Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb25 Jenụwarị p. 6-7
  • Jenụwarị 27–Febụwarị 2

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jenụwarị 27–Febụwarị 2
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2025
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2025
mwb25 Jenụwarị p. 6-7

JENỤWARỊ 27–FEBỤWARỊ 2

ABỤ ỌMA 140-143

Abụ nke 44 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. Na-eme Ihe Niile I Nwere Ike Ime Mgbe Ị Rịọchara Arịrịọ Ka E Nyere Gị Aka

(Nkeji 10)

Dịrị njikere ịnabata ndụmọdụ na ịdọ aka ná ntị (Ọma 141:5; w22.02 12 ¶13-14)

Na-atụgharị uche n’ihe ndị Jehova mere n’oge gara aga iji nyere ndị ya aka (Ọma 143:5; w10 3/15 32 ¶4)

Gbalịa na-ele ihe anya otú Jehova si ele ha (Ọma 143:10; w15 3/15 32 ¶2)

Ebe otu nwanna nwoke bụ́ okorobịa na-amụ ihe. Foto ndị na-egosi: 1. Ebe ọ nọ n’èzí na-ekpe ekpere. 2. Ebe ọ na-ege ntị na ndụmọdụ nwanna nwoke tọrọ ya atọ na-enye ya mgbe ha nọ n’ozi ọma.

Ọ bụghị naanị arịrịọ ndị Devid rịọrọ ka e nyere ya aka ka e dere n’Abụ Ọma 140-143, kama e dekwara ihe ndị gosiri na o mere ihe kwekọrọ n’arịrịọ ndị ọ rịọrọ.

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Ọma 140:3​—Gịnị mere Devid ji kwuo na ire ndị ajọ omume dị ka ire agwọ? (it-2 1151)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

(Nkeji 4) Ọma 141:1-10 (th ihe ọmụmụ nke 12)

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 4) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Kwuo ihe ga-eme ka gị na mmadụ kparịtawa ụka mgbe i nyechaara ya aka. (lmd isi nke 3 nọmba nke 5)

5. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 3) IKWUSA OZI ỌMA N’EBE NDỊ MMADỤ NA-ANỌKARỊ. Onye ahụ gwara gị na ya ji ọrụ n’aka. (lmd isi nke 7 nọmba nke 3)

6. Ịkọwa Ihe Ndị I Kweere

(Nkeji 5) Ihe Ngosi. ijwfq isiokwu nke 21​—Isiokwu: Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Anaghị Ekwe Ka A Mịnye Ha Ọbara? (th ihe ọmụmụ nke 7)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 141

7. Jikere Maka Ihe Ndị Nwere Ike Ime Ka E Buga Gị Ụlọ Ọgwụ Ma Ọ Bụ Waa Gị Ahụ́

(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Jehova kwere nkwa na ya “dị njikere inyere anyị aka n’oge nsogbu.” (Ọma 46:1) Ihe ndị nwere ike ime ka e buga mmadụ ụlọ ọgwụ ma ọ bụ waa ya ahụ́ na-emekarị ka obi koro mmadụ n’elu. Ma, Jehova enyela anyị ihe niile ga-enyere anyị aka ịkwadebe maka ụdị nsogbu a. Dị ka ihe atụ, nzukọ Jehova ewepụtarala anyị kaadị DPA na nke a na-akpọ Identity Card,a nakwa akwụkwọ ndị ọzọ gbasara ahụ́ ike,b họpụtakwa Kọmitii Ndị Na-ahụ Maka Mmekọrịta Anyị na Ndị Ụlọ Ọgwụ. Ihe a niile na-enyere anyị aka ka anyị na-erubere iwu Chineke nyere gbasara ọbara isi.​—Ọrụ 15:28, 29.

Ebe otu nwanna nwaanyị na-edejupụta kaadị DPA.

Kpọnye VIDIO Bụ́ Ì Jikerela Maka Ihe Nwere Ike Ime Ka E Buga Gị Ụlọ Ọgwụ? Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:

  • Olee otú idejupụta kaadị DPA si baara ụfọdụ ndị uru?

  • Olee otú akwụkwọ bụ́ Ihe Ụmụ Nwaanyị Dị Ime Kwesịrị Ịma (S-401) sirila baara ụfọdụ ndị uru?

  • Gịnị mere o ji kachaa mma ịkpọtụrụ Kọmitii Na-ahụ Maka Mmekọrịta Anyị na Ndị Ụlọ Ọgwụ n’oge ma e nwee ihe mere a ga-eji buga anyị ụlọ ọgwụ, waa anyị ahụ́, ma ọ bụkwanụ gwọọ anyị ọrịa kansa, ọ bụrụgodị na anyị chere na a gaghị ekwute okwu ịmịnye anyị ọbara?

Ì JIKERELA?

  • Dee ihe ndị i kpebiri na kaadị DPA gị

  • Kpọtụrụ Kọmitii Na-ahụ Maka Mmekọrịta Anyị na Ndị Ụlọ Ọgwụ ozugbo

  • Jikere ịgwa dọkịta gị ebe ị kwụ n’ihe gbasara mmịnye ọbara, iji irighiri ihe si n’ọbara agwọ gị ọrịa, na isi n’ụzọ ụfọdụ jiri ọbara gị gwọọ gị.​—Gụọ lff isi nke 39

8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30) rr isi nke 21 ¶1-6, vidio kọwara isiokwu a na-amụ, igbe 21A

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 103 na Ekpere

a Ndị nkwusa e mere baptizim nwere ike isi n’aka nwanna na-ahụ maka akwụkwọ n’ọgbakọ ha nweta kaadị DPA. Ha nwekwara ike isi n’aka ya nwetara ụmụ ha na-erubeghị afọ iri na asatọ kaadị nke a na-akpọ Identity Card.

b Ọ bụrụ na ị chọrọ akwụkwọ a na-akpọ Ihe Ụmụ Nwaanyị Dị Ime Kwesịrị Ịma (S-401), Ihe Ndị A Chọrọ Ịwa Ahụ́ na Ndị Na-arịa Ọrịa Kansa Kwesịrị Ịma (S-407), ma ọ bụ nke a na-akpọ Ihe Ndị Nne na Nna Nwere Ike Ime Iji Hụ na A Mịnyeghị Ụmụ Ha Ọbara (S-55), gwa ndị okenye ka ha nye gị ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya