Ndị Ne-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
Gịnị Mere M Na-apụghị Ịmụta Ihe?
“Achọghị m ịlọta ụlọ,” ka Jessica na-echeta, “ma chee nne na nna m ihu. Adawokwa m ọtụtụ ihe ọmụmụ ọzọ.”a N’afọ 15, Jessica nwere ọgụgụ isi ma maa mma. Ma dị ka ọtụtụ ndị ntorobịa, o nwere oké nsogbu inweta akara dị mma.
EMEGHỊ nke ọma n’ụlọ akwụkwọ bụ ọtụtụ mgbe ihe na-esi n’inwe àgwà na-ezighị ezi n’ebe agụmakwụkwọ dị ma ọ bụ n’ebe onye nkụzi mmadụ nọ pụta. Ma ọ dịghị otú ahụ n’ebe Jessica nọ. Ọ bụ nanị na ọ na-esiri ya ike gabiga ókè ịghọta echiche ndị siri ike. Dị ka o si adị, nke a mere ka o siere Jessica ike inwe ihe ịga nke ọma ná mgbakọ na mwepụ. Ihe isi ike o nwekwara n’ịgụ ihe mere ka o siere ya ike ime nke ọma n’ihe ọmụmụ ndị ọzọ.
N’aka nke ọzọ, Maria apụghị ịsụpe okwu nke ọma. Ọ na-ezo mgbe nile ihe ndị ọ na-edetu ná nzukọ ndị Kraịst n’ihi na ihere ndejọ ya n’ịsụpe okwu na-eme ya. Otú ọ dị, ma Jessica ma Maria adịghị nke na-enweghị ọgụgụ isi. Ihe na-adabara Jessica na ndị mmadụ nke na ọ na-eje ozi dị ka onye ogbugbo, ma ọ bụ onye odozi nsogbu, nke ụlọ akwụkwọ họpụtara, mgbe nsogbu bilitere n’etiti ụmụ akwụkwọ ibe ya. N’agụmakwụkwọ kwa, Maria so n’ime pasent 10 ndị na-emekarị nke ọma na klas ya.
Nsogbu ahụ: Jessica na Maria nwere nsogbu ịmụta ihe. Ndị ọkachamara kwenyere na ihe dị ka pasent 3 ruo 10 nke ụmụaka nile pụrụ inwe ụdị ihe isi ike ịmụta ihe dị otú ahụ. Tania, onye nọ ugbu a n’afọ ndị mbụ nke 20 ya, nwere nsogbu a na-akpọ Ọrịa Oké Aghara na Enweghị Ike Ịtụkwasị Uche n’Ihe (ADHD).b Ọ na-asị: “Ọ na-esiri m ike ịga nzukọ ndị Kraịst, inwe ọmụmụ ihe onwe onye, na ikpe ekpere n’ihi na apụghị m ịṅa ntị ma ọ bụ ọbụna ịnọrọ jii. Ọ na-emetụta ozi m n’ihi na m na-esi n’otu isiokwu amabanye n’ọzọ n’ụzọ dị oké ngwa nke na onye ọ bụla apụghị ịgbaso m.”
Mgbe ọ na-agụnyeghị oké aghara, a na-akpọ nsogbu ahụ Ọrịa Enweghị Ike Ịtụkwasị Uche n’Ihe (ADD). A na-akọwakarị ndị nwere nsogbu a dị ka ndị ọmụ anya arọ nrọ. Banyere ndị nwere ADD, ọkà n’ọrịa akwara ahụ bụ́ Dr. Bruce Roseman sịrị: “Ha na-anọdụ ala n’ihu akwụkwọ ruo 45 minit, n’emeghị ihe ọ bụla.” N’ihi otu ihe ma ọ bụ ihe ọzọ ọ na-esiri ha ike ịtụkwasị uche n’ihe.
Ndị na-eme nnyocha ọgwụ kwenyere na ha amalitewo n’oge na-adịbeghị anya ịghọta ihe na-akpata nsogbu ndị a. Ma, a ka matabeghị ihe dị ukwuu. Ókè ndị dịkwa n’agbata nsogbu dịgasị iche iche na adịghị ike ndị na-egbochi ịmụta ihe adịghị edo anya mgbe nile. N’agbanyeghị ihe na-akpata ya kpọmkwem ma ọ bụ aha a kpọrọ otu ụdị nsogbu—ma ọ̀ bụ nsogbu ịgụ ihe, icheta ihe, ịtụkwasị uche n’ihe, ma ọ bụ ịkpa oké aghara—nsogbu ahụ pụrụ imetụta agụmakwụkwọ mmadụ, ọ pụkwara ịkpata ntaramahụhụ dị ukwuu. Ọ bụrụ na i nwere adịghị ike n’ịmụta ihe, olee otú ị pụrụ isi nagide ya?
Ihe Ịma Aka nke Ịnagide
Tụlee Jessica, onye a kpọtụrụ aha n’okwu mmalite. Ná mkpebi ya siri ike imeri nsogbu ịgụ ihe ya, ọ nọgidere na-agbalị ịgụ akwụkwọ dị iche iche. Oge oké mgbanwe bịara mgbe ọ hụrụ otu akwụkwọ abụ uri nke masịrị ya nke ukwuu. Ọ zụrụ akwụkwọ yiri nke ahụ, bụkwa nke tọrọ ya ụtọ ọgụgụ. E mesịa ọ bịara nwee mmasị n’otu usoro akwụkwọ akụkọ, ịgụ ihe jikwa nwayọọ nwayọọ ghara ịbụcha nsogbu. Ihe mmụta a ga-amụta bụ na nnọgidesi ike na-eweta uru. Gị onwe gị pụkwara imeri adịghị ike nke ịmụta ihe ma ọ bụ ma ọ́ dịghị ihe ọzọ ị pụrụ inwe ọganihu dị ukwuu n’ụzọ ahụ site n’adaghị mbà.—Tụlee Ndị Galetia 6:9.
Gịnị banyere ime ihe banyere nsogbu enweghị ike icheta ihe? Otu mkpịsị ugodi dị mkpa iji gwọta nsogbu ahụ dị n’okwu ilu ahụ bụ: “Nkwughasị bụ isi iyi nke ncheta.” Nicky chọpụtara na ịgwaghachi onwe ya ihe ọ nụrụ na ihe ọ gụrụ nyeere ya aka icheta ihe. Nwalee ya. Ọ pụkwara inyere gị aka. N’ụzọ dị mkpa, n’oge Bible mmadụ na-adị na-agụpụta okwu, ọbụna mgbe ha na-agụrụ onwe ha ihe. N’ihi ya, Jehova nyere onye ahụ so dee Bible bụ́ Joshua iwu, sị: “Ị ghaghị ịgụpụta n’ime [Iwu Chineke] ehihie na abalị.” (Joshua 1:8, NW; Abụ Ọma 1:2) Gịnị mere ịgụpụta okwu ndị ahụ ji dị mkpa otú a? N’ihi na ime otú ahụ jikọtara usoro mmetụta abụọ—nke ịnụ ihe na nke ọhụhụ ụzọ—nyekwa aka ịhapụ mmetụta mikwuru emi n’uche onye ahụ na-agụ ihe.
Nye Jessica, ịmụta mgbakọ na mwepụ bụkwa ọrụ buru oké ibu. Otú ọ dị, ọ gbalịrị ịmụta ụkpụrụ nduzi mgbakọ na mwepụ site n’ikwughachi ha—mgbe ụfọdụ na-etinye ihe ruru ọkara otu hour maka otu ụkpụrụ nduzi. Mgbalị ya mesịrị weta uru. Ya mere kwughachi, kwughachi, kwughachi! Otu ụzọ ime ihe amamihe dị na ya bụ idebe akwụkwọ na pensịl n’ebe aka ga-eru ha mgbe ị na-ege ntị na klas ka i wee nwee ike idetu ihe.
Ọ dị mkpa ka i mikpuo onwe gị n’ịmụta ihe. Mee ka ọ mara gị ahụ ịnọ ya mgbe a gbasasịrị akwụkwọ na ịgwa ndị nkụzi gị okwu. Gbalịa ịmata ha. Gwa ha na i nwere nsogbu ịmụta ihe, ma na i kpebisiwo ike imeri ya. Ihe ka ọtụtụ ná ndị nkụzi ga-enwe mmasị inye aka. Ya mere rịọ enyemaka ha. Jessica mere nke ahụ ma nweta nkwado dị ukwuu dị ya mkpa site n’aka onye nkụzi nwere obi ọmịiko.
Mụta Ịtụkwasị Uche n’Ihe
Ọ na-enyekwa aka isetịpụ otu ihe mgbaru ọsọ na usoro nkwụghachi ụgwọ maka gị onwe gị. Isetịpụ otu ihe mgbaru ọsọ kpọmkwem—dị ka imecha otu nkebi nke ihe omume ụlọ akwụkwọ e kenyere ime n’ụlọ—tupu ị gbanye telivishọn ma ọ bụ kpọnye egwú na-amasị gị pụrụ ịkwali gị ịtụkwasị uche n’ihe. Jiri n’aka na ezi uche dị n’ihe mgbaru ọsọ ndị i setịpụrụ.—Tụlee Ndị Filipaị 4:5.
Mgbe ụfọdụ ime mgbanwe na-akwalite imeziwanye ihe n’ọnọdụ gị pụrụ inye aka. Nicky dokwara ịnọdụ n’ebe ihu na klas na nso onye nkụzi ka o wee nwee ike ịtụkwasị uche n’ihe karị. Jessica chọpụtara na ọ bara uru isoro enyi ya na-amụsi ihe ike mekọọ ihe omume ụlọ akwụkwọ e kenyere ya ime n’ụlọ. Ị pụrụ ịhụ na ọ na-enye aka nanị ime ka ọnụ ụlọ gị nwee ntụsara ahụ.
Ibelata Oké Mgbagharị
Ọ bụrụ na o yiri ka ị dị oké aghara, ịmụta ihe pụrụ ịbụ ahụmahụ na-egbu mgbu. Otú ọ dị, ụfọdụ ndị ọkachamara na-ekwu na a pụrụ iduzi oké aghara gaa ná mmega ahụ. “Ihe àmà ya dị ọtụtụ,” ka magazin bụ́ U.S.News & World Report na-ekwu, “na ikike onye ọ bụla nwere ịmata ihe ọmụma ọhụrụ nke ọma na icheta ndị ochie na-akawanye mma site ná mgbanwe ihe ndị dị ndụ n’ụbụrụ, ndị ọ bụ nkwekọ nke aerobic na-akpata.” N’ihi ya, ọ̀tụ̀tụ̀ kwesịrị ekwesị nke mmega ahụ—igwu mmiri, ịgba ọsọ, ịgba bọl, ịgba ịnyịnya ígwè, ịgba n’elu ice, na ihe ndị ọzọ—pụrụ ịdị mma ma n’ahụ ma n’uche.—1 Timoti 4:8.
A na-enye ọgwụ site n’oge ruo n’oge maka nsogbu ịmụta ihe. A na-azọrọ na ihe dị ka 70 pasent nke ndị na-eto eto nwere nsogbu ADHD, ndị e nyeworo ọgwụ na-enye mkpali, amalitewo ịgbake. Ma ị̀ ga-anakwere ọgwụgwọ e ji ọgwụ eme ma ọ bụ na ị gaghị anakwere bụ okwu dịịrị gị na ndị mụrụ gị ikpebi mgbe unu tụlesịworo ókè nsogbu ahụ siruru n’ike, mmetụta ọjọọ ndị ọ pụrụ iweta, na ihe ndị ọzọ.
Jigide Ùgwù Onwe Onye Gị
Ọ bụ ezie na a dịghị ele ihe isi ike n’ịmụta ihe anya dị ka nsogbu mmetụta uche, ọ pụrụ inwe ihe ndị ọ ga-akpata n’ụzọ mmetụta uche. Njikọta nke ịba mba na nkatọ n’esepụghị aka site n’aka nne na nna na ndị nkụzi, rizọlt na-adịghị mma n’ụlọ akwụkwọ, na enweghị ndị enyi chiri anya pụrụ ịrụpụta ùgwù onwe onye dị ala n’ụzọ dị mfe. Ụfọdụ ndị ntorobịa na-ezo mmetụta nke a n’azụ àgwà iwe na nke na-eyi egwu.
Ma i kwesịghị ịtụfu ùgwù onwe onye n’ihi nsogbu ịmụta ihe.c “Nzube m,” ka otu onye ọkachamara so ndị ntorobịa nwere nsogbu ịmụta ihe na-arụkọ ọrụ na-ekwu, “bụ ịgbanwe àgwà ha n’ebe ndụ dị—site na ‘adị m nzuzu, na apụghị m ime ihe ọ bụla n’ụzọ ziri ezi’ . . . gaa na ‘ana m emeri otu nsogbu, na apụrụ m ime ihe ka ukwuu karịa ka m chere na m pụrụ ime mgbe ọ bụla.’”
Ọ bụ ezie na ị pụghị ime ihe dị ukwuu banyere àgwà ndị ọzọ, ị pụrụ ịgbanwe nke gị. Jessica mere nke ahụ. Ọ na-asị: “Mgbe m tụrụ onwe m n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ na-adabere n’ihe ụmụaka nọ n’ụlọ akwụkwọ kwuru na okwu ịkpọ iyi ha, achọrọ m ịgbapụ n’ụlọ akwụkwọ. Ma ugbu a ana m agbalị ilefuru ihe ha na-ekwu anya ma nọgide na-eme ike m nile. O siri ike, aghaghịkwa m ịnọgide na-echetara onwe m, ma ọ dị irè.”
Jessica aghaghị ịlụso ihe ọzọ bụ ezie ọgụ. Nwanne ya nwoke nke tọrọ ya bụ nwa akwụkwọ na-enwe akara A mgbe nile. “Nke ahụ na-emebibu ùgwù onwe onye m,” ka Jessica na-ekwu, “ruo mgbe m kwụsịrị iji onwe m atụnyere ya.” Ya mere ejila onwe gị atụnyere ụmụnne gị.—Tụlee Ndị Galetia 6:4.
Ịgwa enyi a tụkwasịrị obi okwu pụkwara inyere gị aka ile ihe anya site n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Ezi enyi ga-eji ịnọgidesi ike n’ihe rapara n’akụkụ gị ka ị na-agbalị imeziwanye ihe. (Ilu 17:17) Ajọ enyi, n’aka nke ọzọ, ga-ebibi gị ma ọ bụ mee ka i nwee echiche dị elu na-ekwesịghị ekwesị banyere onwe gị. Ya mere jiri nlezianya họrọ ndị enyi gị.
Ọ bụrụ na i nwere nsogbu ịmụta ihe, eleghị anya a na-enye gị mgbazi karịa ndị ntorobịa ndị ọzọ. Ma ekwela ka nke ahụ nye gị echiche na-ezighị ezi banyere onwe gị. Lee ịdọ aka ná ntị anya n’ụzọ nke Chineke, dị ka ihe bara oké uru. Cheta, ịdọ aka ná ntị nne na nna gị na-enye bụ ihe àmà na ha hụrụ gị n’anya, na-achọkwa ihe kasị mma maka gị.—Ilu 1:8, 9; 3:11, 12; Ndị Hibru 12:5-9.
Ee e, ọ bụghị iwu na nsogbu i nwere ịmụta ihe ga-akụda gị aka. Ị pụrụ ime ihe banyere ha ma dịrị ndụ na-arụpụta ihe. Ma e nwere ọbụna ihe ka ukwuu mere a ga-eji nwee olileanya. Chineke ekwewo nkwa iweta ụwa ọhụrụ nke ezi omume, ebe ihe ọmụma ga-aba ụba na ebe a ga-edozi nsogbu ọ bụla nke uche na anụ ahụ. (Aịsaịa 11:9; Mkpughe 21:1-4) Ya mere kpebisie ike ịmụtakwu ihe banyere Jehova Chineke na nzube ya nile, meekwa ihe kwekọrọ n’ihe ọmụma ahụ.—Jọn 17:3.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A gbanwewo aha ụfọdụ.
b Biko lee usoro isiokwu bụ́ “Ịghọta Ụmụaka Na-enye Nsogbu” ná mbipụta Teta! nke November 22, 1994 (Bekee), na isiokwu bụ́ “Nwa Gị Ọ̀ Na-enwe Nsogbu n’Ịmụta Ihe?” ná mbipụta nke October 8, 1984.
c Lee isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . Olee Otú M Pụrụ Isi Wulite Ùgwù Onwe Onye M?” ná mbipụta Teta! (Bekee) nke April 8, 1983.
[Foto dị na peeji nke 25]
Mikpuo onwe gị n’ịmụta ihe