Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 9/8 p. 17
  • Ihe Ọdachi Na-akpata

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Ọdachi Na-akpata
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọnụ Ọgụgụ Na-arị Elu nke Ndị Gbara Ọsọ Ndụ
    Teta!—1996
  • Na-enyere “Ndị Mbịarambịa” Aka Ka Ha ‘Jiri Ọṅụ Na-ejere Jehova Ozi’
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
  • Ụwa Ebe Ụkwụ Ga-eru Onye Ọ Bụla Ala
    Teta!—2002
  • Ndị Na-achọ Ịnọ ná Nchebe
    Teta!—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1996
g96 9/8 p. 17

Ihe Ọdachi Na-akpata

GỊNỊ ka ọ dị ka ya ịbụ onye gbara ọsọ ndụ? Gbalịa iwere ya na ị na-ebi n’udo, ma na mberede ụzọ ndụ gị nile agbanwee. Mgbe chi na-abọla, ndị agbata obi aghọọ ndị iro. Ndị agha na-abịa, bụ́ ndị ga-akwakọrọ ma gbaa ebe obibi gị ọkụ. I nwere nkeji iri iji kwakọrọ ihe ma gbapụ n’ihi ndụ gị. Ị pụrụ iburu nanị otu obere akpa, ebe ọ bụ na ị ghaghị iburu ya gaa ọtụtụ mile. Gịnị ka ị ga-etinye n’ime ya?

Ị na-apụ n’etiti ụda égbè na ìgwè ngwá agha. Ị na-esonyere ndị ọzọ na-agbapụkwa agbapụ. Ọtụtụ ụbọchị na-agabiga; ị na-adọkpụ onwe gị n’agụụ, akpịrị kpọrọ gị nkụ, ike gwụbigakwara gị ókè. Iji lanarị, ị ghaghị ịdị na-akpụ onwe gị n’agbanyeghị ike ọgwụgwụ. Ị na-arahụ n’ala. Ị na-awagharị n’ọhịa na-achọ ihe ị ga-eri.

Ị bịarutere mba na-adịghị ize ndụ, ma ndị nche ókèala ekweghị ka ị gafee. Ha nyochara akpa gị ma jichie ihe nile bara uru. Ị hụrụ ebe nnyocha ọzọ, gafeekwa ókèala ahụ. E tinyere gị n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ nke ruru unyi, nke ogige e ji waya gbaa. N’agbanyeghị na ndị nwere otu ụdị ọnọdụ ọjọọ ahụ i nwere gbara gị gburugburu, ọ dị gị ka ị nọ nanị gị, ị nọkwa ná mgbagwoju anya.

Mkpakọrịta nke ezinụlọ na ndị enyi gị efunahụwo gị. Ị na-ahụ onwe gị ka ị na-adabere kpam kpam n’enyemaka sitere n’èzí. Ọrụ adịghị, ọ dịghịkwa ihe e nwere ime. Ị na-agbaso mmetụta nke enweghị olileanya, obi nkoropụ, na iwe mgba. Ị na-enwe nchegbu banyere ọdịnihu gị, na-amara na ọnụnọ gị n’ogige ahụ yikarịrị ka ọ̀ ga-abụ ruo nwa oge. E kwuwerị, ogige ahụ abụghị ebe obibi—ọ dị ka ụlọ nchere ma ọ bụ ụlọ jupụtara ná ndị mmadụ ndị ọ na-adịghị onye chọrọ ha. Ị na-eche ma à ga-eji ike zighachi gị n’ebe i si bịa.

Nke a bụ ahụmahụ nke ọtụtụ nde mmadụ taa. Dị ka Ụlọ Ọrụ Mba Ndị Dị n’Otu Na-ahụ Maka Ndị Gbara Ọsọ Ndụ (UNHCR) si kwuo, 27 nde mmadụ n’ụwa nile agbapụwo n’ihi agha ma ọ bụ mkpagbu. A chụpụwokwa 23 nde mmadụ ọzọ n’ebe obibi ha n’ime mba nke aka ha. Ná ngụkọta, a manyewo 1 n’ime 115 mmadụ ọ bụla ịgbapụ. Ihe ka ọtụtụ n’ime ha bụ ụmụ nwanyị na ụmụntakịrị. N’ịbụ ihe agha na ọdachi kpatara, a na-ahapụ ndị gbara ọsọ ndụ n’enweghị nduzi n’ime ụwa nke na-achọghị ha, ụwa nke na-ajụ ha, ọ bụghị n’ihi ndị ha bụ, kama n’ihi ihe ha bụ.

Ọnụnọ ha bụ ihe àmà nke oké ọgba aghara zuru ụwa ọnụ. UNHCR na-ekwu, sị: “Ndị gbara ọsọ ndụ bụ mgbaàmà kasị ukwuu nke nkewasị nke ọha mmadụ. Ha bụ njikọ ikpeazụ kasị pụta ìhè n’usoro mmetụta nke na-akọwa ọ̀tụ̀tụ̀ ndakpọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ọha na eze nke mba. E lee ya anya n’ụwa nile, ha bụ ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nke ọnọdụ mmepeanya ụmụ mmadụ nke e nwere ugbu a.”

Ndị ọkachamara na-ekwu na ọ̀tụ̀tụ̀ nke nsogbu ahụ enweghị atụ, ọ na-agakwa n’ihu n’enweghị njedebe dị n’isi nso. Gịnị dugaworo n’ọnọdụ dị otú ahụ? È nwere ihe ngwọta ọ bụla? Isiokwu ndị na-esonụ ga-enyocha ajụjụ ndị a.

[Ebe E Si Nweta Foto Ndi Dị na peeji 17]

Nwata nwoke n’aka ekpe: UN PHOTO 159243/J. Isaac

U.S. Navy photo

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya