Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 10/8 p. 20-22
  • Chịkwaa Ndụ Gị Ugbu A!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chịkwaa Ndụ Gị Ugbu A!
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Bụ Echiche Bible?
  • Enyemaka Kasị Mma E Nwere
  • “Okwu Chineke Dị Ndụ, Na-arụsikwa Ọrụ Ike”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ònye Ka Ụta Dịịrị—Gị Ka Ọ̀ Bụ Mkpụrụ Ndụ Ihe Nketa Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Ihe Mere Ihe Ọjọọ Ka Ji Dịrị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Nhọrọ E Ji Aka na Ọ Ga-enye Ndụ nke Ezi Udo na Ntụkwasị Obi
    Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1996
g96 10/8 p. 20-22

Chịkwaa Ndụ Gị Ugbu A!

NCHỌPỤTA nkà mmụta sayensị n’ihe banyere akparamàgwà na mkpali mmadụ abaworo anyị uru n’ọtụtụ ụzọ. Ikekwe e nyeworo anyị aka ịnagide otu ọrịa site n’inwe nghọta ka dị omimi banyere ya. N’otu mgbe ahụ, ọ bụ ihe amamihe ịkpachara anya mgbe a bịara ná nchepụta ndị na-akpali akpali, karịsịa ndị ahụ yiri ka ha na-emegide ụkpụrụ ndị doro anya.

N’okwu banyere mkpụrụ ndụ ihe nketa na akparamàgwà, ajụjụ na-ebilite bụ: Ànyị pụrụ ịgbahapụ ibu ọrụ anyị ma ghara inweta ịta ụta maka omume anyị? Ànyị pụrụ ịgọpụ onwe anyị ma ọ bụ ọbụna taa onye ọzọ ma ọ bụ ihe ọzọ ụta maka enweghị uche ma ọ bụ ihe ọjọọ ọ bụla, si otú a na-esonye n’ọnụ ọgụgụ na-arị elu n’ọgbọ nke “ọ bụghị m”? Ọ dịghị ma ọlị. Ọtụtụ ndị na-eji obi ha nile anara ịja mma maka ihe ịga nke ọma ọ bụla ná ndụ, n’ihi ya gịnị mere ha ekwesịghị iji obi ha nile nakwere ibu ọrụ maka mmejọ ha n’otu aka ahụ?

N’ihi ya, anyị pụrụ ịjụ sị, Gịnị ka Okwu Chineke, bụ́ Bible Nsọ, nwere ikwu banyere onye ma ọ bụ ihe na-achịkwa ndụ anyị taa?

Gịnị Bụ Echiche Bible?

Ihe mbụ anyị kwesịrị ịghọta bụ na a mụrụ anyị nile n’ime mmehie anyị ketara site ná nne na nna anyị mbụ, bụ́ Adam na Iv. (Abụ Ọma 51:5) Ọzọkwa, anyị na-ebi n’oge pụrụ iche, a kpọrọ “mgbe ikpeazụ,” mgbe ndị mmadụ na-enwe “oge dị oké egwu.” (2 Timoti 3:1) Nke a na-egosi na, n’ozuzu ya, anyị na-enwe nsogbu ka ukwuu n’inwe nchịkwa dị mma n’ebe ndụ anyị dị karịa ka ndị nna nna anyị mere.

Ka o sina dị, mmadụ nile nweere onwe ha ime nhọrọ, bụ́ ndị nwere ike ime nhọrọ nke onwe ha. Ruo n’ókè ahụ ka ha na-achịkwa ndụ ha. Nke a adịwo otú a siterị n’oge mbụ, a pụkwara ịhụ ya n’okwu Joshua gwara mba Israel: “Họpụtaranụ onwe unu taa onye unu ga-efe ofufe.”—Joshua 24:15.

Bible na-ekweta na a chụtuwo Setan bụ́ Ekwensu site n’eluigwe, ugbu a kwa, karịa mgbe ọ bụla ọzọ, ọ na-enwe mmetụta ọjọọ siri ike n’agbụrụ ụmụ mmadụ dum. Ọ na-agwakwa anyị na ọbụna n’ụbọchị Jọn onyeozi, ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ. (1 Jọn 5:19; Mkpughe 12:9, 12) Otú ọ dị, dị nnọọ ka Chineke nke Pụrụ Ime Ihe Nile na-adịghị achịkwa omume nile anyị ma ọ bụ kaa ọgwụgwụ anyị nke nanị ya maara aka, anyị ekwesịghị ịta Setan ụta kpọmkwem maka mmejọ ma ọ bụ ndahie nile anyị. Eziokwu Akwụkwọ Nsọ ziri ezi bụ na “a na-anwa onye ọ bụla mgbe agụụ ihe ọjọọ nke aka ya na-adọkpụfu ya, e wee rafuo ya. Mgbe ahụ ihe ọjọọ ahụ, mgbe ọ tụwooro ime, o wee mụpụta mmehie.” (Jemes 1:14, 15) Pọl onyeozi dere okwu ndị a sitere n’ike mmụọ nsọ: “Unu ekwela ka e duhie unu; Chineke abụghị onye a na-elelị: n’ihi na mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke ahụ ka ọ ga-ewetakwa n’ubi.”—Ndị Galetia 6:7.

Ya mere anyị nile n’otu n’otu ga-aza ajụjụ n’ihu Jehova Chineke maka omume anyị. Anyị aghaghị ilezi anya ka anyị ghara ịgọpụ onwe anyị n’ihi ihe ndị mejupụtara mkpụrụ ndụ ihe nketa anyị na ezughị okè ndị e ketara eketa. Chineke mere ka ógbè ochie nke Sọdọm na Gọmọra na-eme ihe ike, na-edinakwa ụdị onwe ha zaa ajụjụ maka omume ha rụrụ arụ. O doro anya na o leghị ndị bi na ya anya dị ka ndị e kere eke kwesịrị imere ebere, na-enweghị ihe ndabara ọma, ndị na-apụghị izere omume ọjọọ n’ihi ihe ụfọdụ e chere na ọ bụ ntụpọ nke mkpụrụ ndụ ihe nketa. N’otu aka ahụ, ndị biri n’oge Noa nwere ọtụtụ mmetụta ọjọọ gburugburu ha; otú o sina dị, ha aghaghị ime nhọrọ, mkpebi onwe onye, ma ọ bụrụ na ha ga-alanarị Iju Mmiri ahụ ga-ewere ọnọdụ n’isi nso. Ole na ole mere nhọrọ ziri ezi. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ emeghị.

Onye amụma Hibru ahụ bụ́ Ezikiel na-akwado na a chọrọ nchịkwa onwe onye ma ọ bụrụ na anyị ga-enweta ihu ọma Chineke: “Ma gị onwe gị, mgbe ị ga-adọ onye na-emebi iwu aka ná ntị, ma o sighị ná mmebi iwu ya na n’ụzọ mmebi iwu ya chigharịa, onye ahụ ga-anwụ n’ajọ omume ya; ma gị onwe gị, mkpụrụ obi gị ka ị napụtaworo.”—Ezikiel 3:19.

Enyemaka Kasị Mma E Nwere

N’eziokwu, enyemaka dị anyị nile mkpa iji nwee nchịkwa ná ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị, nyekwa ọtụtụ n’ime anyị, nke a bụ nnọọ ihe ịma aka. Ma anyị ekwesịghị inwe obi nkoropụ. Ọ bụ ezie na Chineke adịghị anakwere ọchịchọ anyị nke mmehie e ketara eketa, ọ bụrụ na anyị chọrọ ịgbanwe akparamàgwà anyị, ọ ga-enye anyị enyemaka kasị mma e nwere—mmụọ nsọ ya na eziokwu ya e dere n’ike mmụọ nsọ ya. N’agbanyeghị mkpụrụ ndụ ebumpụta ụwa ọ bụla a kara aka anyị pụrụ inwe na mmetụta ndị si n’èzí pụrụ imetụta anyị, anyị pụrụ ‘iyipụ mmadụ ochie ahụ, ya na omume ya nile, yikwasịkwa [onwe anyị] mmadụ ọhụrụ ahụ, nke a na-eme ya ka ọ dị ọhụrụ ruo ná mmazu dị ka onyinyo nke Onye kere ya si dị.’—Ndị Kọlọsi 3:9, 10.

Ọtụtụ ndị Kraịst n’ọgbakọ Kọrint mere mgbanwe dị ukwuu n’akparamàgwà ha. Ihe ndekọ e ji ike mmụọ nsọ dee na-agwa anyị, sị: “Ndị na-akwa iko, ma ọ bụ ndị na-ekpere arụsị, ma ọ bụ ndị ikom na-akwa iko, bụ́ ndị nwere nwunye, ma ọ bụ ndị ikom na-eme dị ka ndị inyom, ma ọ bụ ndị ikom na-emerụ onwe ha n’ahụ ndị ikom, ma ọ bụ ndị ohi, ma ọ bụ ndị anyaukwu, ma ọ bụ ndị na-aṅụbiga mmanya ókè, ma ọ bụ ndị nkwutọ, ma ọ bụ ndị na-apụnara mmadụ ihe, ha agaghị eketa alaeze Chineke. Otú a ka ụfọdụ n’etiti unu dịkwarịị: ma unu sachara onwe unu, ma e doro unu nsọ, ma a gụrụ unu ná ndị ezi omume n’aha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, ya na n’ime Mmụọ nke Chineke anyị.”—1 Ndị Kọrint 6:9-11.

Ya mere ọ bụrụ na anyị na-agbaso ezughị okè anyị mgba, ka anyị ghara ikwe ka ha merie anyị. Ọtụtụ ndị Kraịst nke oge a anwapụtawo na site n’enyemaka Jehova, ha nwere ike ‘inwogha site n’ime ka uche ha bụrụ ihe ọhụrụ, nwapụtakwara onwe ha ihe bụ ihe Chineke na-achọ, bụ́ ezi ihe nke dịkwa Ya ezi ụtọ, nke zukwara okè.’ Ha na-atụkwasị obi ha n’ihe ndị bụ eziokwu, ziri ezi, dị ọcha, kwesịrị ịhụnanya, dị mma, kwesịrị otuto; ha ‘na-agụkọkwa ihe ndị a.’ Ha na-eri nri ime mmụọ siri ike, sitekwa n’iji ya eme ihe, ha azụwo ikike nghọta ha ịmata ihe ọma na ihe ọjọọ.—Ndị Rom 12:2; Ndị Filipaị 4:8; Ndị Hibru 5:14.

Ọ bụ ihe na-akasi obi ịmata banyere mgbalị ha, ọdịda nwa oge ha, na ihe ịga nke ọma ha mesịrị nwee site n’enyemaka nke mmụọ nsọ Chineke. Chineke na-emesi anyị obi ike na ịgbanwe akparamàgwà anyị na-agụnyekarị obi na ọchịchọ ya: “N’ihi na amamihe ga-aba n’obi gị, ihe ọmụma ga-adịkwa mkpụrụ obi gị ụtọ; ìzùzù ga-eche gị nche, nghọta ga-echebe gị: ịnapụta gị n’ụzọ onye ọjọọ.”—Ilu 2:10-12.

Ya mere, ọ bụrụ na ị chọrọ ime ndụ ebighị ebi ihe mgbaru ọsọ gị—ndụ na-enweghị nsogbu dị iche iche nke ụwa ọjọọ, nke nweere onwe ya pụọ n’ezughị okè ndị na-agwụ ike—‘jisie ike’ n’ịchịkwa ndụ gị ugbu a wee bụrụ onye amamihe si n’elu na-eduzi. (Luk 13:24) Nara enyemaka nke mmụọ nsọ Jehova ka i wee mịpụta mkpụrụ nke njide onwe onye. Mee ka ọ bụrụ ọchịchọ obi gị ime ka ndụ gị kwekọọ n’iwu Chineke, ṅaakwa ntị na ndụmọdụ bụ́: “Karịa ihe ndebe gị nile chebe obi gị; n’ihi na site na ya ka mpụta nile nke ndụ dị.” (Ilu 4:23) Inweta “ndụ ahụ nke bụ ndụ n’ezie” n’ime ụwa ọhụrụ Chineke—nke ọ bụ n’ime ya ka Jehova Chineke ga-emezi erughị eru nile nke mkpụrụ ndụ ihe nketa ná ndabere nke okwukwe n’àjà mgbapụta Jisọs Kraịst—kwesịrị mgbalị nile i mere iji chịkwaa ndụ gị n’ụwa nke a!—1 Timoti 6:19; Jọn 3:16.

[Foto dị na peeji nke 21]

Ịmụ Bible pụrụ inye anyị ume iji merie adịghị ike ndị gbanyesiworo mkpọrọgwụ ike n’ime anyị

[Foto dị na peeji nke 21]

Ọmụmụ Bible pụrụ inyere anyị aka ijigide ụkpụrụ omume ọma Chineke

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya