DỌMINIKAN RIPỌBLIK
Jehova Emeela Ka Ọtụtụ Ndị Bata n’Ọgbakọ
Leonardo Amor
A MỤRỤ YA N’AFỌ 1943
E MERE YA BAPTIZIM N’AFỌ 1961
ONYE Ọ BỤ Ọ mụtara eziokwu mgbe ọ na-eto eto. O jeerela Jehova ozi oge niile ihe karịrị afọ iri ise.
IHE dị ka otu ọnwa e gbuchara Trujillo n’afọ 1961, e mere m baptizim. N’oge ahụ, m na-amụ banyere iwu na mahadum. Papa m chọrọ ka m bụrụ ọkàiwu, ma, m ma na ihe Chineke na-akụzi ka ihe ọ bụla a na-akụzi n’ụlọ akwụkwọ. N’ihi ya, m si na mahadum ahụ pụọ, n’agbanyeghị nsogbu niile papa m nyere m. Obere oge, aghọrọ m ọsụ ụzọ pụrụ iche.
Otu n’ime ebe ndị e zigara m bụ La Vega. Ọ bụ ebe Chọọchị Katọlik hiwere isi. N’oge m nọ ebe ahụ, e nweghị onye batara n’ọgbakọ. Naanị mụ na onye ọsụ ụzọ ibe m na-enwe ọmụmụ ihe. M kwuwe okwu ihu ọha, ọ bụ naanị ya na-ege ya. Ma Jehova ji Baịbụl m na-amụ, mgbakọ m na-aga, na ekpere m na-ekpegara ya mee ka ike ghara ịgwụ m ijere ya ozi. M kpewa ekpere, m na-arịọ Jehova ka o mee ka e nwee ọgbakọ na La Vega. Obi dị m ụtọ na e nweela Ụlọ Nzukọ Alaeze isii na ọgbakọ iri na anọ na La Vega. E nwekwara ihe karịrị narị ndị nkwusa asatọ n’ebe ahụ.
N’afọ 1965, alụrụ m Ángela. N’afọ 1981, a kpọrọ anyị bịa jewe ozi na Betel. N’oge m mere baptizim, e nwere naanị narị ndị nkwusa isii na iri asatọ na otu na Dọminikan Ripọblik. Ma ugbu a, e nwere ihe karịrị puku ndị nkwusa iri atọ na puku isii. Ọtụtụ puku mmadụ na-abịakwa mgbakọ anyị. Ọ na-abụ m cheta ole anyị dịbu na ole anyị dị ugbu a, ọ na-atụ m n’anya otú Jehova si mee ka ọtụtụ ndị bata n’ọgbakọ.
Ndị a bụ ndị so na Kọmitii Alaka. E si n’aka ekpe gụrụ gawa aka nri, onye nke mbụ bụ Reiner Thompson, Juan Crispín, Thomas Dean, Leonel Peguero, Leonardo Amor, na Richard Stoddard