Ọgọst 24-30
ỌPỤPỤ 19-20
Abụ nke 88 na Ekpere
Okwu Mmeghe (1 nkeji)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Uru Iwu Iri Ahụ Na-abara Gị”: (Nkeji 10)
Ọpụ. 20:3-7—Sọpụrụ Jehova ma na-efe naanị ya (w89 11/15 5 ¶6)
Ọpụ. 20:8-11—Mee ka ofufe Jehova bụrụ ihe kacha gị mkpa ná ndụ
Ọpụ. 20:12-17—Na-asọpụrụ mmadụ ibe gị (w89 11/15 6 ¶1-2)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 10)
Ọpụ. 19:5, 6—Gịnị mere mba Izrel oge ochie ji tụfuo ohere ọma ha gaara eji bụrụ “alaeze nke ndị nchụàjà”? (it-2 687 ¶1-2)
Ọpụ. 20:4, 5—Olee otú Jehova si enye ọgbọ ndị na-abịa abịa ntaramahụhụ “maka njehie nna ha”? (w04 3/15 27 ¶1)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a gbasara Jehova, ozi anyị, ma ọ bụ ihe ọzọ?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Ọpụ. 19:1-19 (th ihe ọmụmụ nke 10)
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Mkparịta Ụka nke Mbụ: (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Buru ụzọ mee ihe dị na peeji nke mbụ. Nyezie ya kaadị jw.org. (th ihe ọmụmụ nke 1)
Nletaghachi: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Buru ụzọ mee ihe dị na peeji nke mbụ. Nyezie ya otu n’ime akwụkwọ ndị anyị ji akụziri ndị mmadụ ihe. (th ihe ọmụmụ nke 15)
Ọmụmụ Baịbụl: (Nkeji 5 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) bhs 68 ¶17-19 (th ihe ọmụmụ nke 8)
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Gịnị Ka M Ga-eme Ka A Hapụ M Ịna-ekpebi Ihe M Ga-eme?: (Nkeji 6) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnye vidio ahụ. Jụzie ndị na-eto eto ajụjụ ndị a: Olee otú ị ga-esi eme ka ndị mụrụ gị na-atụkwasị gị obi? Gịnị ka i kwesịrị ime ma i mehie ihe? Ọ bụrụ na ị chọrọ ka ndị mụrụ gị na-ahapụtụ gị ka ị na-ekpebi ihe ụfọdụ n’onwe gị, gịnị mere o ji dị mkpa ka ị na-asọpụrụ ha?
Sọpụrụ Nne na Nna Gị Mere Agadi: (Nkeji 9) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnye vidio ahụ. Jụzie ajụjụ ndị a: Olee nsogbu ndị nwere ike ịbịa ma nne na nna anyị mewe agadi? Gịnị mere o ji dị mkpa ka ụmụ gbakọọ aka kwurịta otú kacha mma a ga-esi agwọ papa ha ma ọ bụ mama ha merela agadi? Olee otú ụmụ ga-esi na-asọpụrụ ndị mụrụ ha mgbe ha na-elekọta ha?
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) jy isi nke 129 na igbe isiokwu ya bụ “Ịpịa Mmadụ Ihe”
Okwu Mmechi (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Abụ nke 13 na Ekpere