Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • yb14 p. 112-113
  • Òtù Nzuzo

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Òtù Nzuzo
  • Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2014
Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2014
yb14 p. 112-113

SIERA LION NA GINI

Òtù Nzuzo

N’ỌTỤTỤ obodo ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka, e nwere òtù nzuzo dị iche iche. Ha na-atụrụ ndị òtù ha otú ha ga-esi ebi ndụ na ihe ha ga-eme ma a bịa n’okwu gbasara agụmakwụkwọ na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ma, ihe ka ha mkpa bụ ime ihe ndị a chọrọ ka onye òtù ha ọ bụla na-eme. E nwere òtù nzuzo a na-akpọ Poro, nweekwa nke a na-akpọ Sande. Òtù abụọ a so n’òtù nzuzo ndị kachanụ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka. Ụmụ nwoke na-abanye na nke a na-akpọ Poro, ụmụ nwaanyị ana-abanye na nke a na-akpọ Sande.a Otu akwụkwọ e dere n’afọ 1986 kwuru ụfọdụ n’ime ihe ndị òtù Poro na-eme. O kwuru na ha na-agbalị “ịtụrụ ndị mmụọ ụka. Ha na-agwa ha ka ha na-eme ihe ga-abara ụmụ nwoke uru.”

Foto dị na peeji nke 112, 113

A na-akụziri ndị ọhụrụ batara n’òtù ndị Poro gbasara ndị mmụọ. A na-akụzikwara ha gbasara ndị amusu. A na-akakwa ha akara e ji gbunye ha ọgwụ n’ahụ́. A na-emekwara ndị òtù Sande otu ihe ahụ. Ha na-ebi ụmụ nwaanyị ha úgwù. Ma, e nwere ebe ụfọdụ ha kwụsịrịla ibi ụmụ nwaanyị úgwù.

Ndị òtù nzuzo ndị ọzọ na-enye ndị òtù ha iwu gbasara inwe mmekọahụ. Ha na-anwakwa iji ike ndị mmụọ ọjọọ agwọ ndị ara ma ọ bụ ụdị ọrịa ndị ọzọ. N’oge a lụrụ agha na Siera Lion, otu òtù nzuzo kwuru na ihe ọ sọrọ mmadụ gbaa ndị òtù ha n’égbè, mgbọ enweghị ike ịtụ ha. Ma nke ahụ bụ okpookpo ụgha n’ihi na mgbọ tụrụ ha n’oge agha ahụ.

A na-agwa ndị òtù ha ka ha ghara ịkọrọ onye ọ bụla ihe ndị ha na-eme. A na-egbu onye òtù ha ọ bụla nwara anwa daa iwu ha.

a N’ebe ụfọdụ, ihe a na-akpọ òtù Sande bụ òtù Bondo.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya