OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Ị̀ Na-achọ Ịma ma À Zaala Ekpere Gị?
E dere banyere ọtụtụ ndị Jehova zara ekpere ha na Baịbụl. Mgbe ndị na-efe Chineke chọpụtara otú Jehova si gee ntị n’arịrịọ ha rịọrọ ya ma nyere ha aka, okwukwe ha bịara sikwuo ike. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-akpọ okwu aha n’ekpere anyị, na-agbalịkwa achọpụta mgbe Jehova zara ekpere anyị. Cheta na otú ọ ga-esi aza gị ekpere nwere ike ịdị iche n’ihe ị tụrụ anya ya, ma ọ bụkwanụ karịa ihe ị tụrụ anya ya. (2 Kọr. 12:7-9; Efe. 3:20) Olee ụzọ dị iche iche Jehova nwere ike isi za anyị ekpere?
Ime ka anyị nwee ume, ime ka obi ruo anyị ala, na ime ka okwukwe anyị sie ike iji die nsogbu anyị nọ na ya.—Fil. 4:13
Inye anyị amamihe anyị ga-eji mee mkpebi dị mma.—Jems 1:5
Ime ka ọ gụwa anyị agụụ ime ihe nakwa inye anyị ike anyị ga-eji eme ya.—Fil. 2:13
Ime ka obi ruo anyị ala mgbe ihe na-echegbu anyị.—Fil. 4:6, 7
Isi n’aka ndị ọzọ nyere anyị aka, gbaa anyị ume ma kasie anyị obi.—1 Jọn 3:17, 18
Inyere ndị anyị na-etinye n’ekpere aka.—Ọrụ 12:5, 11
LEENỤ VIDIO BỤ́ JEHOVA BỤ “ONYE NA-ANỤ EKPERE,” ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
Olee otú akụkọ Nwanna Shimizu nwere ike isi gbaa anyị ume ma ọ bụrụ na ọrịa anaghịzi ekwecha anyị mee ihe ndị anyị chọrọ ime?
Olee otú anyị ga-esi eṅomi Nwanna Shimizu?