Gịnị Bụ Ihe Ngwọta Ya?
ỌNỌDỤ onye gbara ọsọ ndụ abụghị nke gbara ọchịchịrị kpam kpam. Gbaa ụwa gburugburu, òtù ndị na-akwalite ọdịmma ndị mmadụ na-agbalị inyere ndị agha ma ọ bụ nsogbu ndị ọzọ chụpụrụ n’ebe obibi ha aka. Ụzọ bụ isi ha si enye aka bụ site n’inyere ndị gbara ọsọ ndụ aka ịlaghachi ná mba a mụrụ ha.
Ndị gbara ọsọ ndụ na-ahapụ ebe obibi, ógbè, na ala ha n’ihi na ha na-atụ egwu na a ga-egbu ha, taa ha ahụhụ, dinaa ha n’ike, tụọ ha mkpọrọ, gbaa ha n’ohu, zuo ha ohi, ma ọ bụ kwụwa ha agụụ. Ya mere tupu ndị gbara ọsọ ndụ enwee ike ịlaghachi ụlọ, a ghaghị idozi nsogbu ndị mere ka ha gbapụ. Ọbụna mgbe agha mesịrị kwụsị, enweghị iwu na ụkpụrụ na-eme ka ndị mmadụ nwee nkụda mmụọ n’ịlaghachi n’ala ha. Agnes, bụ́ onye Rwanda gbara ọsọ ndụ na nne nke ụmụ isii kwuru, sị: “Ịkpọrọ anyị [laghachi] Rwanda ga-adị ka ịkpọga anyị n’ili anyị.”
Ka o sina dị, kemgbe 1989, ihe karịrị nde itoolu nke ndị gbara ọsọ ndụ alaghachiwo n’ebe obibi ha. Ihe dị ka 3.6 nde n’ime ndị a si Iran na Pakistan laghachi Afghanistan. Ndị ọzọ gbara ọsọ ndụ dị 1.6 nde sitere ná mba isii laghachiri Mozambique, bụ́ mba nke agha obodo were afọ 16 tisasịrị.
Ịlaghachi adịghị mfe. Mba ndị gbara ọsọ ndụ na-alaghachi na ha na-abụkarị ebe e bibiri ebibi—na-enwe ime obodo ndị e bibisịrị ebibi, àkwà mmiri e bibisịrị ebibi, okporo ụzọ na ala ahịhịa ndị e liri ogbunigwe na ha. N’ihi ya, ndị gbara ọsọ ndụ na-alaghachi alaghachi aghaghị isite n’isi wughachi ọ bụghị nanị ndụ ha, kamakwa ebe obibi ha, ụlọ akwụkwọ, obere ụlọ ọgwụ ahụ ike, na ihe ọ bụla ọzọ.
Otú ọ dị, ọbụna mgbe ire ọkụ nke esemokwu danyụrụ n’otu ebe, na-enye ndị gbara ọsọ ndụ ohere ịlaghachi, ha na-amalite n’ebe ọzọ, na-akpata njupụta nke ndị ọhụrụ gbara ọsọ ndụ. Ya mere, ịgwọta ọgba aghara nke ndị gbara ọsọ ndụ pụtara ịgwọta nsogbu ndị e jikọrọ ya na ha bụ́ agha, mmegbu, ịkpọasị, mkpagbu, na ihe ndị ọzọ na-eme ka ndị mmadụ gbapụ n’ihi ndụ ha.
Akwụkwọ bụ́ The State of the World’s Refugees 1995 na-ekwenye, sị: “Eziokwu a na-adịghị enyo enyo . . . bụ na ihe ngwọta [nye ọgba aghara nke ndị gbara ọsọ ndụ] na-adabere n’ụzọ bụ isi n’ihe ndị metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị agha na akụ̀ na ụba, bụ́ ndị karịrị nchịkwa nke òtù ọ bụla na-akwalite ọdịmma ndị mmadụ.” Dị ka Bible si kwuo, ihe ngwọta ya karịkwara ikike nke òtù ọ bụla nke ụwa, ma ọ̀ bụ nke na-akwalite ọdịmma ndị mmadụ ma ọ bụ na ọ bụghị ya.
Ụwa nke Ndị Gbara Ọsọ Ndụ Na-adịghị
Otú ọ dị, e nwere ihe ngwọta. Bible na-egosi na Jehova Chineke na-echegbu onwe ya banyere ndị e kewapụworo site n’ebe obibi na ezinụlọ ha. N’adịghị ka ọchịchị dị iche iche nke ụwa, o nwere ikike na amamihe iji gwọta nsogbu nile dị mgbagwoju anya ndị na-eche ihe a kpọrọ mmadụ ihu. Ọ ga-eme otú ahụ site n’Alaeze ya—ọchịchị eluigwe nke ga-eweghara ihe nile metụtara ụwa n’oge na-adịghị anya.
Alaeze Chineke ga-anọchi anya ọchịchị nile nke ụmụ mmadụ. Kama inwe ọtụtụ ọchịchị n’ụwa, dị ka anyị nwere ugbu a, a ga-enwe nanị otu ọchịchị, nke ga-achị n’elu mbara ụwa nile. Bible na-ebu amụma, sị: “Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie, nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụkwa ọbụbụeze ya ka a na-agaghị ahapụrụ ndị ọzọ; ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.”—Daniel 2:44.
Ọ pụrụ ịbụ na ị maara ekpere nlereanya ahụ dị na Bible na Matiu 6:9-13 nke ọma. Otu akụkụ nke ekpere ahụ na-asị: “Ka alaeze Gị bịa. Ka e mee ihe Ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.” N’ikwekọ n’ekpere ahụ, Alaeze Chineke ‘ga-abịa’ n’oge na-adịghị anya imezu nzube Chineke maka ụwa.
N’okpuru ịchịisi ịhụnanya nke Alaeze Chineke, a ga-enwe udo na ịnọ ná ntụkwasị obi zuru ụwa ọnụ. A gaghị enwekwa ịkpọasị na ịlụ ọgụ n’etiti ndị mmadụ na mba dị iche iche nke ụwa. (Abụ Ọma 46:9) A gaghị enwekwa ọtụtụ nde ndị gbara ọsọ ndụ na-agbapụ n’ihi ndụ ha ma ọ bụ na-ahụsi anya n’ogige dị iche iche.
Okwu Chineke na-ekwe nkwa na Eze nke Alaeze Chineke, bụ́ Jisọs Kraịst, “ga-anapụta ogbenye mgbe ọ na-etiku ya; ọ ga-anapụtakwa onye e wedara n’ala mgbe ọ dịghị onye na-enyere ya aka. Ọ ga-emere onye na-enweghị ike na ogbenye ebere, ọ bụkwa mkpụrụ obi ndị ogbenye ka ọ ga-azọpụta. Ọ ga-esi n’aka nzọgbu na n’aka ime ihe ike gbapụta mkpụrụ obi ha; ọbara ha ga-adịkwa oké ọnụ ahịa n’anya ya.”—Abụ Ọma 72:12-14.
[Foto dị na peeji nke 24]
N’oge na-adịghị anya mmadụ nile ga na-emeso ibe ha dị ka ezi ụmụnne ndị ikom na ndị inyom