Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb24 Mee p. 6-7
  • Mee 27–Jun 2

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mee 27–Jun 2
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2024
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2024
mwb24 Mee p. 6-7

MEE 27–JUN 2

ABỤ ỌMA 42-44

Abụ nke 86 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. Kwe Ka Ihe Jehova Na-akụziri Gị Baara Gị Ezigbo Uru

(Nkeji 10)

Soro ụmụnna gị na-efe Jehova. Ọ ga-akacha mma ma i soro ha na-ezukọ ihu na ihu, ma o kwe mee (Ọma 42:4, 5; w06 6/1 9 ¶5)

Na-ekpe ekpere tupu gị amụwa Okwu Chineke (Ọma 42:8; w12 1/15 15 ¶2)

Kwe ka eziokwu dị na Baịbụl na-edu gị n’ihe niile ị na-eme (Ọma 43:3)

Ebe ụmụnna nwaanyị na-ege ntị nke ọma ná mgbakọ, na-edekwa ihe ha mụtara.

Ihe Jehova na-akụziri anyị na-eme ka anyị na-edi ọnwụnwa ma na-emezu nkwa anyị kwere ya na anyị ga na-efe ya.​—1 Pita 5:10; w16.09 5 ¶11-12.

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Ọma 44:19​—Ọ̀ ga-abụ gịnị ka okwu bụ́ “n’ebe nkịta ọhịa na-ebi” pụtara? (it-1 1242)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

(Nkeji 4) Ọma 44:1-26 (th ihe ọmụmụ nke 11)

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 4) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Gwa ya otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl nakwa na ị chọrọ ka gị na ya mụwa Baịbụl. (lmd isi nke 5 nọmba nke 5)

5. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 5) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Kpọọ onye ahụ ka ọ bịa gere okwu ihu ọha a ga-ekwu. Mee ka ị̀ kpọnyeere ya vidio bụ́ Gịnị Ka A Na-eme n’Ụlọ Nzukọ Alaeze? Kwurịtazienụ ihe dị na ya. (lmd isi nke 7 nọmba nke 5)

6. Okwu

(Nkeji 3) lmd ihe ndị ọzọ a kọwara nke A nọmba nke 4—Isiokwu: E Nweghịzi Onye Ga-arịa Ọrịa. (th ihe ọmụmụ nke 2)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 21

7. Mee Mkpebi Dị Mma n’Okwu Gbasara Ọrụ na Agụmakwụkwọ

(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Foto ndị na-egosi: Ebe nwanna nwoke bụ́ okorobịa na-agụ Baịbụl ma na-echebara ihe ọ ga-eme ma ọ gachaa ụlọ akwụkwọ sekọndrị echiche. 1. Ebe ya na onye ndụmọdụ e nwere n’ụlọ akwụkwọ ha na-ekwurịta okwu. 2. Ebe ọ gara Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze. 3. Ebe ọ na-ekwusa ozi ọma ná mba ọzọ.

Ndị na-eto eto, ùnu na-eme atụmatụ ihe unu ga-eme ma unu gachaa ụlọ akwụkwọ sekọndrị? O nwere ike ịbụ na o nwere ọrụ i bu n’obi ibido rụwa nke ga-enye gị ohere ịbụ ọsụ ụzọ. Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ị na-eche ma è nwere aka ọrụ ị ga-amụ, akwụkwọ ikike, ma ọ bụ diplọma ị ga-enweta ka i nwee ike inweta ọrụ ahụ. Ihe a bụ oge pụrụ iche ná ndụ gị. Ma, o nwere ike ịdị gị ka ị maghị nke ị ga-eme eme n’ihi ọtụtụ ihe na-abata gị n’isi ma ọ bụkwanụ n’ihi na ndị ọzọ na-amanye gị ka ị họrọ nke ha chọrọ. Gịnị ga-enyere gị aka ime ezigbo mkpebi?

Gụọ Matiu 6:32, 33. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:

  • Gịnị mere o ji dị mma ibu ụzọ kpebie ihe ndị anyị chọrọ ime n’ozi Jehova tupu anyị ekpebiwa ihe gbasara ọrụ na agụmakwụkwọ?

  • Olee otú ndị nne na nna ga-esi nyere ụmụ ha aka ime ihe e kwuru na Matiu 6:32, 33?​—Ọma 78:4-7

Ekwela ka ọ bụrụ agụụ ịba ọgaranya ma ọ bụ ịbụ onye a ma ama ga-eme ka i kpebie nke ị ga-eme. (1 Jọn 2:15, 17) Cheta na mmadụ inwe akụnụba nwedịrị ike ime ka o siere onye ahụ ibute ihe gbasara Alaeze Chineke ụzọ ná ndụ ya. (Luk 18:24-27) Ọ bụrụ na mmadụ ana-achụ akụnụba ọnwụ ọnwụ, ọ ga-esiri ya ike ịna-eme nke ọma n’ofufe Jehova.​—Mat. 6:24; Mak 8:36.

Kpọnye VIDIO bụ́ Kpachara Anya Ka Ị Ghara Ịtụkwasị Ihe Ndị Na-adịghị Adịgide Adịgide Obi​—Akụnụba. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:

  • Olee otú ihe e kwuru n’Ilu 23:4, 5 ga-esi nyere gị aka ime mkpebi dị mma?

IHE NDỊ GA-ENYERE GỊ AKA

  • Kpebie ihe ndị ị ga-eme n’ozi Jehova, ma ndị nke ị ga-eme ozugbo ma ndị nke ga-ewetụ oge

  • Jide n’aka na mkpebi ndị ị chọrọ ime n’ihe gbasara agụmakwụkwọ na ụdị ọrụ ị ga-achọ ịrụ n’ọdịnihu agaghị akpaghasị ihe ndị ị chọrọ ime n’ozi Jehova

  • Ka ihe ị ga-ahọrọ ime bụrụ ihe ga-enyere gị aka inweta ọrụ, dịrịkwa njikere ịgbanwe ihe ụfọdụ ka oge na-aga. Ọ bụrụ na i kpebie ịgụtụkwu akwụkwọ ma ọ bụ ịmụ ọrụ aka, jide n’aka na ị gụchaa ma ọ bụ ị mụchaa, na ị ga-ejili ihe ị mụtara na-akpa afọ gị

8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30) rr isi nke 9 ¶33-39, igbe 9E

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 47 na Ekpere

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya