Mgbawa Ala Ndị Zoro Ezo
N’AUGUST 18, 1994, ọ dịkarịa ala 171 mmadụ nwụrụ n’Algeria n’ihi otu ala ọma jijiji dị ike. Ọtụtụ narị mmadụ merụrụ ahụ, ọtụtụ puku enwekwaghị ebe obibi. Ọtụtụ izu tupu mgbe ahụ, ala ọma jijiji ndị buru ibu dakwasịkwara Bolivia, Colombia, na Indonesia, bụ́ ndị tụfuru ndụ nke ọtụtụ narị mmadụ ná ngụkọta.
Ị̀ maara na oké ọdachi ndị a weere ọnọdụ? Ọ dịghị otú ahụ ma eleghị anya, ma ọ́ bụghị ma ha metụtara gị n’onwe gị ma ọ bụ na i biri ná mba ya na ebe ahụ gbara agbata obi. N’aka nke ọzọ, mgbe oké ala ọma jijiji dakwasịrị ógbè California, U.S.A., o yiri ka akụkọ ahụ gbasara dị ka ọkụ ụgụrụ, ihe ndekọ nkà mmụta sayensị banyere ala ọma jijiji ndị ahụ pụtara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ozugbo ahụ.
Ihe kpatara ya bụ na ọ dịghị ógbè ọzọ ndị ọkà mmụta sayensị nyochaworo nke ọma dị ka ha meworo ebe ndịda California, ebe ihe karịrị 700 ígwè ọrụ e ji atụ ime mkpatụ ala n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ na-agụkọ ala ọma jijiji ndị ọ̀tụ̀tụ̀ ha dị nta dị ka 1.5. Ọnụ ọgụgụ bara ụba nke ndị ọkachamara n’ịtụ ime mkpatụ ala n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ n’ógbè ahụ na-eme ka o doo anya ihe mere ụba ihe ọmụma banyere ala ọma jijiji ji esite n’ógbè ahụ.
Nchọpụta E Mere na Nso Nso A
Obi abụọ adịghị ya na nchọpụta nke a sara mbara enyeworo ndị ọkà mmụta sayensị aka n’ọtụtụ mba ịghọta ala ọma jijiji na ọbụna ịgbalị ibu ụzọ kwuo na ha ga-eme iji gbochie mmerụ ahụ. Nkà na ụzụ dị otú ahụ dị mkpa, ebe ọ bụ na ihe dị ka 40 ala ọma jijiji ndị siri oké ike na-etisasị akụkụ dị iche iche nke ụwa kwa afọ. E nwekwara ala ọma jijiji ndị dị nta karị, bụ́ ndị na-adịchaghị emerụ ahụ ma bụrụ ndị buru ibu nke na a ka pụrụ inwe mmetụta ha. Ndị a na-eme n’agbata 40,000 na 50,000 ugboro kwa afọ!
O doro anya na ọ bụ nnukwu iberibe nkume dị n’okpuru ala ndị na-agbawa ma na-afanye n’ebe ọhụrụ mgbe a kpagidere ha na-akpata ihe ka ọtụtụ n’ala ọma jijiji. Mgbe mgbe ntiwa ndị a na-ewere ọnọdụ n’ebe mkpo ala gbawara agbawa. A matara ntiwa ndị a dị ka mgbawa nke ala.
Ọtụtụ oge, ndị ọkà mmụta sayensị na-enwe ike ịmata ebe e nwere mgbawa ndị a, wee si otú a na-amata kpọmkwem ebe ala ọma jijiji nwere ike iwere ọnọdụ. N’ihi gịnị ka anyị ji asị “ọtụtụ oge”? N’ihi na ndị ọkà mmụta sayensị amụtawo n’oge na-adịbeghị anya na nchọpụta ha adịghị egosipụta ihe nile dị ka ha cheburu. Dị ka ihe atụ, mkpughe ndị e nwere n’oge a na ihe ka ọtụtụ n’ala ọma jijiji ndị a pụrụ ịtụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ na California na-ewere ọnọdụ n’ebe e nwere mgbawa ala zoro ezo na-enye ndị ọkà mmụta sayensị nsogbu—n’ọtụtụ ọnọdụ n’ógbè ndị ọkà mmụta mbara ụwa cheburu na ha enwechaghị ihe ize ndụ nke ala ọma jijiji.
Dị ka onye ọkà mmụta sayensị bụ́ Ross Stein nke Nnyocha Mbara Ụwa na United States na Robert Yeast nke Mahadum Oregon State si kwuo, “mbara ala bụ́ ugwu ugwu bụ ma eleghị anya nhado ala na-eyi egwu kasị ala, na-eme ka e cheta ọnọdụ udo kama ihe ize ndụ.” Otú o sina dị, ihe ọmụmụ ha emewo ka a mata mgbawa ala ọma jijiji ndị e nwere n’okpuru ikpo nkume, bụ́ ndị e bibiworo ọtụtụ n’ime ha n’ihi mmanụ ndị dị n’okpuru ha. N’ihi gịnị ka mgbawa okpuru ala ndị a jiworo nọgide na-agbanahụ nchọpụta, ruokwa ókè hà aṅaa ka ha bụ ihe ize ndụ?
Iyi Egwu A Na-agaghị Eleghara Anya
Ọ dịwo anya ndị ọkà mmụta mbara ụwa matara na a pụrụ ịkpagide nkume ma fụkọta ha dị ka ákwà hịkọrọ ahịkọ. Ma e cheburu n’ọha na nke a bụ usoro na-aga nwayọọ nwayọọ, nke na-aga n’ihu. Otú ọ dị, ihe ọmụmụ ndị e mere na nso nso a banyere ikpo nkume ndị dị njikere mgbawa na-egosi na ha na-amali elu ná ntiwapụ mberede—n’ihe ruru mita ise n’ime nanị nkeji ole na ole! Mkpatụ mfụkọta nke a na-akpagide ikpo nkume dị n’okpuru ala. Mkpagide nke na-esi na ya apụta na-etiwa nkume dị n’okpuru mfụkọta ahụ, otu iberibe nkume na-amalitekwa ịdakwasị n’elu ibe ya. Mfụkọta ndị a yiri ka ha adịghị ize ndụ tinyere mgbawa ha ndị dị njikere iwere ọnọdụ n’okpuru ala na-amalite ịghọ ala ọma jijiji tupu ndị ọkà n’ịtụ ala ọma jijiji n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ enwee ohere ịchọpụta ha. Mgbawa okpuru ala ndị dị otú ahụ pụrụ ịkpata ala ọma jijiji ndị siri ike dị nnọọ ka mgbawa ndị siri ike karị si eme, bụ́ ndị na-apụta ìhè n’elu ala.
Ala ọma jijiji ahụ mere na January 17, 1994, na Northridge n’ógbè Los Angeles bụ otu ihe atụ na-adịbeghị anya nke ihe mgbawa zoro ezo pụrụ ime. Mgbawa dị omimi nke ukwuu kpatara ala ọma jijiji ahụ, bụ́ nke weere ọnọdụ n’agbata kilomita 8 ruo 19 n’okpuru ala. Tupu ala ọma jijiji ahụ emee, ndị ọkà mmụta sayensị amaghị ma ọlị banyere ịdị adị nke mgbawa ahụ. Mgbawa nke a zoro ezo kpatara oké mbibi nke ihe onwunwe, merụọ ihe karịrị 9,000 mmadụ ahụ, gbuokwa 61 mmadụ.
Ndị ọkà mmụta sayensị na-eche na ọ bụ mgbawa ndị zoro ezo na-akpata ọtụtụ n’ime ala ọma jijiji ndị bụ isi, ọ bụghị nanị na California kamakwa n’Algeria, Argentina, Armenia, Canada, India, Iran, Japan, New Zealand, na Pakistan. N’ime iri afọ ole na ole gara aga, ọtụtụ puku anwụwo ná mba ndị a n’ihi ala ọma jijiji ndị ọ pụrụ ịbụ mgbawa ndị zoro ezo kpalitere.
Ndị ọkà mmụta sayensị na-eche ihe ịma aka nke ịchọpụta ebe mfụkọta ọjọọ ndị a na-ewere ọnọdụ ihu, na-ebukwa amụma banyere iyi egwu ala ọma jijiji nke ha pụrụ iweta. Ka ọ dị ugbu a, ha adịghịzi elelị ikike mbibi nke ugwu na-adịghị oké elu nke yiri ka ọ dịghị ize ndụ nwere.
[Igbe dị na peeji nke 22]
Los Angeles Ọ̀ Na-atalata?
Njikọta sara mbara nke mgbawa na mfụkọta ndị a hụrụ na Los Angeles, California, na-eme ka ógbè a ghara ịkwụsi ike ma ọlị. Obere olulu mmiri Los Angeles yiri ka ọ na-amịkọrọ ihe ka ọtụtụ ná mkpagide nke ọ bụ mgbagọ dị n’ebe na-adịghị anya ná Mgbawa San Andreas na-akpata. (Lee mbipụta nke Teta! [Bekee], July 22, 1994, peji nke 15-18.) Ndị ọkà mmụta mbara ụwa ógbè ahụ na-eme atụmatụ na mfụkọta n’ihi mkpagide nke a pụrụ ịdị na-egbubilata mbara ala nke obere olulu mmiri Los Angeles site n’otu ụzọ n’ụzọ anọ nke otu eka kwa afọ.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 21]
Ụwa: Mountain High Maps™ copyright © 1993 Digital Wisdom, Inc.