Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 7/8 p. 26-29
  • Nleta Popu Letara UN—Gịnị Ka Ọ Rụzuru?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nleta Popu Letara UN—Gịnị Ka Ọ Rụzuru?
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Kpatara Nleta Ahụ?
  • Ezi Udo—Site n’Ole Ebe?
  • Nleta ahụ—Olee Ókè Mmetụta Ya Ruru?
  • Chọọchị Ọ̀ Nọ ‘n’Ọnọdụ Dị Oké Njọ’?
  • A Kọwawo Otu Ihe Omimi Dị Egwu
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Udo Adịrịghị Ndị Ozi Ụgha!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Mgbalị A Na-eme Ịchụpụ Vatican n’Òtù UN
    Teta!—2000
  • Mgbanwe ná Ndị Na-anwụ n’Agha
    Teta!—2000
Teta!—1996
g96 7/8 p. 26-29

Nleta Popu Letara UN—Gịnị Ka Ọ Rụzuru?

MGBE ọ na-efefe n’Atlantic ịga gwa òtù UN okwu na New York City, Popu John Paul nke Abụọ gafere akara 1,000,000 kilomita njem ndị o meworo n’ụwa. Ọ bụ October 4, 1995, nke a bụkwa njem ofesi ya nke 68 dị ka popu. N’enweghị obi abụọ, ọ bụ popu meworo njem n’ụzọ kasị saa mbara n’akụkọ ihe mere eme nke Chọọchị Roman Katọlik.

O rutere n’Ọdụ Ụgbọ Elu Mba Nile nke Newark, New Jersey, n’otu Wednesday mmiri na-ezo, e ji usoro nchebe kasị saa mbara e guzobetụworo maka onye ọ bụla a na-enye oké nsọpụrụ gbaa ya gburugburu. E mere atụmatụ na e kenyere ihe dị ka 8,000 ndị ọrụ etiti na nke ógbè ọrụ ichebe popu ahụ. Otu akụkọ kpọrọ ya “nchebe nke ihe mkpuchi sara mbara,” nke gụnyere ọtụtụ helikọpta na ndị ọkà n’igwu mmiri.

Gịnị Kpatara Nleta Ahụ?

N’okwu ya n’ọdụ ụgbọ elu ahụ, popu chetara na onye ọ nọchiri n’ọkwá, bụ́ Popu Paul nke Isii, agwabuwo Nzukọ Ezumezu nke Òtù UN okwu na-akpọ òkù maka udo, sị: “Agha agaghị adịkwa, agha agaghị adịkwa ọzọ!” John Paul nke Abụọ sịrị na ya bịaghachiri “iji kwupụta nkweta [ya] miri emi na ebumnobi na nzube ndị mere ka a malite UN n’ọkara otu narị afọ gara aga dị oké mkpa ugbu a karịa ka ọ dịtụworo n’ime ụwa nke na-achọ nzube.”

N’ekpere uhuruchi ndị e nwere na Sacred Heart Cathedral, Newark, popu gosiri nkwado ya ọzọ maka UN, na-asị: “E nwere òtù ahụ iji jee ozi maka ọdịmma e nwekọrọ ọnụ nke ezinụlọ ụmụ mmadụ, n’ihi ya kwa o kwesịrị ekwesị ka popu kwuo okwu n’ebe ahụ dị ka onye na-agbara olileanya nke Oziọma ahụ àmà.” O kwukwasịrị: “Ekpere anyị maka udo bụkwa n’ezie ekpere maka Òtù Mba Ndị Dị n’Otu. Senti Francis nke Assisi . . . na-egbukepụ egbukepụ dị ka ezigbo onye hụrụ udo n’anya na onye ọkà nke udo. Ka anyị rịọ amara ya n’isi ọrụ Mba Ndị Dị n’Otu na-arụ maka ezi ikpe na udo n’ụwa nile.”

N’okwu ọ gwara UN, o toro mgbanwe ọchịchị nke 1989, ndị e ji emeghị ihe ike nwee n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe, ebe e meworo ka ọtụtụ mba nweghachi nnwere onwe. Ọ gbara ume “ezi ịhụ mba n’anya” dị ka ihe dị iche n’ebe “ịhụ mba n’anya mbunobi na nke na-akpa ókè” dị. O kwuru okwu banyere ikpe na-ezighị ezi nke usoro ihe dị ugbu a, na-asị: “Mgbe ọtụtụ nde mmadụ na-ata ahụhụ n’ịda ogbenye nke pụtara agụụ, erighị ihe na-edozi ahụ, ọrịa, amaghị akwụkwọ, na nretọ, anyị aghaghị . . . ichetara onwe anyị na ọ dịghị onye o ruuru irigbu onye ọzọ maka uru nke aka ya.”

Mgbe ahụ o kwuru, sị: “Ka anyị na-eche oké ihe ịma aka ndị a ihu, olee otú anyị pụrụ isi ghara ịghọta ọrụ Òtù Mba Ndị Dị n’Otu?” Ọ sịrị na ọ dị UN mkpa “ịbụ isi nke ụkpụrụ omume ebe mba nile nke ụwa nọ ná ntụsara ahụ.” O mesiri ike mkpa ọ dị ịkwalite “ịdị n’otu nke ezinụlọ ụmụ mmadụ dum.”

Ezi Udo—Site n’Ole Ebe?

N’enweghị obi abụọ, o kwupụtara ọtụtụ echiche ndị magburu onwe ha. Ma, n’okwu ya dị ogologo, ọ̀ dị mgbe o duziri ndị ndú ụwa ahụ gaa n’ihe ngwọta Chineke maka nsogbu ihe a kpọrọ mmadụ—ịchịisi Alaeze ya site na Kraịst Jisọs? (Matiu 6:10) Ee e. N’eziokwu, ọ dịghị mgbe o hotara Bible n’okwu ọ gwara UN. Kama nke ahụ, ọ sịrị na “site n’enyemaka nke ebere Chineke, anyị pụrụ iwulite n’ime narị afọ ọzọ na n’ime puku afọ ọzọ mmepeanya kwesịrị ihe a kpọrọ mmadụ, ezi ọdịbendị nke nnwere onwe.” Nye ndị mmụta Bible, echiche ahụ pụrụ iyi ikwughachi okwu yiri nke ndị ahụ kwuru na Bebel oge ochie n’ihe karịrị 4,000 afọ gara aga, bụ́ ndị chere na ha pụrụ ijikọta ihe a kpọrọ mmadụ site ná mgbalị mmadụ, sị: “Ngwa, ka anyị wuoro onwe anyị obodo, na ụlọ elu, nke elu ya ga-eru n’eluigwe, ka anyị mekwaara onwe anyị aha.” (Jenesis 11:4) Ya mere, site n’ụzọ ile ihe anya nke a, ọ bụ ndị ndú ọchịchị nke ihe a kpọrọ mmadụ, ndị a na-anọchite anya ha na UN, bụ́ ndị na-aga iwu mmepeanya ọhụrụ na-adabere ná nnwere onwe.

Ma gịnị ka Bible na-ebu n’amụma banyere ọdịnihu nke gọọmenti ndọrọ ndọrọ ọchịchị mmadụ na UN n’onwe ya? Akwụkwọ Daniel na Mkpughe na-enye echiche doro anya banyere ọdịnihu nke na-echere ha. Daniel buru amụma na na mgbe ikpeazụ, Chineke ga-eguzobe ịchịisi Alaeze ya, dị ka oké nkume “nke a na-ejighị aka waa.” Ihe dị aṅaa ka ọ ga-eme? “N’ụbọchị ha, bụ́ eze ndị a, ka Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie, nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi. . . . Ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.” A ga-eji otu ịchịisi ezi omume maka ihe nile a kpọrọ mmadụ dochie anya gọọmenti ụmụ mmadụ.—Daniel 2:44, 45.

Gịnị gaje ime UN? Mkpughe isi 17 na-ese onyinyo UN (na òtù ahụ na-anọghị ruo ogologo oge ọ nọchiri anya ya, bụ́ Njikọ Mba Nile) dị ka anụ ọhịa na-acha uhie uhie nke ‘ga-ala n’iyi.’ (Mkpughe 17:8)a Isi iyi Jehova maka ezi udo abụghị njikọ ọ bụla nke ụmụ mmadụ na-ezughị okè, n’agbanyeghị otú ụmụazụ ya pụrụ inweru ezi nzube obi. Ezi udo ga-abịa site n’Alaeze Chineke e kwere ná nkwa, nke dị n’aka Kraịst Jisọs nọ n’eluigwe, onye e mere ka o si n’ọnwụ bilite. Nke ahụ bụ ndabere maka mmezu nke nkwa Chineke dị ná Mkpughe 21:3, 4: “Lee, ụlọikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, Ọ ga-ebinyekwara ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke Ya, Chineke Onwe ya ga-anọnyekwara ha, bụrụkwa Chineke ha: Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.”

Nleta ahụ—Olee Ókè Mmetụta Ya Ruru?

Mgbe popu zoro aka na Bible n’okwu ndị o kwuru, à gbara ndị Katọlik kwesịrị ntụkwasị obi ume iwepụta Bible ha ma tụlee izo aka ndị ahụ? Nke bụ eziokwu bụ na ndị ka nnọọ ọtụtụ n’ọnụ ọgụgụ ejighịdị Bible. O siri ike tupu popu ehota otu akụkụ akwụkwọ nsọ kpọmkwem iji mee ka ọ dịrị ndị na-ege ntị mfe ịgụ Bible.

Otu ihe atụ bụ mgbe ọ gwara 83,000 mmadụ okwu n’Àmà Egwuregwu Giant, dị na New Jersey, wee sị: “Anyị na-echere nlọghachi nke Onyenwe anyị dị ka onyeikpe nke ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ. Anyị na-echere nlọghachi ya n’ebube, ọbịbịa nke alaeze Chineke n’ozuzu ya. Nke ahụ bụ òkù nke abụ ọma nọgidere na-akpọ: ‘Jiri obi ike chere Onyenwe anyị; nwee obi ike, cherekwa Onyenwe anyị.’” Ma olee akụkụ akwụkwọ nsọ ọ na-ehota site n’abụ ọma? Oleekwa Onyenwe anyị nke ọ na-ezo aka n’ebe ọ nọ—Jisọs ka ọ̀ bụ Chineke? (Tụlee Abụ Ọma 110:1.) Dị ka akwụkwọ akụkọ nke Vatican, bụ́ L’Osservatore Romano, si kọọ, ọ na-ehota Abụ Ọma 27:14, bụ́ nke na-agụ n’ụzọ ka mma, sị: “Tinye olileanya gị n’ebe Yahweh nọ, dị ike, ka obi gị dị ike, tinye olileanya gị n’ebe Yahweh nọ.” (The Jerusalem Bible) Ee, anyị kwesịrị itinye olileanya anyị n’ebe Yahweh, ma ọ bụ Jehova, Chineke nke Onyenwe anyị Jisọs nọ.—Jọn 20:17.

N’akụkọ ihe mere eme nile, ndị ụkọchukwu na ndị ndú Katọlik hà akwalitewo udo n’etiti mba dị iche iche? Nkụzi Katọlik ò jewo ozi idozi nsogbu agbụrụ, na nke ebo dị iche iche? Mgbukpọsị ndị weere ọnọdụ na Rwanda, etiti ọwụwa anyanwụ Africa, na 1994, ha na agha ogbugbu ndị a lụrụ n’afọ ole na ole gara aga n’ebe bụbu Yugoslavia, ha nile na-egosi na nkweta okpukpe na-ada n’ozuzu ya iwepụ ịkpọasị na mbunobi ndị dị n’obi mmadụ. Ma nkwupụta elu ọnụ ahụ a na-eme kwa izu ma ịgachi Mas anya adịghị nke ga-agbanwe ụzọ ndị mmadụ si eche echiche ma na-eme ihe. A ghaghị inwe mmetụta miri emi karị, nke na-ewere ọnọdụ nanị mgbe a hapụrụ Okwu Chineke ka ọ bamie n’obi na n’uche ndị kwere ekwe.

Mgbanwe àgwà nke ezi onye Kraịst na-adabere, ọ bụghị ná mmeghachi omume nke ihe omume okpukpe na-akpali, kama n’ezi nghọta nke ihe bụ uche Chineke maka onye ọ bụla. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Unu ejila akparamàgwà nke ụwa dị unu gburugburu kpụọ onwe unu, kama meenụ ka akparamàgwà unu gbanwee, bụrụ nke e ji uche ọhụrụ unu kpụọ. Nke a bụ nanị ụzọ isi chọpụta uche Chineke ma mara ihe dị mma, ihe Chineke na-achọ, ihe zuru okè ime.” (Ndị Rom 12:1, 2, JB) A na-enwe akparamàgwà ọhụrụ a site n’ịmụ Okwu Chineke nke na-eduga n’ezi ihe ọmụma nke uche ya. Ọ na-arụpụta ike ime mmụọ nke na-akwali uche ma na-arụpụta àgwà ndị Kraịst.—Ndị Efesọs 4:23; Ndị Kọlọsị 1:9, 10.

Chọọchị Ọ̀ Nọ ‘n’Ọnọdụ Dị Oké Njọ’?

Akwụkwọ akụkọ ndị Spain bụ́ El País kọwara Popu John Paul nke Abụọ dị ka onye nwere “ikike ndọrọ pụrụ iche” maka nwoke nke dị 75 afọ, otu akwụkwọ akụkọ United States kpọkwara ya “ọkachamara nke usoro mgbasa ozi.” O nwere nkà n’ịgwa ndị nta akụkọ okwu n’ihe metụtara ọha mmadụ na ụmụ ha. Na njem ya dị iche iche ọ nọchitere anya Ocheeze Popu nke dị na Vatican City n’ụzọ dị mma. Ọ bụ ezie na UN matara Vatican n’ihe metụtara ọchịchị, ngọzi popu n’isi òtù ahụ agajeghị ime ka ngọzi Jehova Chineke dịkwasị ya.

Mmeghachi omume e nwere ná nleta popu dịgasị iche iche. Ọtụtụ n’ime ndị Katọlik nwetara tiket iji gaa Mas ahụ e mere n’ámá nwere mmetụta nke mwuli elu n’ụzọ mmetụta uche site n’ahụmahụ ahụ. Otú ọ dị, ndị ndú ụfọdụ nke Katọlik lere nleta ahụ na ihe ndị ọ pụrụ ịrụpụta anya n’ụzọ ka njọ. Akwụkwọ akụkọ The New York Times hotara Timothy B. Ragan, onye isi nke Ụlọ Ọrụ Zuru Mba nke Katọlik Maka Idu Ndú Ụkọchukwu, dị ka onye na-ekwu na “nleta Popu abụrụwo ohere furu ọhịa. Ọ bụ ezie na njem ahụ ‘bụ ihe wuliri elu ma bụrụ ihe dị oké mkpa nye ọtụtụ ndị n’ihe banyere oriri nsọ,’” nye ọtụtụ ndị ndú Katọlik o wepụtaghị “oge ọ bụla iji gee ntị, o meghịkwa ndokwa maka mkparịta ụka.” Ọtụtụ ndị Katọlik chere na n’isiokwu ndị dị ka alụghị di ma ọ bụ nwunye, nchịkwa ọmụmụ, na ịgba alụkwaghịm, a manyere ha ịṅa ntị n’okwu otu onye kwuru.

Ụfọdụ ndị ndú Katọlik kwenyere na “chọọchị nọ n’ọnọdụ dị oké njọ,” ha na-atụkwa egwu na ọtụtụ ndị Katọlik, “karịsịa ndị na-eto eto, na-atụfu nghọta doro anya nke ihe ịbụ onye Katọlik pụtara.” James Hitchcock, bụ́ onye ọkà n’ọdịnala Katọlik, “na-ahụ nsogbu ahụ dị ka agha nzuzo nke na-ebibi ihe n’etiti ndị ndú na-echekwawanye ike ha na ‘ndị nọ n’ọkwá dị n’etiti’ bụ́ ndị na-anakwere echiche ndị ọzọ.”

N’ihe banyere otú nleta popu ga-esi metụta ọgba aghara ndị nọ n’ọkwá dị iche iche na chọọchị, Hitchcock sịrị: “Ọ bịa ebe a, a na-egosi mmasị gabigara ókè n’ebe ọ nọ, ọ laa—ọ dịghịkwa ihe na-emenụ. Ihe ndị ọ na-arụpụta na-akụda aka n’ụzọ m si ele ihe anya.” N’ezie popu tụfuru ohere iji gwa ndị ndú ndọrọ ndọrọ ọchịchị nọ na UN ebe a ga-achọta isi iyi nke ezi udo.

Ọ bụ ezie na Akwụkwọ Nkwekọrịta UN na nchepụta ụmụ mmadụ na-ekwusi okwu ike n’ihe mgbaru ọsọ nke “udo na ịnọ ná ntụkwasị obi,” abụla onye e duhiere. Bible na-adọ aka ná ntị, sị: “Mgbe ha na-asị, Udo na ntụkwasị obi dị, mgbe ahụ na mberede ka mbibi na-abịakwasị ha, dị ka ime na-eme nwanyị nke dị ime, ha agaghị agbanarịkwa ya ma ọlị.” (1 Ndị Tesalọnaịka 5:3) Ezi udo na ịnọ ná ntụkwasị obi ga-abịa nanị site n’uche Chineke na n’ụzọ ya—site n’ịchịisi Alaeze ya, ọ bụghị site na UN.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Maka ihe ọmụma ka zuo ezu n’amụma a dị ná Mkpughe, lee akwụkwọ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!, peji nke 240-251, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara na 1994.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 26]

UN photos

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya