Okwu mmalite
È nwetụla mgbe ọ dị gị ka Chineke anaghị aza ekpere gị? Ọ bụrụ otú ahụ, mara na e nwere ndị ọ dị otú ọ dị gị. Ọtụtụ ndị ekpeela ekpere ka Chineke nyere ha aka ná nsogbu ha, ma ha na nsogbu ndị ahụ ka na-alụ. Isiokwu ndị gbara n’Ụlọ Nche a ga-ekwu ihe mere obi ji kwesị isi anyị ike na Chineke na-anụ ekpere anyị. Ha ga-ekwukwa ihe mere Chineke anaghị aza ekpere ụfọdụ nakwa otú anyị ga-esi ekpe ekpere Chineke aza ya.