Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 9/8 p. 23
  • Ihe Nlereanya Iji Meso Ndị Gbara Ọsọ Ndụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Nlereanya Iji Meso Ndị Gbara Ọsọ Ndụ
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ‘E Dere Ya Iji Nye Anyị Ntụziaka’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Ịkpọasị Agbụrụ Ọ̀ Ziri Ezi?
    Teta!—2003
  • Ọgụgụ Bible—Ihe Bara Uru Ma Na-atọ Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Deuterọnọmi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1996
g96 9/8 p. 23

Ihe Nlereanya Iji Meso Ndị Gbara Ọsọ Ndụ

N’IWU Jehova Chineke nyere mba Israel, e chetaara ndị Israel banyere ọnọdụ ha dị ka ndị gbara ọsọ ndụ n’Ijipt. (Ọpụpụ 22:21; 23:9; Deuterọnọmi 10:19) Ya mere a kụziiri ha imeso ndị ọbịa bi n’etiti ha ihe n’ụzọ obi ọma, kpọmkwem dị ka ụmụnne.

Iwu Chineke kwuru, sị: “Mgbe ọbịa [onye na-abụkarị onye gbara ọsọ ndụ] ga-anọnyere gị dị ka ọbịa n’ala unu, unu emela ya ihe ike. Dị ka onye a mụrụ n’ala site n’ahụ unu ka ọbịa ga-adịrị unu, bụ́ onye nọ dị ka ọbịa n’etiti unu, ị ga-ahụkwa ya n’anya dị ka onwe gị; n’ihi na ndị ọbịa ka unu bụrịị n’ala Ijipt.”—Levitikọs 19:33, 34.

N’ịmara na ndị ọbịa na-adịkarị mfe imeso omume ọjọọ, bụrụkwa ndị na-anọghị ná nchebe, Jehova nyere iwu ndị doro anya maka ọdịmma na nchebe ha. Tụlee ikike ndị na-esonụ e nyere ha.

IKIKE INWETA IKPE ZIRI EZI: “Otu ikpe dịịrị unu, dị ka a na-ekpe ọbịa, otú a ka a ga-ekpe onye a mụrụ n’ala.” “Ewezụgala ikpe ọbịa.”—Levitikọs 24:22; Deuterọnọmi 24:17.

IKIKE IKERE ÒKÈ N’OTU ỤZỌ N’ỤZỌ IRI: “N’ọgwụgwụ afọ atọ ị ga-ewepụta otu ụzọ n’ụzọ iri nile nke ihe omume gị n’otu afọ ahụ, dọbakwa ya n’ime ọnụ ụzọ ámá gị nile: onye Livaị ga-abịakwa, (n’ihi na ọ dịghị òkè ma ọ bụ ihe nketa o sooro gị nwee), ya na ọbịa, na nwa mgbei, na nwanyị di ya nwụrụ, ndị nọ n’ime ọnụ ụzọ ámá gị nile, ha ga-erikwa ihe, afọ ga-ejukwa ha.”—Deuterọnọmi 14:28, 29.

IKIKE ỊNATA ỤGWỌ ỌRỤ KWESỊRỊ EKWESỊ: “Emegbula onye e goro ọrụ nke bụ onye e wedara n’ala na ogbenye, ma o sitere n’ụmụnne gị, ma ọ bụ na o sitere ná ndị ọbịa gị ndị nọ n’ala gị n’ime ọnụ ụzọ ámá gị ọ bụla.”—Deuterọnọmi 24:14.

IKIKE NCHEBE MAKA ONYE GBURU MMADỤ N’ỌGHỌM: “Obodo isii ndị a ga-abụrụ ụmụ Israel, bụrụkwa ọbịa, bụrụkwa onye bi n’etiti ha, ebe mgbaba: ka onye ọ bụla nke na-etigbu mmadụ n’ọghọm wee gbalaga n’ebe ahụ.”—Ọnụ Ọgụgụ 35:15.

IKIKE IWERE IHE NDỊ FỌRỌ N’UBI: “Mgbe unu na-ewe ihe ubi nke ala unu, ewesịla ihe dị n’akụkụ ubi gị, achịkọtakwala ihe nchịkọta nke owuwe ihe ubi gị fọdụrụ. Atụtụkọkwala mkpụrụ ubi vine gị fọdụrụ, achịkọtakwala mkpụrụ dara ada n’ubi vine gị; ogbenye na ọbịa ka ị ga-ahapụrụ ha: Mụ onwe m bụ Jehova, bụ́ Chineke unu.”—Levitikọs 19:9, 10.

N’ezie, Onye Okike anyị, bụ́ Jehova Chineke, nwere ọmịiko n’ebe ndị gbara ọsọ ndụ nọ, ọ ghaghịkwa inwe obi ụtọ mgbe anyị mekwara otú ahụ. “Bụrụnụ ndị na-eṅomi Chineke,” ka onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi dere, “na-ejegharịkwanụ n’ịhụnanya.”—Ndị Efesọs 5:1, 2.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 23]

Nwata nwoke n’aka ekpe: UN PHOTO 159243/J. Isaac

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya