NỌVEMBA 3-9
ABỤ SOLOMỌN 1-2
Abụ nke 132 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)
1. Akụkọ Nke Na-egosi Ezigbo Ịhụnanya
(Nkeji 10)
[Kpọnye VIDIO Bụ́ Ihe Akwụkwọ Abụ Sọlọmọn Na-ekwu.]
Solomọn toro nwa agbọghọ Shulem ma kwe ya nkwa na ya ga-enye ya akụnụba (Abụ Solo. 1:9-11)
Ezigbo ịhụnanya nwa agbọghọ Shulem hụrụ nwa okorobịa ya na ya dị ná mma, bụ́ onye na-azụ atụrụ, mere ka ọ ghara ịhapụ nwa okorobịa ahụ (Abụ Solo. 2:16, 17; w15 1/15 30 ¶9-10)
IHE GA-ENYERE GỊ AKA: Mgbe ị na-agụ akwụkwọ Abụ Solomọn na Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ, jiri ebe a kpọrọ “Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ A” chọpụta onye kwuru nke o kwuru.
2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Nkeji 10)
Abụ Solo. 2:7—Gịnị mere Ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ji kwesị ịna-eme ka nwa agbọghọ Shulem? (w15 1/15 31 ¶11)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?
3. Ọgụgụ Baịbụl
(Nkeji 4) Abụ Solo. 2:1-17 (th ihe ọmụmụ nke 12)
4. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 3) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Kụziere mmadụ otu n’ime eziokwu ndị dị n’ihe ndị ọzọ a kọwara nke A na broshọ bụ́ Hụ Ndị Mmadụ n’Anya. (lmd isi nke 1 nọmba nke 3)
5. N’Oge Ọzọ
(Nkeji 4) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Kụziere mmadụ otu n’ime eziokwu ndị dị n’ihe ndị ọzọ a kọwara nke A na broshọ bụ́ Hụ Ndị Mmadụ n’Anya. (lmd isi nke 9 nọmba nke 3)
6. Ime Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs
Abụ nke 46
7. “A Ga-agọzi Onye Na-emesapụ Aka”
(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ bụ okenye ga-eme ya.
A na-agọzi anyị ma anyị jiri oge anyị, ume anyị, na ihe ndị ọzọ anyị nwere na-enyere ndị ọzọ aka. N’eziokwu, onye anyị nyeere aka na-ewere ihe anyị meere ya ka ngọzi. Ma, a na-agọzikwa anyịnwa maka na anyị na-emesapụ aka. (Ilu 22:9) Ọ bụghị naanị na anyị na-enwe obi ụtọ maka na anyị na-eme ka Onye kere anyị, kamakwa, anyị na Jehova ga-adịkwa ná mma.—Ilu 19:17; Jems 1:17.
Kpọnye VIDIO Bụ́ Anyị Na-enwe Obi Ụtọ ma Anyị Na-emesapụ Aka. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:
Olee otú aka ụmụnna anyị n’ụwa niile na-emesapụ si mee ka ndị anyị lere na vidio a na-enwe obi ụtọ?
Olee otú hanwa sikwarala nwee obi ụtọ maka na ha na-emesapụrụ ndị ọzọ aka?
8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ
(Nkeji 30) lfb isi nke 32-33