Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
Ụtaba Na-enweghị Anwụrụ—Ọ́ Dịghị Emerụ Ahụ?
‘MGBE Cord dị afọ 13 kwagara ebe etiti ọdịda anyanwụ United States, ọ chọpụtara ozugbo na ya enweghị otu ihe ọrụ nwa okoro nọ n’ogo agụmakwụkwọ nke asatọ na-enwekarị: otu kom kom anwụrụ, otu ụdị nke ụtaba na-enweghị anwụrụ ọkụ. Ihe ka ọtụtụ n’ime ndị enyi ya bụ “ndị na-ara ụtaba,” ma ọ bụ ndị na-akpọ anwụrụ, Cord chọkwara ịdị ka ibe ya. Ya mere mgbe otu n’ime ndị ahụ nyere ya otu obere ọbọ anwụrụ, ọ naara ya ma wụnye ụfọdụ anwụrụ ahụ n’agbata agba ya na agbụ̀ ya n’àgwà ajụghị ase nke aka ochie.’—Magazin Listen.
Cord na-eto eto apụghị iche ma ọlị. Dr. Christopher A. Squier, prọfesọ n’ọrịa ọnụ, na-ekwu na ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị ikom dị afọ iri na ụma na-amalite ịra anwụrụ. Ọ bụ ezie na ahịa ụtaba na-enweghị anwụrụ ọkụ adịghịzi arị elu ná ngwụsị afọ ndị 1980, “iji anwụrụ mmiri eme ihe,” ka Dr. Squier na-ekwu, “na-arị elu ọzọ.”a Dị ka ihe atụ, ndị nchọpụta na-akọ na 1 n’ime ụmụ okoro 5 ọ bụla nọ n’ụlọ akwụkwọ dị elu na United States na 1 n’ime ụmụ okoro 3 ọ bụla na Sweden—ọtụtụ nde ndị na-eto eto—ji ụtaba na-enweghị anwụrụ ọkụ eme ihe ugbu a. N’ihi gịnị ka nke a ji eme?
“Ọ dịghị ize ndụ dị ka ise siga.” “E nweghị ihe àmà ọ bụla na ọ dị ize ndụ.” “Ndị enyi m ji ya eme ihe. Ọ dịghị emerụ ha ahụ.” “Obere obere site n’oge ruo n’oge agaghị emerụ m ahụ.” “Ọ dịtụbeghị onye o gburu.” Dị ka Òtù Na-ahụ Maka Ọrịa Cancer n’America si kwuo, ndị a bụ ụfọdụ n’ime ihe ndị na-eto eto na-ekwu mere ha ji echigharịkwuru ụtaba na-enweghị anwụrụ ọkụ.
Gịnị mere ndị na-eto eto jiworo na-eche na ịra ụtaba adịghị ize ndụ dị ka ise siga? Ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dị n’ezie?
Imeghachi Omume n’Ozi Ahụ
Ruo ọtụtụ afọ nnukwu ụlọ ọrụ ụtaba kpokwasịrị ndị ntorobịa mkpọsa ngwá ahịa ndị gosiri na ụtaba na-enweghị anwụrụ ọkụ fọrọ nke nta ka ọ ghara ịdị na-emerụ ahụ dị ka chingọm, bụrụkwa ihe dị oké mkpa dị ka kanvas egwuregwu mara oké mma. Okwu ndị e ji amara ihe, ndị dị ka “Were otu ọbọ ụtaba kama ikuru anwụrụ ọkụ,” “M na-enweta ezi ụtọ nke ụtaba n’amụnyeghị ọbụna siga ọkụ,” na “Otu mpị aka bụ nanị ihe ọ na-ewe” ji akọ egosi na ọ ka ise siga mma.
Mgbe a machibidosịrị okwu ndị dị otú ahụ e ji amara ihe iwu na TV na redio dị na United States, ụlọ ọrụ na-emepụta ụtaba gara n’ihu n’ịgbasa ozi ya site n’iji magazin na-akpọsa ngwá ahịa. Foto mara mma nke ndị gbasiri ike na-enwe obi ụtọ n’ịchụ nta, ịrị elu nnukwu nkume, na iji ihe na-ese n’elu mmiri egwu mmiri—ngwugwu ụtaba afanyekwa n’akpa azụ ha n’ụzọ anya na-ahụ ya—ziri ozi dara ụda ma doo anya: “Ụtaba na-enweghị anwụrụ ọkụ mara mma, n’enweghị ngwagbu, bụrụkwa ụzọ e si aghọ ndị gbasiri ike n’ezie!”
Akụkọ 1994 nke dọkịta ukwu na-awa ahụ na United States nyere, nke isiokwu ya bụ Preventing Tobacco Use Among Young People, na-ekwu na ọtụtụ ndị na-eto eto ugbu a kwenyere na “ụtaba na-enweghị anwụrụ ọkụ adịghị ize ndụ, bụrụkwa ihe a na-anara n’ọha mmadụ.” Otu nnyocha e mere n’etiti ụmụ akwụkwọ nọ n’ụlọ akwụkwọ dị elu gosiri na “ihe dị ka 60 pasent nke ndị ji ụtaba eme ihe na klas dị ala nke ụlọ akwụkwọ dị elu na 40 pasent nke ndị ji ya eme ihe na klas dị elu nke ụlọ akwụkwọ dị elu kwenyere na e nweghị ihe ize ndụ ọ bụla ma ọ bụ na e nwere nanị ihe ize ndụ dị ala n’iji ụtaba na-enweghị anwụrụ ọkụ eme ihe.” Ọbụnakwa ndị ji ụtaba eme ihe n’ụlọ akwụkwọ dị elu ndị ghọtara na ụtaba na-enweghị anwụrụ ọkụ pụrụ ịdị na-emerụ ahụ “adịghị ewere ihe ize ndụ ahụ dị ka nke buru ibu.” Mkpọsa ndị ahụ na-arụzu ebumnobi ha. Ma mkpọsa ndị ahụ hà bụ eziokwu?
Otu Ilu Bible na-asị: “Onye na-enweghị uche na-ekwere okwu nile ọ bụla: ma onye nwere ezi uche na-aghọta ije ụkwụ ya.” Ma ọ bụ dị ka ilu ọzọ si etinye ya, “onye ọ bụla nke nwere ezi uche ji ihe ọmụma arụ ọrụ.” (Ilu 13:16; 14:15, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Mgbe ahụ, gịnị ka eziokwu na-egosi banyere ụtaba na-enweghị anwụrụ ọkụ?
Akụkọ Ọjọọ
Ọ bụ ezie na mkpọsa ngwá ahịa pụrụ igosi na iji ụtaba na-enweghị anwụrụ ọkụ eme ihe ga-emeziwanye otú e si were gị, na ọ dịghị ize ndụ maka ahụ gị, ihe mere eme na-egosi ihe na-emegide nnọọ nke ahụ. Otu ihe bụ na iji ụtaba na-enweghị anwụrụ ọkụ eme ihe agaghị eme ka ị ka mma n’anya. Ọ bụrụ na i kweghị nke ahụ, rapagide ire gị na ntì gị ma lee ya n’enyo. “Ọ̀ mara mma”? Ọ dịghị ma ọlị. Nke ahụ bụkwa nanị ihe ọ na-eme gị n’elu ahụ! Ihe ọ na-eme gị n’ime ahụ ka nnọọ njọ.
Dị ka ihe atụ, ndị na-ata ma ọ bụ na-ara ụtaba pụrụ inwe egbugbere ọnụ gbawara agbawa, ezé gbachuru agbachu, ume na-esi ísì, na agbụ̀ nwere ọnyá—ihe a na-agaghị amụmụrụ ọnụ ọchị. Ná ntụkwasị, ikike ha ịma ụtọ ihe na nke ísìsì na-ebelata, ebe obi ọkụkụ na ọbara mgbalị elu na-arị elu—akụkọ ọjọọ n’ezie. Otú ọ dị, nke bụ akụkọ ọjọọ n’ezie bụ na nnyocha ndị e mere na Europe, India, na United States na-egosi na ụtaba na-enweghị anwụrụ ọkụ na-akpata ọrịa cancer na ntì, agbụ̀, na akpịrị. Nchọpụta ndị a adịghị eju ndị ọkachamara anya. Otu ihe ọmụmụ na-ekwu, sị: “Anwụrụ nwere ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu nke ihe na-akpata ọrịa cancer n’ime ihe ọ bụla a na-eweba n’ime ahụ.” Ka a sịkwa ihe mere na “ndị raworo anwụrụ ruo ogologo oge na-eji 50% enwe ihe ize ndụ ka ukwuu nke inwe ọrịa cancer ọnụ karịa ndị na-adịghị ara ya.”
Mgbe ọrịa cancer ọnụ bịara, ihe ndị na-esi na ya apụta na-adị oké njọ. Ọ bụghị nanị na a na-ebibi ahụ ike nke onye ahụ ji ụtaba eme ihe kama ọtụtụ mgbe a na-egbubilata ndụ ya. Otu akwụkwọ nke Òtù Na-ahụ Maka Ọrịa Cancer n’America dere na-akọ akụkọ ọjọọ nke a: ‘Sean malitere iji ụtaba na-enweghị anwụrụ ọkụ eme ihe mgbe ọ dị afọ 13. O chere na ọ dịchaghị ize ndụ dị ka ise siga. Mgbe afọ ise nke ịra otu mkpọ ma ọ bụ karị kwa ụbọchị gasịrị, o nwere ọnyá n’ire ya. Ọ bụ ọrịa cancer ọnụ. Ndị dọkịta wepụrụ otu akụkụ nke ire ya, ma ọrịa cancer ahụ gbasara gaa n’olu ya. A wara ahụ na-enye nkwarụ ka ukwuu ma ihe akaghị mma—ọ nwụrụ mgbe ọ dị afọ 19. Tupu ọnwụ ya Sean dere otu ozi dị mfe ná mpempe akwụkwọ, sị: “Arala anwụrụ.”’
Ihe Iri Ahụ!
Mgbe Cord ahụ na-eto eto, a kpọtụrụ aha ná mmalite, gụsịrị akụkọ a na-awụ akpata oyi banyere Sean, o mesịrị ghọta ihe ozi ahụ bụ. O kpebiri ịkwụsị. Otú ọ dị, ịgbalị ịkwụsị tara akpụ. “Ọ na-adị m nnọọ ka mụ aghaghị ịra ya,” ka Cord gwara magazin bụ́ Listen. “Ọbụna ugbu a, ọtụtụ ọnwa eri m kwụsịrị, m na-achọpụta na m na-eji aka achọ ọbọ anwụrụ m n’akpa m. Ana m ata ọtụtụ chingọm. Nke ahụ na-enye aka, ma ọ dịghị ewepụ ọchịchọ ahụ.”
Magazin bụ́ Ca-A Cancer Journal for Clinicians na-emesi ya ike, sị: “Ná nnyocha nke ndị dị afọ iri na ụma ndị nwara ịkwụsị iji ụtaba na-enweghị anwụrụ ọkụ eme ihe, nanị pasent dị nta nwere ike ime otú ahụ.” Otú ọ dị, gịnị mere o ji esi ike otú a ịkwụsị iji ụtaba na-enweghị anwụrụ ọkụ eme ihe? Otu ọgwụ ahụ na-eme ka o sie oké ike ịkwụsị ise siga: nicotine.
Nicotine, ọgwụ dị n’ime siga na n’ụtaba ndị na-enweghị anwụrụ ọkụ, bụ nsí na-egbu egbu nke na-egbu onye ji ya eme ihe dị ka mmanya. N’ime 30 minit ọ bụla ma ọ bụ karị, ọ dị onye ji ya eme ihe mkpa ịra ọzọ iji nọgide na-enwe mkpali ahụ. Nicotine na-eme ka ihe rie gị ahụ. Ụfọdụ ndị ji ya eme ihe na-aghọ ndị o riri ahụ nke na ha na-ahapụ otu mpị aka nke anwụrụ n’ọnụ ha ehihie na abalị—ọbụna mgbe ha na-ehi ụra.
N’ụzọ megidere ihe ndị na-eto eto pụrụ iche, ịra ụtaba adịghị ebelata nicotine na-aba n’ime ahụ. Otu kom kom nke ụtaba na-enweghị anwụrụ ọkụ kwa ụbọchị na-enye nicotine ruru nke 60 siga ga-enye! “Ndị ji ụtaba na-enweghị anwụrụ ọkụ eme ihe,” ka akwụkwọ bụ́ Preventing Tobacco Use Among Young People na-ekwu, ‘na-ekuru ma ọ́ dịghị ihe ọzọ ọ̀tụ̀tụ̀ nicotine hà ka nke ndị na-ese siga na-ekuru—ikekwe ihe ruru okpukpu abụọ nke ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ.’ (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) E wezụga nicotine, ụtaba na-enweghị anwụrụ ọkụ nwere okpukpu iri nke nitrosamine (ihe dị ike nke na-akpata ọrịa cancer) karịa siga.
Mara Ihe
“E nwetụghị obi abụọ ọ bụla na ihe ndị a na-emerụ ahụ,” ka Dr. Roy Sessions, onye ọwa ahụ n’isi na n’olu, kwuru. “Ha na-akpata ọnọdụ nke ihe iri ahụ, nke ọtụtụ ndị na-eche na o siri ike ịkwụsị karịa ise siga.” Ọkachamara n’ọrịa cancer ezé bụ́ Dr. Oscar Guerra kwubiri, sị: “Anwụrụ adịghị mma n’ahụ ma ọlị.” Ndị ọkachamara gburugburu ụwa kwenyere: Ịra ụtaba karịrị obere nsogbu. Ọ pụrụ igbu gị!
Ndị na-eto eto bụ́ ndị Kraịst nwere ọbụna ihe dị ike karị nchegbu ahụ ike nke mere ha ga-eji zere ihe ndị e ji ụtaba mee—ọchịchọ ha ime ihe na-atọ Jehova Chineke ụtọ. Okwu ya na-enye iwu, sị: “Ka anyị sachapụ n’onwe anyị mmerụ nile nke ahụ na nke mmụọ, na-emezu ịdị nsọ n’egwu Chineke.”—2 Ndị Kọrint 7:1.
Magazin bụ́ Aviation, Space, and Environment Medicine na-achịkọta okwu ọnụ n’ụzọ mara mma, na-asị: “Ụtaba bụ ihe ọkụkụ na-akpata ịgbọ agbọ nke nanị ihe e kere eke abụọ na-eri—otu obere idide na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ na mmadụ. Obere idide ahụ na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ amaghị nke a na-akọ.”
Ma ị maara. Ya mere mara ihe—amalitela.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A na-ejikarị ụdị abụọ nke ụtaba na-enweghị anwụrụ ọkụ eme ihe: anwụrụ a na-akpọ n’imi na ụtaba a na-ata ata. E nwere anwụrụ mmiri na-adịghị na nke mmiri. N’etiti ndị na-eto eto, anwụrụ mmiri—ụtaba a gwakọtara nke ọma ma tinye ya ihe ụtọ, ihe na-esi ísì ụtọ, n’ime kom kom ma ọ bụ n’ime ọbọ ndị dị ka ngwugwu tii—bụ ụdị a kasị mara nke ụtaba na-enweghị anwụrụ ọkụ. “Ịra ụtaba” na-ezo aka n’ịwụnye—ọ̀tụ̀tụ̀ ụtaba e ji isi mkpịsị aka na mkpịsị aka mbụ pịta—n’agbata egbugbere ọnụ ma ọ bụ ntì na agbụ̀.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 24]
‘Tupu ọnwụ ya Sean dere otu ozi dị mfe, sị: “Arala anwụrụ”’
[Foto ndị dị na peeji nke 23]
Ụtaba a na-ata ata amalitewo ịbụ ihe a ma ama karị n’etiti ndị ntorobịa. Ì kwesịrị ịnwale ya?