Nnwere Onwe Pụọ n’Enweghị Ọrụ—n’Ụzọ Dị Aṅaa, Olee Mgbekwa?
DỊ KA Onye Okike ya, mmadụ pụrụ inwe ọṅụ n’ọrụ, bụ́ nke a kọwara n’ụzọ ziri ezi dị ka “onyinye Chineke.” (Eklisiastis 3:12, 13; Jọn 5:17) Ọrụ na-akpali mmasị pụrụ inye anyị obi ụtọ ma mee ka anyị nwee echiche nke ịbụ ndị bara uru na ndị a chọrọ. O siri ike ịhụ onye chọrọ ka a kwụsị ya ọrụ, n’agbanyeghị otú ọṅụ ọ na-enwe na ya si dị nta. E wezụga ịdị na-enye ụgwọ ọrụ, ọrụ a na-akwụ ụgwọ na ya na-enye nhazi, nzube, na echiche nke ịbụ onye nwere àgwà doro ya iche ná ndụ mmadụ. Ọ bụghị ihe dapụtara na mberede na dị ka ọ na-adịkarị, “onye na-enweghị ọrụ chọrọ ọrụ karịa ihe ọ bụla ọzọ.”
Ịchọ Ọrụ
Dị ka anyị hụworo, ọnọdụ dị n’inweta ọrụ dị oké mgbagwoju anya. N’ihi ya, e nwere ọtụtụ usoro bara uru e ji achọ ọrụ. Ndị ruru eru inweta ha pụrụ iji enyemaka gọọmenti maka ndị na-enweghị ọrụ mee ihe n’ebe e nwere ha; n’ebe ọ dịkwa mkpa, ha pụkwara idebanye aha n’ụlọ ọrụ ndị na-ahụ maka enweghị ọrụ ma jiri ozi ha na-eje mee ihe. Ndị ọzọ na-achọta ọrụ site n’ikepụta ọrụ nke ha. Ma e kwesịrị ịkpachara anya. Mgbe mgbe onye na-arụrụ onwe ya ọrụ pụrụ inwe oké mmefu ndị ọ na-aghaghị iche ihu na mbụ bụ́ nke pụrụ isi ike ịkwụchapụ. Ọ dịkwa mkpa ịmata na ịsọpụrụ iwu ụtụ ego na ụtụ isi—ihe siri nnọọ ike ná mba ụfọdụ!—Ndị Rom 13:1-7; Ndị Efesọs 4:28.
Iji chọta ọrụ, ụfọdụ ejiriwo ịchọ ọrụ mere ọrụ, na-eji nkà na nnọgidesi ike na-arara onwe ha nye ya. Ndị ọzọ edegaworo ụlọ ọrụ ndị na-achọ ndị ọrụ akwụkwọ, ma ọ bụ ha etinye ịma ọkwa n’akwụkwọ akụkọ dị n’ógbè ha—bụ́ ndị ụfọdụ n’ime ha na-ebipụta ịma ọkwa ịchọ ọrụ n’efu. Teta! enyewo ndụmọdụ bara uru ma dị irè n’isiokwu ahụ—maka ndị na-eto eto nakwa ndị meworo okenye.a—Lee igbe ndị dị na peji nke 11.
Ị ghaghị ịbụ onye na-eme mgbanwe—dị njikere ịrụ ụdị ọrụ ọ bụla, tinyere ọrụ ndị ị na-enwechaghị mmasị na ha. Ndị ọkachamara na-ekwu na ihe so n’ihe ndị e bu ụzọ ajụ n’ajụjụ ọnụ ọrụ bụ ahụmahụ mmadụ nwebuworo n’ọrụ na ogologo oge a nọworo n’arụghị ọrụ. Enweghị usoro ọrụ a na-agbasochi anya abụghị ihe àmà dị mma nye onye gaje iwere mmadụ n’ọrụ.
Onye ji amamihe jiri oge ya mee ihe n’inweta nkà n’ụlọ akwụkwọ nwere ohere ka mma nke inweta ọrụ mbụ ya. “Enweghị ọrụ,” ka Alberto Majocchi, bụ́ onye nkụzi nkà mmụta ego na-ekwu, “na-emetụtakarị ndị ọrụ na-enweghị nkà.”
Mkpa nke Nkwado Mmetụta Uche
Otu ihe dị mkpa bụ inwe nchekwube. Nke a pụrụ ime ka e nweta ọrụ ma ọ bụ ghara inweta ọrụ. Ndị na-enweghị ọrụ na-enwe oké mmasị ná nkwado mmetụta uche, bụ́ nke na-enyere ha aka ịghara ikewapụ onwe ha ma ọ bụ ịdaba n’ọnọdụ enweghị mmasị. Ọ na-enyekwa aka imeri enweghị nkwanye ùgwù onwe onye nke pụrụ ịbịa site n’iji onwe onye na-atụnyere ndị ọzọ a na-akwụsịbeghị ọrụ ha.
Iji obere ego na-elekọta ndụ pụrụ isi ike. “Ebe ọ bụ na m nwere oké nchegbu, o siiri m ike iji oge m nwere mee ihe nke ọma,” ka Stefano na-ekwu. “Ọnọdụ ahụ mere ka ahụ ghara iru m ala,” ka Francesco na-echeta, “nke na m malitere ilekwasị anya ná mmejọ nke ụfọdụ n’ime ezi ndị enyi m.” Nke a bụ ebe nkwado ezinụlọ dị mkpa. Ụkọ ego na-achọ ime mgbanwe site n’aka ndị òtù nile nke ezinụlọ, iji wee belata ihe ndị dị mkpa ná ndụ. Franco, onye a chụrụ n’ọrụ mgbe ọ dị 43 afọ mgbe ọ rụwooro otu ụlọ ọrụ ọrụ ruo 23 afọ, na-asị: “Malite n’oge ahụ a chụrụ m n’ọrụ, nwunye m nwere echiche ziri ezi, bụrụkwa isi iyi nke oké agbamume.” Armando nwere ekele karịsịa n’ebe nwunye ya nọ n’ihi “oké amamihe ya n’ịzụ ihe n’ahịa.”—Ilu 31:10-31; Matiu 6:19-22; Jọn 6:12; 1 Timoti 6:8-10.
Ụkpụrụ dị iche iche nke Bible pụrụ inyere anyị aka ịnọgide na-enwe echiche dị mma ma ghara ichefu ụkpụrụ ndị ka mkpa. Ndị ahụ a kpọtụrụ aha n’elu, bụ́ ndị Teta! gbara ajụjụ ọnụ, enwetawo mmesi obi ike na-akasi obi site na Bible. Nke a emewo ka ha nwee mmetụta nke ịnọ Chineke nso karị. (Abụ Ọma 34:10; 37:25; 55:22; Ndị Filipaị 4:6, 7) Iso Jehova Chineke na-enwe mmekọrịta chiri anya kasị mkpa, n’ihi na ọ na-ekwe nkwa, sị: “M gaghị aha gị aka ma ọlị, M gaghị ahapụkwa gị ma ọlị.”—Ndị Hibru 13:5.
Ma mmadụ ò nwere ọrụ ma ọ bụ na o nweghị, Okwu Chineke na-agba onye ahụ ume ịzụlite àgwà ndị bara uru maka ndụ a na-adị kwa ụbọchị. Ọ bụghị ihe dapụtara na mberede na a na-achọ Ndịàmà Jehova mgbe ụfọdụ ma nwee mmasị n’ebe ha nọ dị ka ndị ọrụ na-akwụwa aka ọtọ. Ha na-agbaso ndụmọdụ Bible ịbụ ndị na-arụsi ọrụ ike na ndị a pụrụ ịtụkwasị obi, ọ bụghị ịdị umengwụ.—Ilu 13:4; 22:29; 1 Ndị Tesalọnaịka 4:10-12; 2 Ndị Tesalọnaịka 3:10-12.
Nnwere Onwe Pụọ ná Nchekasị nke Enweghị Ọrụ
N’okpuru ụkọ ọrụ, e nwere isi ihe na-akpata ya—ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na anyaukwu nke mmadụ. Dị ka Bible na-ekwu, “mmadụ nwere ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya.”—Eklisiastis 8:9.
Nsogbu enweghị ọrụ—na nsogbu ndị ọzọkwa—ga-abụ ndị a gwọtara site ná mwepụ nke ọchịchị ụmụ mmadụ, nke nọ na “mgbe ikpeazụ” ya ugbu a. (2 Timoti 3:1-3) E nwere mkpa nke ụwa dị ọhụrụ n’ezie. Ee, ụwa nke òtù ụmụ mmadụ ndị ezi omume pụrụ ịdị ndụ ma rụọ ọrụ n’okpuru ịchịisi ziri ezi, nke na-eme ihe n’eziokwu, ebe anyaukwu na-agaghị adịkwa. (1 Ndị Kọrint 6:9, 10; 2 Pita 3:13) Nke ahụ mere Jisọs jiri kụziere ndị mmadụ ikpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa na ka e mee uche Ya n’ụwa.—Matiu 6:10.
Ịkọwa n’ụzọ amụma mwepụ nke ụfọdụ n’ime nsogbu ndị bụ isi nke ihe a kpọrọ mmadụ, Okwu Chineke na-akọwa mmetụta nke Alaeze ahụ, sị: “Ha ga-ewukwa ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akụkwa ubi vine, rie mkpụrụ ha. Ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie; ha agaghị akụ, onye ọzọ erie. . . . Ndị M họpụtaworo ga-enwekwa ihe aka ha rụtara mgbe dị anya nke ukwuu. Ha agaghị adọgbu onwe ha n’ọrụ n’efu, ha agaghị amụ ụmụ nye obi ọlụlọ mmiri.” (Aịsaịa 65:21-23) Nchekasị nke enweghị ọrụ ga-apụ n’anya kpam kpam n’isi nso. Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịmatakwu banyere ihe ngwọta nke Chineke, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova n’ógbè gị.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee Teta! (Bekee) nke October 22, 1994, peji nke 16-18; August 8, 1991 (Bekee), peji nke 6-10; January 22, 1983, (Bekee), peji nke 17-19; na June 8, 1982 (Bekee), peji nke 3-8.
[Igbe dị na peeji nke 11]
Ikepụta Ọrụ n’Ebe Obibi
• Iku obere ụmụaka, ilekọta ụmụaka
• Ire akwụkwọ nri ma ọ bụ okooko osisi ndị a zụlitere n’ebe obibi
• Ịkwa ákwà, ịkwazigharị na idozi ákwà
• Imepụtara ndị na-emepụta ngwá ahịa ihe ọrụ
• Ighe achịcha na ịkwadebe nri
• Ịdụkọta iberibe ákwà, iji àgị̀gá akpa ákwà, ịdụ ákwà; ịma ọnụ ákwà akpụ, ịkpụ ite; nkà ndị ọzọ
• Iji ákwà fụchie oche
• Idebe ihe ndekọ ego, iji ígwè typewriter ede ihe, ọrụ kọmputa ebe obibi
• Ije ozi ịza telifon
• Idozi isi
• Ịkpọbata ndị ezinụlọ na-elekọta n’ụlọ
• Ide adres n’elu envelopu na idejupụta envelopu maka ndị na-eme mkpọsa ngwá ahịa.
• Ịsa ụgbọ ala na ite ha mmanụ (onye ahịa ebute ụgbọ ala n’ebe obibi gị)
• Idozi anụmanụ ezinụlọ na imega ya ahụ
• Idozi ugodi na ime mkpịsị ugodi (ụlọ ọrụ dị n’ebe obibi)
• A pụrụ ime mkpọsa nke ihe ka ukwuu n’ime ndị a n’efu ma ọ bụ n’ọnụ ego dị ala n’ime akwụkwọ akụkọ ma ọ bụ na bọdụ ịma ọkwa nnukwu ụlọ ahịa
[Igbe dị na peeji nke 11]
Ikepụta Ọrụ n’Ebe Na-abụghị Ebe Obibi
• Ilekọta ụlọ (mgbe ndị mmadụ nọ n’ezumike ma chọọ ka e lekọtara ha ebe obibi)
• Ihicha ihe: ụlọ ahịa; ọfịs; ebe obibi na ụlọ obibi mgbe e wusiri ha, mgbe e nwesịrị ọkụ ọgbụgba, mgbe ndị mmadụ kwapụsịworo; ọrụ ndị dị n’ụlọ (n’ebe obibi ndị ọzọ); window (ebe ọrụ na ebe obibi)
• Idozi ihe: ụdị arịa ụlọ dị iche iche (ọbá akwụkwọ nwere akwụkwọ maka ndozi ndị dị mfe ịgbaso)
• Ọrụ enyemaka: ịkụchi ahụ ụlọ; iwu arịa ụlọ, ibó ụzọ, ndo a na-agbakwụnye n’ọnụ ụlọ; ite ágbá; ịgba ụlọ ogige; ịmachi elu ụlọ
• Ọrụ ugbo: ihe ọkụkụ, ịtụtụ mkpụrụ osisi
• Ịhado ala n’ebe obibi na ilekọta obere osisi n’ebe bụ: ọfịs, ụlọ akụ̀, ogige na mbara ụlọ ahịa, paseji dị iche iche
• Ilekọta ihe onwunwe: ndị na-elekọta gburugburu ebe obibi, onye nlekọta (mgbe ụfọdụ na-agụnye ebe a na-enye ụlọ obibi n’efu)
• Inshọransị, ala e wuru ụlọ n’elu ya
• Ịtọ kapet, ihicha ihe
• Ndị a na-ewegara akwụkwọ akụkọ (ndị okenye na ụmụaka), ije ozi ndị ọzọ nke ibuga ihe: ime mkpọsa, mpempe akwụkwọ ịma ọkwa maka ógbè
• Mbuga, nchekwa
• Ịhado ala, ịkwacha osisi, ilekọta mbara, ịwa osisi
• Onye ọkwọ bọs ụlọ akwụkwọ
• Ise foto (ihe osise na ihe omume ọha mmadụ)
• Agá ndị na-egbu azụ
• Ọrụ a na-agbanwe agbanwe: iji ọrụ eletrik gbanwere idozi ụgbọ ala, iji ọrụ ígwè okporo mmiri gbanwere ịkwa ákwà, na ihe ndị ọzọ.
[Foto dị na peeji nke 10]
“Ndị M họpụtaworo ga-enwekwa ihe aka ha rụtara mgbe dị anya nke ukwuu.”—Aịsaịa 65:22