Mbara Ụwa Anyị Na-esighị Ike—Gịnị Banyere Ọdịnihu?
NARỊ afọ abụọ gara aga, nwa amaala America bụ́ Patrick Henry sịrị: “Amaghị m ụzọ ọ bụla e si ekpebi ọdịnihu ma ọ́ bụghị site n’ihe ndị gaworo aga.” N’oge gara aga, mmadụ mebiri gburugburu ebe obibi. Ọ̀ ga-amalite ịkpa àgwà ka mma n’ọdịnihu? Ka ọ dị ugbu a, ihe àmà ndị e nwere adịghị agba ume.
Ọ bụ ezie na e nwewo ọganihu ndị a pụrụ ịja mma, n’ụzọ bụ isi ọ bụrụwo nke elu ahụ, na-eleba anya na mgbaàmà kama n’ihe ndị na-akpata ha. Ọ bụrụ na ụlọ nwere osisi gbara ụtụ, ite ebe ndị e ji osisi rụọ ágbá agaghị egbochi ọdịda ya. Nanị mwuzigharị bụ isi pụrụ ịzọpụta ya. N’otu aka ahụ, a ghaghị inwe ndozigharị nke ụzọ mmadụ si jiri mbara ụwa a eme ihe. Nchịkwa nke mmebi nanị agaghị ezu.
N’ịtụle ihe si ná nchịkwa gburugburu ebe obibi nke were 20 afọ na United States pụta, otu ọkachamara kwubiri na “a pụghị ịchịkwa mbibi a na-ebibi gburugburu ebe obibi n’ụzọ dị irè, kama a ghaghị igbochi ya.” N’ụzọ doro anya, ọ ka nnọọ mma igbochi mmetọ karịa ịgwọ ihe ọjọọ ndị ọ na-arụpụta. Ma iru ihe mgbaru ọsọ dị otú ahụ ga-achọ ihe na-adịghị ala karịa mgbanwe bụ isi n’ọha mmadụ na n’ebe oké azụmahịa na-elekwasị anya. Akwụkwọ bụ́ Caring for the Earth na-ekwenye na ilekọta ala chọrọ “ụkpụrụ, akụ̀ na ụba na ọha mmadụ ndị dị iche pụọ n’ihe ka ọtụtụ n’ime ndị e nwere taa.” Gịnị bụ ụfọdụ n’ime ụkpụrụ ndị a dị mkpa ka a gbanwee ha ka e wee zọpụta mbara ụwa?
Ihe Ndị Miri Emi Na-akpata Ọgba Aghara Ahụ
Ịchọ ọdịmma onwe onye nanị. Itinye ọdịmma nke mbara ụwa n’ihu nke ndị mmadụ na-erigbu ya bụ nzọụkwụ mbụ dị mkpa iji chebe gburugburu ebe obibi. Otú o sina dị, ole na ole dị njikere ịgbahapụ ụzọ ịdị ndụ okomoko, n’agbanyeghị na ọ pụrụ ịdị na-emebiri ọgbọ ndị dị n’ihu mbara ụwa. Mgbe gọọmenti nke Netherlands—otu n’ime mba a kasị metọọ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Europe—gbalịrị ibelata iji ụgbọ ala eme njem dị ka otu akụkụ nke ihe omume e ji eme ihe megide mmetọ, mmegide zuru ebe nile kpuru atụmatụ ahụ ihu n’ala. Ọ bụ ezie na ụzọ ndị dị na Netherlands bụ ndị kasị ejupụta n’ụgbọ ala n’ụwa, ndị ji ụgbọ ala eme ihe adịghị njikere ịgbahapụ nnwere onwe ha.
Ọdịmma onwe onye na-emetụta ndị ome mkpebi nakwa ọha mmadụ dum. Ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-ala azụ itinye ụkpụrụ gburugburu ebe obibi ndị pụrụ ime ka a ghara ịtụnyere ha vootu n’ọrụ, ndị ọkà ná mmepụta ihe na-ajụ aro ọ bụla pụrụ iyi uru na uto akụ̀ na ụba egwu.
Anyaukwu. Mgbe ọ bụ ihe metụtara nhọrọ n’etiti uru na nchekwa, ego na-enwekarị ike. Ụlọ ọrụ mmepụta ihe na-etigharị ndị ọnụ na-eru n’okwu anya ka ha wetulata aka ná nchịkwa mmetọ ma ọ bụ iji zere iwu nduzi nke gọọmenti kpam kpam. Mmebi e mebiworo ihe nchebe ozone bụ ihe atụ nke nsogbu a. N’oge na-adịbeghị anya na March 1988, onye isi oche nke otu ụlọ ọrụ ọgwụ bụ́ isi na United States kwuru, sị: “Ka ọ dị ugbu a, ihe àmà sayensị adịghị ezo aka ná mkpa e nwere maka mbelata dị ukwuu ná mpụta nke ọgwụ bụ́ CFC.”
Otú ọ dị, otu ụlọ ọrụ ahụ tụrụ aro ka a kwụsị chlorofluorocarbon (CFC) kpam kpam. Ọ̀ bụ ịgbanwe obi ha? “O metụtaghị ma ọlị ma à na-emebi gburugburu ebe obibi ma ọ̀ bụ na a dịghị emebi ya,” ka Mostafa Tolba bụ onye ntụzi ukwu nke Usoro Na-ahụ Maka Gburugburu Ebe Obibi nke Mba Ndị Dị n’Otu (UNEP) kọwara. “Ọ bụ nnọọ ihe [banyere] ònye gaje inweta uru [akụ̀ na ụba].” Ugbu a ọtụtụ ndị ọkà mmụta sayensị na-aghọta na mbibi nke ihe nchebe ozone bụ otu n’ime ọdachi gburugburu ebe obibi mmadụ kpatara nke kasị njọ n’akụkọ ihe mere eme.
Amaghị nke a na-akọ. Ihe anyị na-amaghị na-eme ka ihe anyị maara dị nta karị. “Anyị ka maara nnọọ ihe dị nta banyere ịba ụba nke ndụ n’oké ọhịa mmiri ozuzo nke ebe okpomọkụ,” ka Peter H. Raven, onye ntụzi nke Missouri Botanical Garden na-akọwa. “N’ụzọ na-eju anya, anyị maara ihe ka ukwuu—ihe ka nnọọ ukwuu—banyere mbara ihu ọnwa.” Otu ihe ahụ bụ eziokwu banyere mbara ikuku. Carbon dioxide hà aṅaa ka anyị pụrụ ịnọgide na-agbanye n’igwe n’emetụtaghị ihu igwe nke ụwa dum? Ọ dịghị onye maara. Ma dị ka magazin bụ́ Time si kwuo, “ọ dị ize ndụ itinye ihe ndị e kere eke n’oké nnwale ndị dị otú ahụ mgbe a na-amaghị ihe ga-esi na ha pụta, ihe ndị pụrụ isi na ha pụta na-atụ egwu nke ukwuu ichetụ n’echiche.”
Dị ka atụmatụ UNEP si dị, o kwere omume na mmebi nke ozone ná ngwụsị nke iri afọ a ga-emesị mee ka ọtụtụ narị puku ndị ọzọ bute ọrịa cancer akpụkpọ ahụ kwa afọ. A mabeghị mmetụta ya n’ahụ ihe ọkụkụ na azụ, ma a na-atụ anya na ọ ga-ebu ibu.
Echiche a na-atụleghị nke ọma. N’adịghị ka ọdachi ndị ọzọ, nsogbu gburugburu ebe obibi na-eji aghụghọ erikpu anyị. Nke a na-egbochi mgbalị ndị a na-eme ijikọ aka mee ihe tupu mmebi na-adịgide adịgide ewere ọnọdụ. Akwụkwọ bụ́ Saving the Planet na-atụnyere ọnọdụ anyị nọ n’ime ya ugbu a na nke ndị ahụ ụgbọ mmiri Titanic ahụ lara n’iyi bu na 1912: “Ole na ole maara banyere ọ̀tụ̀tụ̀ ọdachi ọ pụrụ ịkpata.” Ndị dere akwụkwọ ahụ kwetara na a pụrụ nanị ịzọpụta mbara ụwa ma ọ bụrụ na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ndị na-achụ nta ego echee eziokwu ihu ma chee echiche n’ihe metụtara ihe ngwọta ndị na-adịte anya kama uru ndị na-adịru nwa oge.
Omume iche banyere onwe onye nanị. Ná Nzukọ Ụwa ahụ na 1992, onye isi ala Spain bụ́ Felipe González rụtụrụ aka na “nsogbu ahụ zuru ụwa ọnụ, na ngwọta ya aghaghị ịbụ nke zuru ụwa ọnụ.” Nke ahụ bụ eziokwu, ma ịchọta ngwọta ndị a na-anakwere n’ụwa nile bụ ọrụ sigburu onwe ya n’ike. Otu onye nnọchiteanya nke United States ná Nzukọ Ụwa ahụ kwuru n’ezoghị ọnụ, sị: “Ndị America apụghị ịgbahapụ ụzọ ndụ ha.” Onye India bụ́ ọkachamara na gburugburu ebe obibi bụ́ Maneka Gandhi, n’aka nke ọzọ, mere mkpesa na “otu nwatakịrị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa na-eri ihe 125 ụmụaka ga-eri n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa.” Ọ zọọrọ na “ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mbibi gburugburu ebe obibi nile n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa bụ n’ihi ihe a na-eri n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa.” Mgbe mgbe, mgbalị a na-eme ná mba nile iji meziwanye gburugburu ebe obibi akụwo afọ n’ala n’ihi ọdịmma onwe onye nanị nke mba dị iche iche.
N’agbanyeghị nsogbu ndị a nile bụ isi, e nwere ihe ndị mere a ga-eji jiri nchekwube lee ọdịnihu anya. Otu n’ime ha bụ ikike usoro nchekwa mbara ụwa anyị nwere idozighachi onwe ya.
Ịgwọta Ụwa
Dị ka ahụ mmadụ, ụwa nwere ikike dị ịtụnanya ịgwọ onwe ya. Otu ihe atụ pụtara ìhè banyere nke a weere ọnọdụ n’ime narị afọ gara aga. Na 1883 àgwàetiti Indonesia nke nwere ugwu na-agbawa agbawa nke Krakatau (Krakatoa) gbawara n’oké ntiwapụ nke a nụrụ n’ebe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 5,000 kilomita site n’ebe ahụ. A wụnyere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 21 kubit kilomita nke ihe dị iche iche n’ime igwe, oké osimiri rikpukwara ụzọ abụọ n’ime ụzọ atọ nke àgwàetiti ahụ. Ọnwa itoolu n’ikpeazụ, nanị ihe àmà ndụ e nwere bụ otu udido dị nnọọ nta. Taa ihe ọkụkụ ebe ndị dị mma nke okpomọkụ na-ekpuchi àgwàetiti ahụ dum, ebe ọtụtụ narị ụdị nke nnụnụ, anụ ndị na-enye nwa ha ara, agwọ, na ụmụ ahụhụ jupụtara. O doro anya na ihe nyeworo aka ná mgbake a bụ nchebe nke àgwàetiti ahụ na-enwe dị ka akụkụ nke ogige Ujung Kulon National Park.
A pụkwara idozi mmebi nke ụmụ mmadụ na-eme. Ọ bụrụ na e nye ya oge, ụwa pụrụ ịgwọta onwe ya. Ajụjụ bụ, Ụmụ mmadụ hà ga-enye ụwa ahụ efe ọ chọrọ? Eleghị anya ha agaghị enye. Ma e nwere Onye kpebiworo ime ka mbara ụwa anyị gwọta onwe ya—Onye ahụ nke kere ya.
“Ka Ụwa Ṅụrịa Ọṅụ”
Ọ dịghị mgbe Chineke bu n’obi ka mmadụ bibie ụwa. Ọ gwara Adam ka ‘ọ rụọ ọrụ ma debe’ ogige Iden ahụ. (Jenesis 2:15) Nchegbu Jehova maka ichebe gburugburu ebe obibi pụtara ìhè n’ọtụtụ n’ime iwu o nyere ndị Israel. Dị ka ihe atụ, a gwara ha ka ha hapụ ala ịtọgbọrọ nkịtị otu ugboro n’ime afọ asaa ọ bụla—afọ Izu Ike. (Ọpụpụ 23:10, 11) Mgbe ndị Israel leghaara nke a na iwu Chineke ndị ọzọ anya ugboro ugboro, Jehova mesịrị hapụ ndị Babilọn ikpochapụ ndị ala ahụ, bụ nke ha mere ka ọ tọgbọrọ n’efu ruo 70 afọ “ruo mgbe ụbọchị izu ike ya nile tọsịrị ala ahụ ụtọ.” (2 Ihe Emere 36:21) N’ihi ihe atụ a nke akụkọ ihe mere eme, ọ bụghị ihe ijuanya na Bible na-asị na Chineke ‘ga-emebi ndị ahụ na-emebi ụwa’ ka ụwa wee nwee ike inwetaghachi onwe ya site ná mbibi mmadụ bibiworo gburugburu ebe obibi.—Mkpughe 11:18.
Otú ọ dị, ihe omume ahụ, ga-abụ nanị nzọụkwụ mbụ. Nlanarị nke mbara ụwa, dị ka onye ọkà n’ihe ndị dị ndụ bụ́ Barry Commoner rụtụrụ aka n’ụzọ ziri ezi, “na-adabekwara n’ịkwụsị agha a na-alụso ihe e kere eke na n’ịkwụsị agha a na-alụ n’etiti onwe anyị.” Iji ruo ihe mgbaru ọsọ ahụ, ndị bi n’elu ala aghaghị ịbụ “ndị mmụta Jehova” iji lekọta onwe ha na iji lekọta ebe obibi ha bụ́ ụwa. N’ihi ya, udo ha “ga-abakwa ụba.”—Aịsaịa 54:13.
Chineke na-emesi anyị obi ike na a ga-enwe ndozigharị nke usoro gburugburu ebe obibi ụwa. Kama ịga n’ihu n’akwụsịghị akwụsị, ọzara ‘ga-agbawa okooko ọhịa dị ka rose.’ (Aịsaịa 35:1) N’ọnọdụ ụkọ nri, a ga-enwe ‘ọtụtụ ọka n’ala.’ (Abụ Ọma 72:16) Kama ịnwụ n’ihi mmetọ, osimiri nile nke ụwa ‘ga-akụ aka ha.’—Abụ Ọma 98:8.
Olee mgbe mgbanwe dị otú ahụ ga-ekwe omume? Mgbe ‘Jehova n’onwe ya ga-abụ eze.’ (Abụ Ọma 96:10) Ọchịchị Chineke aghaghị inye ihe nile dị ndụ n’elu ụwa ngọzi. “Ka ụwa ṅụrịa ọṅụ,” ka onye ọbụ abụ ahụ na-ekwu. “Ka oké osimiri bigbọọ, ya na ihe nile dị n’ime ya; ka ọhịa jupụta n’ọṅụ, ya na ihe nile dị n’ime ha. Mgbe ahụ osisi nile nke oké ọhịa ga-abụ abụ ọṅụ.”—Abụ Ọma 96:11, 12, New International Version.
Ụwa nke Onye Okike ya gọziri ma bụrụ nke a na-achị n’ezi omume nwere ọdịnihu dị ebube. Bible na-akọwa ihe ga-esi na ya pụta, sị: “Ezi omume na udo esutụwo ọnụ. Eziokwu na-epu epu n’ala; ezi omume esiwokwa n’eluigwe lepụ anya. Ọzọ, Jehova ga-enye ezi ihe; ala anyị ga-enyekwa ihe omume ya.” (Abụ Ọma 85:10-12) Mgbe chi nke ụbọchị ahụ bọrọ, mbara ụwa anyị agaghị anọkwa n’ihe ize ndụ ruo mgbe ebighị ebi.
[Foto dị na peeji nke 13]
Dị ka ahụ mmadụ, ụwa nwere ikike dị ịtụnanya ịgwọ onwe ya