Nọvemba 15-21
JOSHỤA 23-24
Abụ nke 50 na Ekpere
Okwu Mmeghe (1 nkeji)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Ndụmọdụ Ikpeazụ Joshụa Nyere Mba Izrel”: (Nkeji 10)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 10)
Josh. 24:2—Tira, nna Ebreham, ọ̀ bụ onye na-ekpere arụsị? (w04 12/1 12 ¶1)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a gbasara Jehova, ozi anyị, ma ọ bụ ihe ọzọ?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4) Josh. 24:19-33 (th ihe ọmụmụ nke 11)
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Mkparịta Ụka nke Mbụ: (Nkeji 3) Buru ụzọ mee ihe dị n’ebe e dere Ihe Gị na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta. Zie ya ozi ọma n’agbanyeghị na o kwuru ihe ndị na-achọghị ịnụ ozi ọma na-ekwukarị. (th ihe ọmụmụ nke 2)
Nletaghachi: (Nkeji 4) Buru ụzọ mee ihe dị n’ebe e dere Ihe Gị na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta. Nyezie ya broshọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi. (th ihe ọmụmụ nke 20)
Ọmụmụ Baịbụl: (Nkeji 5) lffi nchịkọta isi nke 01, ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ, na ihe ị ga-agba mbọ mee (th ihe ọmụmụ nke 3)
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Zere Mkpakọrịta Ọjọọ n’Ebe Ị Na-arụ Ọrụ: (Nkeji 7) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnye vidio bụ́ Zere Ihe Ndị Ga-eme Ka Ị Kwụsị Iguzosi Ike n’Ebe Jehova Nọ—Mkpakọrịta Ọjọọ. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a: Olee otú mkpakọrịta ọjọọ si kpaa nwanna nwaanyị ahụ aka n’ebe ọrụ ya? Olee mgbanwe o mere, oleekwa otú o si nyere ya aka? Gịnị ka vidio a kụziiri gị banyere izere mkpakọrịta ọjọọ?
Ị Ga-esili n’Ebe Ị Na-atụghị Anya Ya Mete Enyi: (Nkeji 8) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnye vidio ahụ. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a: Olee ihe ndị mere ka Akil bido iso ndị ọjọọ na-akpa n’ụlọ akwụkwọ? Olee otú Akil si mete ezi ndị enyi n’ọgbakọ? Gịnị ka vidio a kụziiri gị banyere imete ezi ndị enyi?
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) bt isi nke 18 ¶1-5 na igbe dị na peeji nke 142, na nke 144
Okwu Mmechi (Nkeji 3)
Abụ nke 39 na Ekpere