi gara Babịlọn ileta ha. Ma, n’ihe dị ka n’agbata afọ 301 na afọ 400 O.N.K., obodo ahụ bụzi mkpọmkpọ ebe. E mechakwara o nweghịzi ihe dị ka ya