Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 4/8 p. 13-17
  • Chineke Kwere Ka Anyị Chọta Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chineke Kwere Ka Anyị Chọta Ya
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • A Dọrọ Anyị Aka ná Ntị Banyere Ndịàmà Jehova
  • Anyị Ezute Otu n’Ime Ndịàmà Jehova
  • Anyị Erijuo Afọ n’Ụzọ Ime Mmụọ
  • Anyị Agaa n’Ihu Ruo Ntozu Okè Ime Mmụọ
  • Otú Steve Si Nọrọzie na Moscow
  • Ndị Jehova Emerie N’ikpe E kpewere Kemgbe Ọtụtụ Afọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
Teta!—1996
g96 4/8 p. 13-17

Chineke Kwere Ka Anyị Chọta Ya

MGBE Eze Devid jikeere inyefe nwa ya nwoke bụ́ Solomọn ọbụbụeze, o nyere ya ndụmọdụ nke a: “Mara Chineke nke nna gị, were obi zuru okè, werekwa mkpụrụ obi ọ na-atọ ụtọ, fee Ya ofufe: n’ihi na mkpụrụ obi nile ka Jehova na-enyocha, Ọ na-aghọtakwa nchepụta nile ọ bụla nke echiche: ọ bụrụ na ị chọọ Ya, Ọ ga-eme ka ị chọta Ya; ma ọ bụrụ na ị hapụ Ya, Ọ ga-ajụ gị ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Ihe Emere 28:9.

Anyị hụrụ nke a ịbụ eziokwu n’ọnọdụ anyị. Anyị chọrọ Chineke, anyị chọtakwara ya—ma ọ bụ nanị mgbe anyị banyesịrịworo n’ọtụtụ ụzọ ụgha. Anyị kwere na Jehova ghọtara otú echiche uche anyị ji bụrụ ihe a tụkwasịrị n’ụzọ dị ike n’ebe ya na ozi ya dị, o kwekwara ka anyị chọta ya. Nke a bụ otú o si mee.

Anyị dị ụmụnne ndị ikom anọ a zụlitere na Florida, U.S.A. Nna anyị na-anọ ogologo oge n’ọrụ mgbanwerịta dị ka onye osi nri iji kwadoo ezinụlọ anyị, nne anyị bụ onye na-elekọta ụlọ, anyị anọ kwa bụ́ ụmụ okoro chọtara ọrụ ịsụcha ahịhịa, ikesa akwụkwọ akụkọ—ihe ọ bụla nke ga-atụnye ụtụ n’ego ezinụlọ. Nne anyị bụ onye Katọlik, Nna anyị bụkwa onye Baptist. Anyị nile kwere na Chineke na Bible ma ọ dịghị ihe anyị mere banyere ya, anyị adịghịkwa agachi chọọchị anya. Ọ bụ n’ime afọ ndị 1970, mgbe udo, jeans bongo, ogologo agịrị isi, na egwú rock na-ewu nnọọ ewu. Ihe ndị a nile nwere mmetụta ná ndụ anyị.

Ọ bụ na 1982 ka anyị abụọ, Scott na Steve—dị afọ 24 na 17 dị ka e si depụta aha anyị—nwere mmasị siri ike na Bible wee zụlite nchegbu na-arị elu banyere ọnọdụ ụwa ndị na-adakpọ adakpọ. Scott nwere ụlọ ọrụ owuwu ihe nke ya. Ọ na-enye uru, ya mere anyị abụọ kwabara n’otu ọnụ ụlọ. Ịnọ ogologo oge n’ụlọ a na-aṅụ mmanya na ụzọ ịdị ndụ ahụ agwụwo anyị ike, anyị matakwara na a ghaghị inwe ụzọ ndụ ka mma n’ebe ọzọ. Anyị malitere inwe agụụ maka ihe ime mmụọ. Ịgụchi Bible anyị anya nyeere anyị aka inwe ọchịchọ maka ihe ọmụma na nghọta ka ukwuu n’ime Okwu Chineke.

Anyị malitere ije chọọchị dị iche iche n’ụbọchị Sunday. Ná ndị anyị jere n’ebe dị nso n’ụlọ anyị na Lake Worth, Florida, 25 minit nke okwuchukwu Sunday ga-abụ banyere inye ego. “Nye ná mmesapụ aka, jiri mmesapụ aka dị ukwuu nye ihe,” ka onye okwuchukwu ahụ na-ekwu ka o ji otu akụkụ dabere na table ikpo okwu. Ha na-ebugharịkarị efere ego ugboro atọ n’otu nnọkọ, nke mere na ọtụtụ ndị na-ala ụlọ n’ejighị kobo n’akpa ha. Anyị jere ọtụtụ chọọchị, ma nanị ihe anyị chọpụtara bụ ọtụtụ efere ụtụ ego a na-ebugharị na nnọkọ oriri na ọṅụṅụ dị iche iche.

A Dọrọ Anyị Aka ná Ntị Banyere Ndịàmà Jehova

A kụminyere ihe anyị chere na ọ bụ ozizi ndị bụ́ isi nke Bible n’obi anyị, anyị nakwerekwaara ha n’ihi na ndị nkụzi ndị ahụ bụ ndị ji nkà mmụta okpukpe mere ọrụ. Otu n’ime klas ndị ahụ bụ banyere òtù nzuzo dị iche iche n’America, ndị nọkwa n’ọkwá mbụ ná ndepụta ahụ bụ Ndịàmà Jehova. A dọrọ anyị aka ná ntị na ha ekweghị na Jisọs, na ha nwere Bible nke ha, na ha agaghị aga eluigwe, nakwa na ha kwere na hel adịghị. N’eziokwu, ihe ndị a nile dugara anyị n’ikwubi na Ndịàmà ezighị ezi.

Ka ọ dị ugbu a anyị nwere ịnụ ọkụ n’obi siri ike ma ọ bụghị dị ka mmazu si dị. (Ndị Rom 10:2) Anyị maara ihe Jisọs kwuru na Matiu 28:19, 20—anyị aghaghị ikwusa ozi ọma, meekwa ndị na-eso ụzọ. N’oge ahụ, anyị na-eje otu chọọchị a na-akpọ Bible Town nke nwere 2,000 ndị òtù, n’ebe anyị bụ akụkụ nke ìgwè ndị ntorobịa nke ihe dị ka 100 ndị nọ n’agbata afọ 17 na 30. Scott gbalịrị ime ka ha mee nkwusa n’ụzọ ụfọdụ—ma nke ahụ enweghị isi.

Ya mere anyị malitere ọrụ nkwusa nke anyị. Scott nwetara echiche nke iguzobe otu obere ụlọ ghere oghe n’ahịa ebe a na-ere ihe ndị e jiworo mee ihe wee na-ekesa traktị na Bible. Ya mere nke ahụ bụ ihe anyị mere. Anyị jere n’otu ebe a na-ere akwụkwọ “ndị Kraịst” wee zụrụ ọtụtụ traktị na Bible, gaa n’ahịa ebe a na-ere ihe ndị e jiworo mee ihe, guzobe oké ịnyịnya ibu abụọ, tụkwasị otu ibe osisi plywood n’elu ha, tụkwasị traktị na Bible anyị n’elu ha, nwaakwa ịghọ ‘ndị na-eme okwu ahụ, ọ bụghị ndị na-anụ nanị ọnụnụ.’—Jemes 1:22.

Ka izu nke ọ bụla na-agabiga, ihe ahụ a na-akpọ okwuchukwu nke ahịa ebe a na-ere ihe ndị e jiworo mee ihe na-eto, na-enyefe akwụkwọ Bekee tinyekwara nke Spanish. Ọzọkwa, anyị nwere Bible, 30 traktị dị iche iche, na ọbụna ihe ndị a na-akwụnye n’okpu nke sịrị “Chineke hụrụ gị n’anya.” N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, Scott zụtara otu ígwè obibi akwụkwọ iji na-ebi obere ozi Bible n’elu T-shirt—na-ekwu ihe dị ka: “Ị̀ gụwo Bible gị taa?,” “Ị̀ na-enwe mgbagwoju anya banyere ihe mere m ji na-amụmụ ọnụ ọchị? Enwere m Jisọs n’ime obi m,” na ọtụtụ ndị ọzọ. Otu sịrị “Mkpughe” ma nwee ihe osise ndị ịnyịnya anọ ahụ.

Anyị chere na anyị na-agba àmà n’ekwughị okwu site n’iyi efe ndị ahụ n’ebe nile. Saturday na Sunday ọ bụla, malite n’elekere asatọ nke ụtụtụ ruo n’elekere mbụ nke ehihie, anyị na-ekwu okwuchukwu nke ahịa ebe a na-ere ihe ndị e jiworo mee ihe. Ọ bụrụ na ị na-agabiga n’ebe a na-adọba ụgbọ ala wee hụ traktị n’elu ụgbọ ala, anyị anọwo ebe ahụ. Akwụkwọ nile bụ n’onyinye, ọ bụ ezie na ọ bụ ego dị nnọọ nta ka a natara. N’otu afọ, anyị gbakọrọ mmefu nile nke afọ ahụ, ha rukwara ihe karịrị $10,000.

Anyị Ezute Otu n’Ime Ndịàmà Jehova

Otu oge, mgbe anyị na-egwu mmiri n’ụsọ osimiri dị na Bonita Springs, otu nwoke metụrụla agadi bịakwutere anyị wee kwuo na ya hụrụ ihe odide ndị a mapawara na gwongworo anyị, hụkwa T-shirt anyị. Ọ malitere na-ekwu banyere Bible, na-atụgharịkwa uche site n’Akwụkwọ Nsọ. O wepụtara isi ihe dị n’Ọrụ 2:31, na-ajụ, sị: “Ọ bụrụ na e nwere ọkụ ala mmụọ, ọ bụrụkwa na ọ bụ nanị ndị ajọ omume na-aga ebe ahụ, mgbe ahụ n’ihi gịnị ka Bible ga-eji kwuo na Jisọs nọrọ ebe ahụ?” Ọ gara n’ihu na-atụle ọtụtụ akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ọzọ. N’ikpeazụ Scott kwuru, sị: “Ị ghaghị ịbụ otu n’ime Ndịàmà Jehova.” Ọ zaghachiri, sị: “Ee, abụ m.” Mgbe ahụ Scott kwuru, sị: “Unu ekweghị na Jisọs.” N’ime 20 minit sochirinụ, Onyeàmà ahụ kwuru banyere Jisọs, ma n’ụzọ ụfọdụ, o metụghị anyị n’ahụ.

Anyị gara n’ihu n’okwuchukwu ahịa ebe a na-ere ihe ndị e jiworo mee ihe ná ngwụsị izu nile. Anyị anọwo na-eme nke a ruo afọ atọ—na-ekweta mgbe nile na anyị nwere eziokwu, na-emekwa ihe ziri ezi. Anyị ka na-eletakwa chọọchị dị iche iche, otu n’abalị Sunday ọ bụla, ọ dịghịkwa mgbe afọ juru anyị n’ebe nke ọ bụla n’ime ndị anyị jere dị. Ọ fọrọ nke nta ka anyị gazuo chọọchị nile, ya mere n’otu abalị anyị kpebiri ije otu n’ime “chọọchị Ndịàmà Jehova,” dị ka anyị si tinye ya. Anyị na-aga ikwusara ha banyere Jisọs. Anyị chọtara adres ha n’akwụkwọ telifon wee gaa ebe ahụ n’otu uhuruchi Sunday. Ngwa ngwa anyị nụrụ na ha enweghị nzukọ n’uhuruchi Sunday dị ka chọọchị ndị ọzọ, anyị kpebiri na ha ekweghị na Jisọs n’ezie. Anyị hụrụ ọmụmụ akwụkwọ a na-enwe n’abalị Monday n’ihe odide na-egosi oge nzukọ dị iche iche. Ya mere anyị buuru Bible anyị, yirikwa T-shirt anyị lọghachi. Anyị chetara na anyị weere minit ole na ole iji kpebie nke anyị ga-eyi n’ime T-shirt ndị ahụ—nke ga-abụ ezi àmà. Anyị rutere n’ebe ahụ mgbe oge na-eruchabeghị, ụmụnna ole na ole bịakwutekwara anyị. Ha na-ekpo ọkụ, nweekwa omume enyi. Ngwa ngwa anyị banyere ná nkwurịta okwu dị omimi banyere Mkpughe. Ha gwara anyị ka anyị nọrọ maka nzukọ ahụ. Ha nyere anyị akwụkwọ Ịdị n’Otu n’Ofufe, ya mere anyị nọdụrụ ala.a Otu nwanna nwoke meghere ọmụmụ ihe ahụ n’ekpere.

Anyị ṅara ntị nke ọma. Ná mmechi, ọ sịrị: “Site n’aha Jisọs. Amen.” Anyị lerịtara onwe anyị anya n’oké ijuanya. “Ànyị nụrụ ihe o kwuru nke ọma? O kpere ekpere n’aha Jisọs!” N’oge ahụ, o yiri ka anya anyị ò mepere, ihe dịkwa ka akpịrịkpa adapụsịa. Ọ bụrụ na obi anyị ziri ezi, ugbu a bụ oge ịnụ ihe. Nwanna nwoke ahụ gwara mmadụ nile ka ha sapeta isi nke 21 nke akwụkwọ Ịdị n’Otu n’Ofufe, nke bụ́ banyere Jisọs na abụghị akụkụ nke ụwa. Ọ dịghị ọmụmụ ihe ka mma ịnọ na ya karịa nke ahụ. Ọ bụ banyere ndụ na ije ozi Jisọs, mgbe ikpeazụ, na nnọpụiche. Anyị nụrụ ka ụmụaka na-aza ajụjụ n’ọtụtụ isi ihe anyị na-amaghị ma ọlị. Mgbe ahụkwa, n’imechi nzukọ ahụ, nwanna nwoke ahụ kpere ekpere n’aha Jisọs!

Anyị Erijuo Afọ n’Ụzọ Ime Mmụọ

Anyị abatawo n’ụlọ nzukọ ahụ, na-enwe akpịrị ịkpọ nkụ maka eziokwu, ọ dịkwa n’ebe ahụ, n’adịghị anya ma ọlị. Anyị lara, na-amara na anyị erijuwo afọ n’ụzọ ime mmụọ, ọ dịghịkwa mgbe ọ bụla anyị gara chọọchị ọzọ. N’abalị sochirinụ, ka anyị na-asụ ákwà anyị n’ebe A Na-asụ Ákwà Onwe Onye, anyị hụrụ nnukwu mkpokọba nke magazin Ụlọ Nche na Teta! n’akụkụ ígwè ncha soda—ha dị 150 ma ọ dịkarịa ala. Ọ dịghị ihe gaara eme ka anyị gụọ ha na mbụ, ma ugbu a anyị kekọtara ha n’ùkwù, na-enwe mmasị n’ọtụtụ isiokwu.

Otu n’ime isiokwu ndị ahụ jụrụ, sị, “Ì kwere n’Atọ n’Ime Otu?” Ọzọ: “Hel ọ̀ dị adị n’ezie?” N’otu Teta! e nwere otu isiokwu banyere ihe oyiyi. N’abalị ahụ, Steve gụrụ nke kwuru banyere Atọ n’Ime Otu, mee ọtụtụ nchọpụta, gụọ akụkụ akwụkwọ nsọ nile, ma kpọlite Scott n’ụra n’elekere 12:30 nke ụtụtụ n’ihi ihe ọ mụtaworo. N’ụbọchị nke na-esonụ, bụ́ Wednesday, mgbe e mechisịrị ọrụ, Steve gụrụ isiokwu nke kwuru banyere hel. Ọ tụlere Jọn 11:11, ebe Jisọs kwuru na Lazarọs dara n’ụra. Mgbe Steve hụrụ Scott, o kwuru, sị: “Bible m adịghị akụzi na e nwere hel na-ere ọkụ.” Mgbe anyị gụsịrị Teta! nke kwuru banyere ihe oyiyi na ụdị obe dị iche iche, anyị tụbara ndị nke anyị na gwongworo, na-ekirikwa ka e bupụrụ ha. Anyị lekọrịtara onwe anyị anya, fufee isi anyị, mụmụọkwa ọnụ ọchị. Anyị maara na anyị achọtawo ihe pụrụ nnọọ iche—eziokwu ahụ.

Otu ụbọchị mgbe nke ahụ gasịrị, igbe abụọ rutere. E nwere 5,000 traktị n’ime ha, ndị na-ekwu na ị ga-aga na hel ma ọ bụrụ na i chegharịghị. Anyị maara ugbu a na ọtụtụ n’ime traktị ndị a ezighị ezi dị ka ozizi Bible si dị. N’inwetụ mgbagwoju anya, anyị gaghachiri ọmụmụ akwụkwọ n’abalị Monday, jirikwa ọtụtụ n’ime traktị anyị gaa. Anyị jụrụ, sị, “Nke a ọ̀ dị mma?” N’otu abalị, anyị nyochara ha nile. N’oge na-adịghị anya, e nwere otu mkpokọba nke traktị dị iche iche n’ala ụlọ; ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha kwekọrọ n’ozizi Bible. Anyị tụfusịrị ha nile. Anyị maara na okwukwe ọhụrụ anyị pụtara ndụ anyị na ndụ ndị anyị na-agbara àmà. Anyị chọrọ ịpụ apụ iji mụọ Bible n’enweghị mgbochi ọ bụla.

Anyị kwagara Alaska. Ná nzukọ mbụ anyị n’ebe ahụ, anyị jụrụ otu okenye ma ọ̀ ga na-amụrụ anyị ihe kwa ụbọchị. Echere m na ndị nile bịaranụ nụrụ ihe anyị jụrụ. Anyị nwere ọganihu dị mma, mụchaa akwụkwọ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi, wee chọọ ime baptism n’otu n’ime mgbakọ ụbọchị abụọ ndị ahụ.* Ma anyị aghaghị ichere ruo nwa oge. Ihe mgbaru ọsọ anyị bụ ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ. Na mberede, nna anyị dara ọrịa, anyị lọtakwara Florida iji nye aka.

Anyị Agaa n’Ihu Ruo Ntozu Okè Ime Mmụọ

Na Florida anyị nwere ọganihu dị mma, mụchaa akwụkwọ Ịdị n’Otu n’Ofufe, mgbe ahụkwa bụrụ ndị e mere baptism na 1987. O ruwo ọnwa 11 kemgbe anyị malitere. N’egbughị oge anyị ghọrọ ndị ọsụ ụzọ inyeaka ruo ọnwa isii, mesịakwa ghọọ ndị ọsụ ụzọ oge nile. Nanị otu afọ na ọkara mgbe nke ahụ gasịrị, a họpụtara anyị abụọ dị ka ndị ohu na-eje ozi. Afọ abụọ mgbe baptism anyị gasịrị, anyị chọtara onwe anyị ka anyị na-eje ozi na Betel dị na Brooklyn, bụ́ ebe Scott ka na-eje ozi ruo taa, ọ nọwokwa na-amụ asụsụ Chinese kemgbe afọ abụọ. Steve na-eje ozi ugbu a na Moscow, Russia, dị ka onye ọsụ ụzọ oge nile. Anyị abụọ hụrụ eziokwu ahụ na ọchịchọ a na-achọ ya, dị nnọọ ka Ilu 2:1-5 na-akọwa ya, sị: “Nwa m, ọ bụrụ na ị nara okwu ọnụ m nile, ọ bụrụkwa na i zobe ihe nile m nyere n’iwu n’ebe ị nọ; ị tọọrọ amamihe ntị gị n’ala, wee wezụga obi gị inwe nghọta; ee, ọ bụrụ na ọ bụ mmata ka ị na-akpọku, ọ bụrụkwa na ọ bụ nghọta ka ị na-eweliri olu gị; ọ bụrụ na ị chọọ ya dị ka ọlaọcha, ọ bụrụkwa na ọ bụ dị ka akụ̀ zoro ezo ka ị na-egwupụta ya: mgbe ahụ ka ị ga-aghọta egwu Jehova, ọ bụkwa ihe ọmụma Chineke ka ị ga-achọta.”

Otú Steve Si Nọrọzie na Moscow

N’ibi na New York, bụ́ ebe ịmata asụsụ ọzọ ga-eme ka ọrụ nkwusa ahụ dịkwuo ụtọ—na iche na ikekwe Jehova ga-emeghe ụzọ na Russia n’oge na-adịghị anya—ekpebiri m ịmụ asụsụ Russian. N’oge ahụ, ka m na-arụ ọrụ na Betel na Brooklyn, amalitere m ịga ọmụmụ akwụkwọ a na-enwe n’asụsụ Russian. E nwere nanị otu ìgwè ọmụmụ akwụkwọ a na-enwe n’asụsụ Russian, bụ́ ndị na-ezukọ n’ụbọchị Friday. Ka oge na-aga, amalitere m itinyekwu onwe m n’ìgwè Russian ahụ. Esooro m ha n’ọrụ ime nkwusa, bụ́ nke dị nnọọ ụtọ n’ihi ikpo ọkụ nke ndị Russia. Edegaara m Ngalaba Ije Ozi akwụkwọ, na-arịọ ka e ziga m n’ìgwè Russian ahụ. Obi tọrọ m ụtọ mgbe ha kwetara na nke a.

Otu ụbọchị n’oge ofufe ụtụtụ Betel, onye isi oche Watch Tower Bible and Tract Society, bụ́ Milton G. Henschel, gwara ezinụlọ ahụ na a ga-enye akụkọ pụrụ iche. Mgbe ahụ ọ mara ọkwa na e nyewo Ndịàmà Jehova ikike n’ụzọ iwu kwadoro na Russia, nakwa na ụmụnna anyị ga-anụ ụtọ nnwere onwe nke ofufe ugbu a. Echeghị m na ọ dị onye ọ bụla na Betel n’ụbọchị ahụ nke ga-echefu ọṅụ anyị nwere mgbe anyị nụrụ akụkọ dị otú ahụ dị ebube. Echere m n’otu mgbe ahụ na ọ ga-abụ oké ihe ùgwù inwe ike ịbụ akụkụ nke ókèala ọhụrụ ahụ dị ukwuu.

Mụ na otu nwanna nwoke bụ́ onye Russia aha ya bụ́ Volodeya, nke bi na Krasnodar, Russia, malitere iderịta akwụkwọ ozi. Ọ kpọrọ m òkù ịbịa leta Russia. Ya mere na June 1992, akwakọtara m akpa ibu m wee gawa Moscow. Ozugbo m rutere, obi tọrọ m ụtọ nke ukwuu ịhụ Nwanna Volodeya ka ọ na-echere n’ọdụ ụgbọ elu ahụ. Esooro m Nwanna Stephan Levinski biri—onye nọworo 45 afọ n’eziokwu. Ọ bụ Onyeàmà mbụ m zutere na Moscow, ọ nọwokwa ọtụtụ afọ n’ụlọ mkpọrọ n’ihi nguzo ya maka eziokwu. Ile ọbịa nke ụmụnna ndị ahụ dị egwu n’ezie.

Ya mere anọ m na Moscow, n’amaghị ihe dị ukwuu n’asụsụ ya. N’oge ahụ, e nwere nanị ọgbakọ anọ, o yikwara ka anyị maara ụmụnna nile. Kemgbe ahụ, site n’ime nnwale, ejisiwo m ike gbatịkwuo akwụkwọ ikike nleta m. Enwere m ike ịrụ ọrụ site n’oge ruo n’oge iji hụ maka mmefu m dị iche iche. Ihe isi ike kasị ukwuu m nwere bụ ịmụ asụsụ Russian zuru ezu iji ekwurịta okwu na iji eriju afọ n’ụzọ ime mmụọ ná nzukọ dị iche iche. Ọ bịara nke nta nke nta, n’eziekwa, m ka na-arụ ọrụ n’elu ya.

Enwewo m ihe ùgwù nke ịga ọtụtụ mgbakọ na nke ịhụ uto dị ịtụnanya na ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị e mere baptism. Ịhụ ezi ịnụ ọkụ n’obi nke ụmụnna anyị n’ebe a abụrụwo ahụmahụ dị ukwuu, na-ewusiwanye okwukwe ike. Agaghị m eji ihe ọ bụla gbanwere ya. Ọtụtụ n’ime ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị m zutere na-amụ nanị ihe ma ọ bụ ka mere nnọọ baptism mgbe m bịara, na-eje ozi ugbu a dị ka ndị ọsụ ụzọ oge nile ma ọ bụ ndị ohu na-eje ozi ma ọ bụ ndị ozi Betel na Solnechnoye, na nso nso St. Petersburg, Russia.

Ihe dị ka 530 mmadụ na-ejupụta n’ọgbakọ m nọ na ya na Sunday ọ bụla, n’ọnwa ọ bụla kwa anyị na-enwe nkezi nke ndị nkwusa 12 ọhụrụ a na-emebeghị baptism. Ngụkọ ikpeazụ e mere bụ 380 ndị nkwusa, ndị okenye 3, na ndị ohu na-eje ozi 7. Ọgbakọ anyị na-enye akụkọ ihe karịrị 486 ọmụmụ Bible ebe obibi. Na February 1995, enwere m ihe ùgwù nke ileta ọmụmụ akwụkwọ 29 anyị iji kwuo okwu ije ozi. Eletara m ìgwè anọ n’otu izu. Anyị na-ejikwa ọrụ n’aka nke ukwuu tupu mgbakọ nke ọ bụla eruo n’ihe banyere ajụjụ maka ndị a gaje ime baptism. Na May 1995, anyị nwere ụbọchị mgbakọ pụrụ iche, bụ́ ebe e mere 30 mmadụ sitere n’ọgbakọ anyị baptism. Ná ngụkọta, e nwere 607 ndị e mere baptism n’ime ihe dị ka 10,000 ndị bịaranụ. Ná mgbakọ distrikti nke oge okpomọkụ, 24 mmadụ sitere n’ọgbakọ anyị so na 877 ndị e mere baptism! Anyị nwere ndị ọsụ ụzọ oge nile 13 na ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche 3 n’ọgbakọ anyị. Ha dum na-enye akụkọ ihe ruru 110 ọmụmụ ihe! Ka ọ dị ugbu a, anyị nwere 132 ndị nkwusa a na-emebeghị baptism.

N’Ememe Ncheta anyị na 1995, anyị nwere 1,012 ndị bịaranụ! Society ka zitere otu nwanna bụ́ onye Poland, bụ́ Mateysh, n’ọgbakọ anyị. Ọ gụsịrị akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi, ọ ga-enyekwa aka n’ụzọ dị ukwuu. Anyị nwere ndị okenye atọ ugbu a. Ya mere a ga-ehiwe ọgbakọ ọzọ, a ga-ekewakwa ókèala anyị—nke nwere ihe fọrọ nke nta ka o ruo otu nde mmadụ n’ọnụ ọgụgụ—ụzọ abụọ. Nke ọ bụla n’ime ọgbakọ abụọ ndị ahụ ga-enwe ihe dị ka 200 ndị nkwusa. Otu ọgbakọ ga-enwe ndị okenye abụọ, nke ọzọkwa, otu okenye. Anyị nwere mgbakọ ọzọ na-abịanụ, ya mere ugbu a anyị na-esoro 44 ndị ga-adị njikere ime baptism mgbe ahụ na-atụle ajụjụ ndị ahụ. Ọ na-ada ụda ka ihe na-ekweghị omume! Ọ bụ paradaịs ime mmụọ n’ezie! Ọ dị ịtụnanya! Ọ bụ aka Jehova nọ n’ọrụ n’ezie. Ụgbọ ịnyịnya ya yiri ka ọ na-aga oké ngwa ngwa n’ime Russia n’oge a. N’ihe dị ka n’October 1995, e nwere ihe dị ka 40 ọgbakọ na Moscow. Ọ pụrụ ịmụba okpukpu abụọ n’ụzọ dị mfe ma ọ bụrụ na e nwere ndị okenye zuru ezu.

Oge okwuchukwu anyị n’ahịa ebe a na-ere ihe ndị e jiworo mee ihe agabigawo n’ogologo oge gara aga. Scott nọ na Betel dị na Brooklyn, Steve na-eje ozi dị ka okenye n’otu n’ime ọgbakọ ndị dị na Moscow—anyị abụọ nwere ekele dị ukwuu na Chineke kwere ka anyị chọta ya. Anyị na-ekpe ekpere ka ọtụtụ nde ndị ọzọ chọọ ya, nakwa na Chineke ga-ekwe ka ha chọta ya.—Dị ka Scott na Steve Davis si kọọ ya.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 14]

Scott

[Foto dị na peeji nke 15]

Steve

[Foto dị na peeji nke 17]

Otu ọgbakọ dị na Moscow na-enwe ihe karịrị 530 mmadụ ndị na-abịa na Sunday ọ bụla

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya