AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | LEVITIKỌS 8-9
Ihe Ndị Na-egosi na Jehova Na-agọzi Anyị
Mgbe Erọn na ụmụ ya bụ́ ndị nchụàjà a họpụtara ọhụrụ chụrụ àjà mbụ ha, Jehova mere ka ọkụ si n’eluigwe richapụ àjà ha. Ihe a gosiri na ihe ha masịrị Jehova nakwa na ọ kwadoro nhọpụta a họpụtara ha. Jehova si otú ahụ gbaa mba Izrel ume ka ha kwado ndị nchụàjà a a họpụtara. Taa, Jehova họpụtara Jizọs Kraịst ịbụ Nnukwu Onye Nchụàjà ka nke ndị Izrel. (Hib. 9:11, 12) N’afọ 1919, Jizọs họpụtara ụmụ nwoke ole na ole e tere mmanụ ka ha bụrụ “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche.” (Mat. 24:45) Olee ihe na-egosi na ihe ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-amasị Jehova, na ọ na-agọzi ha, na-akwadokwa ha?
N’agbanyeghị mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ, ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi akwụsịbeghị ịna-enye anyị ihe ndị na-eme ka okwukwe anyị na-esi ike
A na-ekwusakwa ozi ọma “n’elu ụwa dum mmadụ bi” otú ahụ e buru n’amụma.—Mat. 24:14
Olee otú anyị ga-esi jiri obi anyị niile na-akwado ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche?