Ndịàmà Jehova Akpata Ọganihu n’Ịwa Ahụ n’Obi
AKWỤKWỌ akụkọ New York bụ́ Daily News nke August 27, 1995, nyere akụkọ ha isiokwu bụ́ “Ịwa Ahụ n’Ejighị Ọbara.” O kwuru na ụlọ ọgwụ Hospital-Cornell Medical Center nke New York “gaje ikpughe ụzọ dịwagara iche isi waa ahụ nke igbugharị okpo n’obi—otu ịwa ahụ ahụ dịrị onye bụbu Mayor bụ́ David Dinkins mkpa n’oge na-adịbeghị anya—n’agbapụghị ọbụna otu ntụ ọbara.”
“N’ịbụ ndị ihe ndị na-echegbu Ndịàmà Jehova kpaliri,” ka akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwu, “a gaje igosipụta ịdị ebube nke usoro ọhụrụ ahụ . . . ná nchekwa nke ọtụtụ narị puku dollar maka ụlọ ọgwụ dị iche iche na ihe ize ndụ dị ala nke ukwuu nke ntetọ ọbara maka ndị ọrịa.” Dr. Todd Rosengart, onye ntụzi nke usoro ihe omume ịwa ahụ n’ejighị ọbara n’ụlọ ọgwụ ahụ, sịrị: “Anyị nwere ike ugbu a ibelata ọ̀tụ̀tụ̀ mmịnye ọbara dị mkpa n’oge ịwa ahụ a site n’ọ̀tụ̀tụ̀ abụọ ruo anọ bụ́ nke a na-achọkarị maka onye ọrịa ọ bụla ruo n’amịnyeghị nke ọ bụla.”
Dr. Karl Krieger, dibịa na-awa ahụ n’obi n’ụlọ ọgwụ ahụ, onye nyere aka malite usoro ahụ, sịrị: “Site n’iwezụga mkpa maka ọbara ndị onyinye na ihe ndị e ji ọbara mee, anyị na-ebelatakwa ihe ize ndụ nke ahụ ọkụ na mbute ọrịa mgbe a wasịrị ahụ bụ́ ndị na-esochikarị mmịnye ọbara.”
Ndị ọkachamara ọzọ na-asị na “mgbugharị okpo ahụ n’ejighị ọbara na-ebelata oge a na-anọ n’ebe a na-elekọta ndị nọ n’ọnọdụ ọjọọ mgbe a wasịrị ahụ—site na 24 hour ma ọ bụ karị gaa na nanị hour isii. Ndị ọrịa e ji mee nnwale ọgwụgwọ ahụ nwere ike inwetaghachi ahụ ike ha ma si n’ụlọ ọgwụ laa 48 hour ngwa ngwa karị.” Nke ahụ pụtara nnukwute nchekwa ego maka ụlọ ọgwụ, gọọmenti, na ụlọ ọrụ inshọransị. Dr. Rosengart mere atụmatụ na “ịwa ahụ a pụrụ ichekwa ma ọ dịkarịa ala $1,600 kwa onye ọrịa.”
Akụkọ Daily News ahụ gara n’ihu, sị:
“N’ụzọ a na-atụghị anya ya, ọ bụghị mkpali akụ̀ na ụba ma ọ bụ ọbụna ọgwụ na ahụ ike kpaliri ịwa ahụ ọhụrụ ahụ, kama ọ bụ ịnụ ọkụ n’obi nke okpukpe. Ìgwè Ndịàmà Jehova—ndị nkwenye ha na-amachibido mmịnye ọbara—na-achọ enyemaka maka ndị agadi bụ́ ndị òtù ha na-ada ọrịa obi. . . .
“Ná mkpali nke ìgwè Ndịàmà Jehova, ndị dọkịta jikọrọ usoro nchekwa ọbara ha na ọgwụ ndị ọhụrụ ahụ. Ha chọpụtakwara ụzọ ọhụrụ isi jiri ígwè e ji enyere obi na imeju aka na-eme ka ndị ọrịa nọgide ndụ n’oge ịwa ahụ n’obi.
“Tinyere 40 ndị ọrịa bụ́ Ndịàmà Jehova mejupụtara ndị e ji mee nnwale ọgwụgwọ mbụ ahụ, ọnwa isii gara aga òtù Cornell ahụ nke New York malitere iji usoro ahụ agwọ ọha ndị ọrịa. ‘Eri mgbe ahụ, ha emezuwo 100 mgbugharị okpo n’ejighị ọbara n’enweghị otu onye nwụrụ,’ ka Krieger na-ekwu. Ọ̀tụ̀tụ̀ ọnwụ maka ụdị ịwa ahụ mgbugharị okpo a na-emekarị bụ 2.3%.”
Gburugburu ụwa, 102 ụlọ ọgwụ dị iche iche etinyewo usoro ihe omume nke ịwa ahụ n’ejighị ọbara n’usoro ọgwụgwọ ha, na-eme ka ọha ndị ọrịa n’ụwa nile nwee ike inweta usoro ọgwụgwọ ọrịa ndị a ka ghara ịdị ize ndụ.