Isiokwu Ndị Gbara na JW.ORG
IHE NDỊ E JI ONYINYE I NYERE EME
Ịgbatara Ndị Ọdachi Dakwasịrị Ọsọ Enyemaka
N’afọ ije ozi 2020, ọrịa koronavaịrọs na ọdachi ndị na-emere onwe ha kpara ọtụtụ nde ụmụnna anyị aka ọjọọ. Gịnị ka anyị mere iji nyere ha aka?
Na jw.org, gaa n’ebe e dere IHE NDỊ ANYỊ NWERE, pịa ISIOKWU DỊ ICHE ICHE, pịzie IHE NDỊ E JI ONYINYE I NYERE EME.
IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA
Na-ewepụtanụ Ezigbo Oge Unu Ga-eji Na-anọrị
Ọtụtụ ndị di na nwunye nwere ike ha na ibe ha agaghị na-ekwurịta okwu nke ọma ọ bụrụgodị na ha nọkọtara ọnụ. Olee otú di na nwunye ga-esi eji oge ha ji anọrị eme ihe bara uru?
Na jw.org, gaa n’ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI, pịa ALỤMDI NA NWUNYE NA EZINỤLỌ.