Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb24 Julaị p. 8-9
  • Julaị 29–Ọgọst 4

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Julaị 29–Ọgọst 4
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2024
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2024
mwb24 Julaị p. 8-9

JULAỊ 29–ỌGỌST 4

ABỤ ỌMA 69

Abụ nke 13 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Ebe Jizọs na-achụpụ ndị na-ere ahịa na anụmanụ ha n’ụlọ nsọ.

1. Ihe Ndị E Buru n’Amụma n’Abụ Ọma 69 Mezuru ná Ndụ Jizọs

(Nkeji 10)

Ndị mmadụ kpọrọ Jizọs asị n’agbanyeghị na o nweghị ihe o mere ha (Ọma 69:4; Jọn 15:24, 25; w11 8/15 11 ¶17)

Ihe gbasara ụlọ Jehova nụrụ Jizọs ọkụ n’obi (Ọma 69:9; Jọn 2:13-17; w10 12/15 8 ¶7-8)

Obi gbawara Jizọs, e nyekwara ya mmanya a gwara ihe na-elu ilu ka ọ ṅụọ (Ọma 69:20, 21; Mat. 27:34; Luk 22:44; Jọn 19:34; g95 10/22 31 ¶4; it-2 650)


AJỤJỤ Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: Gịnị mere Jehova ji mee ka e dee amụma ndị gbasara Mezaya n’Akwụkwọ Nsọ Hibru?

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Ọma 69:30, 31​—Olee otú amaokwu ndị a ga-esi enyere anyị aka ime ka ekpere anyị na-aka mma? (w99 1/15 18 ¶11)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

(Nkeji 4) Ọma 69:1-25 (th ihe ọmụmụ nke 2)

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Na-enwe Ndidi​—Ihe Jizọs Mere

(Nkeji 7) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnye VIDIO, unu ekwurịtazie ihe dị na lmd isi nke 8 nọmba nke 1-2.

5. Na-enwe Ndidi​—Na-eme Ka Jizọs

(Nkeji 8) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. O si na lmd isi nke 8 nọmba nke 3-5 na “I Nwekwara Ike Ịgụ.”

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 134

6. Mkpa Ọgbakọ

(Nkeji 5)

7. Ihe Ndị Ga-eme Ka Ofufe Ezinụlọ Na-aga Nke Ọma

(Nkeji 10) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Foto ndị na-egosi: 1. Ebe otu nna bu ụzọ na-akwadebe maka ofufe ezinụlọ ha. 2. Ebe nna ahụ mechara na-eduzi ofufe ezinụlọ ha mgbe ya na nwunye ya na ụmụ ha ndị nwaanyị atọ nọ.

Na Jenụwarị afọ 2009, e kwuru na a ga na-emekọtazi Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ, Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, na Nzukọ Ije Ozi n’ọmụmụ ihe etiti izu. Ihe a mere ka ezinụlọ dị iche iche nwee otu mgbede ha ga na-eji enwe ofufe ezinụlọ ha n’izu ọ bụla. Ọtụtụ ndị ekwuola na obi dị ha ụtọ maka ndokwa a e mere ka ha nwee ike ịbịarukwu Jehova na ndị ezinụlọ ha nso.​—Diut. 6:6, 7.

Olee ihe ụfọdụ ga-enyere ndị isi ezinụlọ aka ime ka Ofufe Ezinụlọ ha na-aga nke ọma?

  • Gbalịa ka unu na-enwechi ya anya. O kwe mee, nwee ụbọchị na oge a kapịrị ọnụ unu ga-eji na-enwe ofufe ezinụlọ n’izu ọ bụla. Kpebiekwa ụbọchị ọzọ unu ga-eji enwe ya ma ọ bụrụ na e nwee ihe mere ka ụbọchị nke mbụ ghara ịdaba

  • Kwadebe nke ọma. Gwa nwunye gị ka ọ tụọrọ gị aro ihe unu nwere ike iji eme ofufe ezinụlọ. Mgbe ụfọdụ, gwakwa ụmụ gị ka ha tụọ aro ihe unu ga-eji eme ya. Ọ dịghị mkpa iji oge buru ibu kwadebe ihe unu ga-eme, karịchaa, ma ọ bụrụ na ihe unu ji eme ya n’izu ọ bụla yiri

  • Hụ na ihe unu ga-eji eme ya ga-abara ezinụlọ gị uru. Ka ụmụaka na-eto, mkpa ha na ikike nghọta ha na-agbanwe. N’ihi ya, ihe unu ga na-eme n’ofufe ezinụlọ kwesịrị ịbụ ihe ga-enyere onye nke ọ bụla aka ịbịarukwu Jehova nso

  • Mee ka oge ofufe ezinụlọ unu bụrụ oge obi ụtọ. Mgbe ụfọdụ, lee ma ùnu ga-anọ n’èzí mee ofufe ezinụlọ unu ma ọ bụrụ na ihu ígwé dị mma. Unu metụ, unu ejiri nkeji ole na ole zurutụ ike, ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa. Unu zuchaa, unu amaliteghachikwa. Ọ bụ eziokwu na unu nwere ike iji oge ofufe ezinụlọ unu kwurịta nsogbu ụfọdụ ụmụ unu na-enwe, ma ejikwala oge a abara ha mba ma ọ bụ adọ ha aka ná ntị

  • Meenụ ihe dị iche iche n’ofufe ezinụlọ unu. Dị ka ihe atụ, unu nwere ike iji oge ofufe ezinụlọ unu kwadebe ihe ụfọdụ a ga-amụ n’ọmụmụ ihe, jiri ya lee otu vidio dị na jw.org ma kwurịta ihe dị na ya, jirikwa ya mụgharịa otú unu ga-esi ezi ozi ọma. Ọ bụ eziokwu na ihe bụ́ isi a na-eme n’Ofufe Ezinụlọ bụ mkparịta ụka, ma unu nwekwara ike iwepụta oge onye nke ọ bụla ga-eji mụọ ihe n’onwe ya

Jụọ ụmụnna ajụjụ a:

  • Olee otú unu sirila mee ihe ndị a n’ofufe ezinụlọ unu?

8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30) rr isi nke 12 ¶15-21

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 114 na Ekpere

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya