Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb25 Mee p. 6-7
  • Mee 19-25

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mee 19-25
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2025
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2025
mwb25 Mee p. 6-7

MEE 19-25

ILU 14

Abụ nke 89 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. Chebara Ihe Ọ Bụla Ị Chọrọ Ime Echiche Ma E Nwee Ọdachi

(Nkeji 10)

Kpachara anya ka ị ghara ikwere “ihe niile” ị nụrụ (Ilu 14:15; w23.02 23 ¶10-12)

Ekpebila ihe ị ga-eme naanị n’ihi otú obi dị gị ma ọ bụ n’ihi ihe mere gị n’oge gara aga (Ilu 14:12)

Egela ndị na-ajụ ntụziaka nzukọ Jehova na-enye ntị (Ilu 14:7)

Ebe otu ezinụlọ na-ele ihe omume tiivi anyị.

AJỤJỤ Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: Ndị okenye, ùnu dị njikere iso ntụziaka na ịtụkwasị Jehova obi ma e nwee ọdachi?​—w24.07 5 ¶11.

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Ilu 14:17​—Olee ụzọ ndị o nwere ike isi bụrụ na a kpọrọ “onye na-echebara ihe echiche” asị? (it-2 1094)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

(Nkeji 4) Ilu 14:1-21 (th ihe ọmụmụ nke 11)

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 3) IKWUSA OZI ỌMA N’EBE NDỊ MMADỤ NA-ANỌKARỊ. Jiri ihe si na Baịbụl zie onye gwara gị na ya na-echegbu onwe ya n’ihi ihe isi ike ozi ọma. (lmd isi nke 3 nọmba nke 3)

5. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 4) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Nye ya magazin kwuru banyere ihe masịrị ya n’oge ikpeazụ unu kwurịtara okwu. (lmd isi nke 9 nọmba nke 4)

6. Ime Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs

(Nkeji 5) Gbaa onye ị na-amụrụ ihe ume ka ọ na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị, gosikwa ya otú ọ ga na-esi eme ya. (th ihe ọmụmụ nke 19)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 126

7. Dị Njikere Maka Ọdachi

(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Ọ bụ okenye ga-eme ihe omume a. Gwakwa ụmụnna ihe alaka ụlọ ọrụ na ndị okenye kwuru gbasara ịkwadebe maka ọdachi, ma ọ bụrụ na e nwere ihe ha kwuru.

Ka anyị na-atachi obi ‘n’oge ikpeazụ a,’ anyị na-atụ anya na ihe ga na-akakwu njọ. (2 Tim. 3:1; Mat. 24:8) Ndị Jehova na-enwetakarị ntụziaka nwere ike ịzọ ha ndụ tupu e nwee ọdachi ma ọ bụkwanụ n’oge e nwere ọdachi. Ihe nwere ike ịzọ anyị ndụ ma mee ka okwukwe anyị sie ike ma ụdị ihe a mee bụ irube isi na ịkwadebe akwadebe ugbu a.​—Ilu 14:6, 8.

  • Mee ka okwukwe gị sikwuo ike: Na-amụchi ihe anya, na-agụchikwa Baịbụl anya. Gbalịa na-abụkwu aka ochie n’isi n’ụzọ dị iche iche ekwusa ozi ọma. Ekwela ka ụjọ jide gị ma e nwee mgbe gị na ndị ọgbakọ unu na-anọghịzi otu ebe. (Ilu 14:30) E nweghị ihe ga-ekewapụ gị n’ebe Jehova Chineke na Kraịst Jizọs nọ.​—od 176 ¶15-17

  • Kwadebe akwadebe iji zọọ onwe gị ndụ: E wepụ inwe akpa ndị e tinyere ihe ndị a ga-eji agbapụ n’oge nsogbu, ezinụlọ ọ bụla kwesịkwara idowe nri na mmiri butụrụ ibu n’ụlọ, nweekwa ọgwụ na ihe ndị yiri ha, a dịghị ama ama ya bụrụ na ha agaghị apụta èzí ruo oge ụfọdụ.​—Ilu 22:3; g17.5 4

Ebe ezinụlọ ahụ na-ewekọta ihe ndị ha ga-eji gbapụ ma e nwee ọdachi.

Kpọnye VIDIO Bụ́ Ì Jikerela Maka Ọdachi? Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:

  • Olee otú Jehova nwere ike isi nyere anyị aka ma e nwee ọdachi?

  • Olee ihe ndị anyị nwere ike ime iji kwadebe maka ọdachi?

  • Olee otú anyị nwere ike isi nyere ndị ọzọ aka ma e nwee ọdachi?

JỤỌ ONWE GỊ, SỊ:

‘Gịnị na gịnị ka ọdachi ndị meere onwe ha na nso nso a ma ọ bụ ndị nke ndị mmadụ kpatara kụziiri m banyere ịkwadebe akwadebe?’

8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30) w23 Mach, Isiokwu A Na-amụ Amụ nke 10, Gịnị Mere Ị Ga-eji Mee Baptizim? ¶1-10 na igbe dị na peeji nke 4

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 116 na Ekpere

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya