Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 10/8 p. 23-25
  • Jiri Ọgwụ Na-eme Ihe n’Ụzọ Amamihe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jiri Ọgwụ Na-eme Ihe n’Ụzọ Amamihe
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Abamuru Megide Ihe Ize Ndụ
  • Ọgwụ Nje—Ikike na Adịghị Ike Ha
  • Ọgwụ Ọgbụgba Hà Ka Mkpụrụ Ọgwụ Mma?
  • Ọgwụ Adịgboroja
  • Nsogbu nke Ịda Ogbenye
  • Ọgwụgwọ Ọ̀ Dị Gị Mkpa n’Ezie?
  • Ọgwụ Ọjọọ—Olee Ndị Na-eji Ha Eme Ihe?
    Teta!—2001
  • Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nwee Ezi Ahụ Ike?
    Teta!—1998
  • À Ga-akwụsị Ọrịa AIDS? Ọ Bụrụ Otú ahụ, Ọ̀ Bụ n’Ụzọ Dị Aṅaa?
    Teta!—2002
  • Ndị Na-eto Eto na Ọgwụ Ọjọọ
    Teta!—2003
Teta!—1996
g96 10/8 p. 23-25

Jiri Ọgwụ Na-eme Ihe n’Ụzọ Amamihe

SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA NIGERIA

NWANYỊ ahụ mere mkpesa na isi na-awa ya, nakwa na afọ na-egbu ya mgbu. Ya na dọkịta kwurịtara okwu dị mkpirikpi. Mgbe ahụ o depụtara usoro ịgba ọgwụ ga-ewe ụbọchị atọ maka ịba, bụ́ paracetamol (acetaminophen), iji kwụsị isi ọwụwa ahụ, ọgwụ abụọ iji belata ihe pụrụ ịbụworị ọnyá afọ, ọgwụ na-akụjụ ahụ maka nchekasị ya, na n’ikpeazụ maka ọ̀tụ̀tụ̀ dị mma, usoro ọgwụ nwere ọtụtụ vitamin. Ọnụ ahịa ya dị oké elu, ma nwanyị ahụ ajụghị. O ji obi ụtọ pụọ, na-enwe obi ike na ọgwụ ndị ahụ ga-agwọta nsogbu ya.

Ngakwuru dị otú ahụ adịghị ụkọ n’Ọdịda Anyanwụ Africa. Otu nnyocha e mere n’otu mba buru ibu n’ebe ahụ gosiri na ndị ọrụ ahụ ike n’ụlọ ọrụ ahụ ike ọha mmadụ na-edepụta nkezi bụ́ 3.8 ọgwụ dị iche iche maka otu onye ọrịa n’otu nleta. N’eziokwu, nye ọtụtụ ndị, ezigbo dọkịta bụ onye na-edepụta ọtụtụ ọgwụ.

Ma eleghị anya ị pụrụ ịghọta obi ike ndị Ọdịda Anyanwụ Africa nwere n’ebe ọgwụ dị mgbe ị tụlere ihe bụbu ọnọdụ ahụ ike. N’ihe karịrị afọ 40 gara aga, onye na-ede akwụkwọ bụ́ John Gunther dere banyere oge ndị mbụ, sị: “Ụsọ Oké Osimiri Ndị Ohu a egbughị nanị . . . ndị isi ojii; o gbukwara ndị ọcha, ọ bụkwa akụkụ Africa a matara n’akụkọ mgbe ochie dị ka ‘Ili Onye Ọcha.’ Ruo ọtụtụ narị afọ, anwụnta bụ eze a na-adịghị agbagha agbagha nke Guinea Coast. Ịba anya odo, ahụ ọkụ mmiri ojii, ịba, bụ ajọ ngwá agha ndị eze ahụ ji mee ihe. Igbu egbu ọjọọ nke ihu igwe Ụsọ Oké Osimiri Ọdịda Anyanwụ abụghị ihe ndekọ nke oge gara aga, kama ọ bụ ihe ncheta nke ndị dị ndụ. Otu akụkọ dị nkenke a ma ama na-akọwa onye nnọchiteanya mba ọzọ n’azụmahịa, bụ́ onye chọpụtara n’oge na-adịbeghị oké anya gara aga, na e zigara ya Nigeria, wee jụọkwa banyere ụgwọ ezumike nká ya. ‘Ụgwọ ezumike nká?’ ka onye isi ya n’Ọfịs Ndị Ọchịchị Mba Ọzọ zaghachiri. ‘Enyi m, ọ dịghị onye ọ bụla na-aga Nigeria nke na-adị ndụ ruo n’ịla ezumike nká.’”

Oge agbanwewo. Taa, e nwere ọgwụ ndị e ji alụso, ọ bụghị nanị ọrịa ndị anwụnta na-agbasa ọgụ, kamakwa ọtụtụ ọrịa ndị ọzọ. Nanị ọgwụ mgbochi ọrịa ebelatawo nke ukwuu ọnụ ọgụgụ ndị na-anwụ site n’arụbara, ụkwara tịkọ tịkọ, ọrịa tetanus, na ọrịa diphtheria. N’ihi ọgwụ mgbochi ọrịa, e kpochapụwo kịtịkpa. N’isi nso ọrịa polio pụkwara ịghọ ọrịa oge gboo.

Ka a sịkwa ihe mere ọtụtụ ndị Africa taa ji nwee okwukwe dị omimi n’uru ọgwụ bara. Otú ọ dị, ọ bụghị nanị n’Ọdịda Anyanwụ Africa ka e nwere okwukwe dị otú ahụ. Na United States, ndị dọkịta na-ede ihe karịrị ijeri 55 ndepụta kwa ụbọchị. Na France, ndị mmadụ na-azụ nkezi nke igbe 50 nke ọgwụ kwa afọ. Na Japan kwa, otu onye na-emefu ihe karịrị $400 (U.S.) kwa afọ n’ọgwụ ahụ ike.

Abamuru Megide Ihe Ize Ndụ

Ọgwụ ọgbara ọhụrụ emewo ihe dị ukwuu n’inyere ihe a kpọrọ mmadụ aka. Mgbe e ji ha mee ihe n’ụzọ ziri ezi, ha na-akwalite ahụ ike, ma mgbe e ji ha mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, ha pụrụ imerụ ahụ na ọbụna igbu egbu. Na United States, dị ka ihe atụ, a na-enye ihe dị ka ndị mmadụ 300,000 àkwà n’ụlọ ọgwụ kwa afọ n’ihi mmetụta ọjọọ ọgwụ ahụ ike na-enwe, 18,000 na-anwụkwa.

Iji jiri ọgwụ na-eme ihe n’ụzọ amamihe, ọ dị mkpa ịghọta na e nwere mgbe nile ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ihe ize ndụ. Ọgwụ ọ bụla, ọbụna aspirin, pụrụ ịkpata mmetụta ọjọọ na-emerụ ahụ. Ikwe omume nke mmetụta ọjọọ na-ebuwanye ibu ma ọ bụrụ na ị ṅụkọọ ọtụtụ ọgwụ ọnụ. Nri na ihe ọṅụṅụ na-emetụtakwa otú ọgwụ si arụ ọrụ n’ime ahụ gị, ha pụkwara ime ka mmetụta ya siwanye ike ma ọ bụ mebie ya.

E nwere ihe ize ndụ ndị ọzọ. Ị pụrụ inwe mmetụta ahụ na-achọghị n’ebe otu ọgwụ dị. Ọ bụrụ na ị ṅụghị ọgwụ dị ka e siri depụta ha—ọ̀tụ̀tụ̀ kwesịrị ekwesị maka ogologo oge kwesịrị ekwesị—ha nwere ike ghara inyere gị aka, ha pụkwara ọbụna imerụ gị ahụ. Otu ihe ahụ pụrụ isi na ya pụta ma ọ bụrụ na dọkịta gị edepụta ọgwụ na-ekwesịghị ekwesị ma ọ bụ ọgwụ na-adịghị mkpa. Ị nọkwa n’ihe ize ndụ nke mmerụ ahụ ma ọ bụrụ na ị ṅụọ ọgwụ oge ya gafeworo, nke na-adịchaghị mma, ma ọ bụ nke adịgboroja.

Iji belata ihe ize ndụ ahụ, i kwesịrị ịmara ruo n’ókè o kwere mee banyere ọgwụ ọ bụla ị na-aṅụ. Ị pụrụ irite uru nke ukwuu site n’ịmara ihe ndị mere eme.

Ọgwụ Nje—Ikike na Adịghị Ike Ha

Kemgbe e mepụtara ha n’ihe dị ka afọ 50 gara aga, ọgwụ nje azọpụtawo ndụ ọtụtụ nde mmadụ. Ha abịadawo ọrịa ndị na-emenye ụjọ, dị ka ekpenta, ụkwara nta, oyi ịba n’ahụ, ahụ ọkụ uhie uhie, na ọta kpụrụkpụrụ. Ha na-ekerekwa òkè gbara ọkpụrụkpụ n’ọgwụgwọ nke ọrịa ndị ọzọ a na-ebufe ebufe.

Dr. Stuart Levy, onye prọfesọ ọgwụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ọgwụ nke Mahadum Tufts dị na United States, sịrị: “[Ọgwụ nje] agbanwewo ọgwụ kpam kpam. Ha bụ otu ngwá ọrụ gbanweworo akụkọ ihe mere eme ọgwụ karịsịa.” Onye ọzọ ọnụ na-eru n’okwu ahụ ike na-ekwu, sị: “Ha bụ nkume isi nkuku ndị a na-ewukwasị ọgwụ ọgbara ọhụrụ.”

Otú ọ dị, tupu ị gbaga na nke onye dọkịta gị ma kwuo ka o nye gị ọgwụ nje, tụlee mmetụta ọjọọ ha. Ọgwụ nje, mgbe e ji ha mee ihe n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị pụrụ imebi ihe karịa imezi ihe. Nke a bụ n’ihi na ọgwụ nje na-arụ ọrụ site n’ịwakpo na ibibi nje ndị dị n’ime ahụ. Ma ha adịghị ebibi nje nile na-emerụ ahụ mgbe nile; ụdị ụfọdụ nke nje na-eguzogide mwakpo ahụ. Ọ bụghị nanị na ụdị nje ndị a na-anagide ọgwụ na-alanarị, kama ha na-amụba ma gafee site n’otu onye gaa n’onye ọzọ.

Dị ka ihe atụ, e nwere mgbe penicillin dị oké irè n’ịgwọ ọrịa a na-ebufe ebufe. Ugbu a, n’otu akụkụ n’ihi nnagide na-arịwanye elu nke nje nwere, ụlọ ọrụ na-emepụta ọgwụ na-ere ọtụtụ narị ụdị dị iche iche nke penicillin.

Gịnị ka ị pụrụ ime iji zere nsogbu? Ọ bụrụ na ọgwụ nje dị gị mkpa n’ezie, jide n’aka na ọ bụ dọkịta ruru eru depụtara ha, na a zụtakwara ha site n’ebe iwu kwadoro. Arụgidela dọkịta gị ka o depụta ọgwụ nje ozugbo—ọ pụrụ ịchọ ka e lee gị ahụ n’ụlọ ime nnyocha iji jide n’aka na nke e depụtara kwesịrị ekwesị maka nrịanrịa gị.

Ọ dịkwa gị mkpa ịṅụ ọ̀tụ̀tụ̀ kwesịrị ekwesị ruo ogologo oge a chọrọ. I kwesịrị ịṅụzu usoro ọgwụ nje e depụtara, ọbụna ọ bụrụ na ị gbakeela tupu ị ṅụsịa ha.

Ọgwụ Ọgbụgba Hà Ka Mkpụrụ Ọgwụ Mma?

“Achọrọ m ọgwụ ọgbụgba!” Ọtụtụ ndị ọrụ ahụ ike ná mba ndị ka na-emepe emepe na-anụ okwu ndị a. Ihe ndabere maka arịrịọ dị otú ahụ bụ nkweta bụ na a na-agbanye ọgwụ kpọmkwem n’ime usoro ọbara, na-enyekwa ọgwụgwọ dị ike karịa ka mkpụrụ ọgwụ na-enye. Ná mba ụfọdụ, o sighị ike ịhụ ‘ndị dọkịta na-agba ọgwụ’ na-enweghị akwụkwọ ikike n’ahịa dị iche iche.

Ọgwụ ọgbụgba nwere ihe ize ndụ ndị mkpụrụ ọgwụ na-enweghị. Ọ bụrụ na ndụdụ adịghị ọcha, onye ọrịa ahụ pụrụ ibute ịba ọcha n’anya, ọrịa tetanus, na ọbụna ọrịa AIDS. Ndụdụ ruru unyi pụkwara ịkpata etuto nwere abụ na-egbu mgbu. Ihe ize ndị ahụ na-arị elu ma ọ bụrụ na ọ bụghị onye ruru eru gbara ọgwụ ahụ.

Ọ bụrụ na ịgba ọgwụ dị gị mkpa n’ezie, jide n’aka na ọ bụ onye ruru eru n’ụzọ nlekọta ahụ ike gbara ya. Maka nchebe gị, na-ejide n’aka mgbe nile na ma ndụdụ ma ihe a na-etinye ndụdụ enweghị nje.

Ọgwụ Adịgboroja

Ọrụ mmepụta ọgwụ zuru ụwa ọnụ bụ oké azụmahịa, na-ewebata ihe dị ka ijeri $170 (U.S.) kwa afọ, dị ka Òtù Ahụ Ike Ụwa (WHO) si kwuo. N’oké mmasị nke iji ọnọdụ ahụ mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, ndị arụrụala emepụtawo ọgwụ adịgboroja. Ọgwụ adịgboroja na-eyi ezigbo ọgwụ—otú ahụ ka akara na akwụkwọ e ji afụchi ha na-adị—ma ha abaghị uru.

Ọ bụ ezie na ọgwụ adịgboroja zuru ebe nile, a na-ahụkarị ha ná mba ndị ka na-emepe emepe, ha na-akpatakwa ihe ndị jọgburu onwe ha. Na Nigeria, ụmụaka 109 nwụrụ n’ihi ọrịa akụrụ mgbe ha ṅụsịrị mmiri ọgwụ na-akwụsị ahụ mgbu nke nwere solvent e ji emepụta ihe. Na Mexico, ndị ọkụ hụrụ rịara ọrịa akpụkpọ ahụ dị iche iche site n’ihe e chere na ha bụ ọgwụgwọ ndị nwere ntụ osisi, kọfị, na unyi. Na Burma, ọ pụrụ ịbụ na ịba gburu ọtụtụ ndị bi n’ime obodo n’ihi ịṅụ ọgwụ adịgboroja nke na-agwọghị ahụ ọkụ ịba. “Ndị kasị nọrọ n’ihe ize ndụ,” ka òtù WHO na-ekwu, “ka bụkwa ndị kasị daa ogbenye, ndị na-eche mgbe ụfọdụ na ọ bụ ahịa uru mgbe ha zụụrụ ihe yiri ka ọ bụ ọgwụ dị irè nke ụlọ ọrụ a na-akwanyere ùgwù mepụtara.”

Olee otú ị pụrụ isi chebe onwe gị pụọ n’ọgwụ adịgboroja? Jide n’aka na ihe ị zụụrụ sitere n’ebe a matara nke ọma, dị ka n’ebe a na-enye ọgwụ n’ụlọ ọgwụ. Azụla site n’aka ndị na-ebugharị ọgwụ n’okporo ámá. Otu onye na-emepụta ọgwụ na Benin City, Nigeria, na-adọ aka ná ntị, sị: “Nye ndị na-agba mgbere n’okporo ámá, ire ọgwụ bụ nanị achụmnta ego. Ha na-ekesa ọgwụ ka a ga-asị na ha bụ ihe nracha ma ọ bụ biskiti. Ọgwụ ha na-ere na-abụkarị ndị oge ha gafeworo ma ọ bụ nke adịgboroja. Ndị a amaghị ihe ọ bụla banyere ọgwụ ha na-ere.”

Nsogbu nke Ịda Ogbenye

Ego ole mmadụ nwere na-ekpebikarị nlekọta ahụ ike onye ahụ na-anata. Iji belata ọnụ ahịa ma ghara igbu oge, ndị mmadụ ná mba ndị ka na-emepe emepe pụrụ ịgabiga ndị dọkịta ma gaa kpọmkwem n’ebe a na-ere ọgwụ iji zụta ọgwụ ndị iwu chọrọ na ọ bụ dọkịta ga-edepụta. N’ihi na ọ dịwo mgbe ha ji ọgwụ ahụ mee ihe ma ọ bụ n’ihi na ndị enyi ha tụrụ aro ya, ha matara ihe ha chọrọ maka nrịanrịa ha. Ma ihe ha chọrọ nwere ike ọ gaghị abụ ihe dị ha mkpa.

Ndị mmadụ na-agbalịkwa ibelata ọnụ ahịa n’ụzọ ndị ọzọ. Onye dọkịta na-ele mmadụ ahụ n’ụlọ ime nnyocha, na-edepụtakwa otu ọgwụ. Onye ọrịa na-eji ndepụta ahụ gaa n’ebe a na-ere ọgwụ ma na-achọpụta na ọnụ ahịa ha dị elu. Ya mere kama ịchọkwu ego, ndị mmadụ ga-achọkarị ịzụrụ ọgwụ dị ọnụ ala karị ma ọ bụ zụrụ nanị ụfọdụ n’ọgwụ ndị e depụtara.

Ọgwụgwọ Ọ̀ Dị Gị Mkpa n’Ezie?

Ọ bụrụ na ọgwụ dị gị mkpa n’ezie, chọpụta ihe ị na-aṅụ. Emela ihere ịjụ onye dọkịta ma ọ bụ onye na-emepụta ọgwụ ajụjụ ụfọdụ banyere ọgwụ e depụtara. I nwere ikike ịmara. E kwuwerị, ọ bụ ahụ gị pụrụ ịhụju anya.

Ọ bụrụ na i jighị usoro ọgwụgwọ gị mee ihe n’ụzọ ziri ezi, i nwere ike ghara ịgbake. Ọ dị gị mkpa ịmata ókè ị ga-aṅụ, mgbe ị ga-aṅụ ya, na ogologo oge hà aṅaa a ga-aṅụ ya. Ọ dịkwa gị mkpa ịmara ụdị nri, ihe ọṅụṅụ, na ọgwụ ọzọ ma ọ bụ ihe omume ndị ị ga-ezere mgbe ị na-aṅụ ya. Ọ dịkwa gị mkpa ịmata mmetụta ọjọọ ndị ị pụrụ inwe na ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ na ha emee.

Ọzọ, buru n’uche na ọgwụ adịghị agwọta nsogbu ahụ ike nile. Ọ pụrụ ịbụ na ọgwụ adịghị gị mkpa ma ọlị. Magazin bụ́ World Health, nke òtù WHO na-ebipụta, na-ekwu, sị: “Jiri ọgwụ mee ihe nanị mgbe ọ dị mkpa. Izu ike, ezi ihe oriri na nnukwu ihe ọṅụṅụ na-ezukarị iji nyere mmadụ aka ịgbake.”

[Igbe/Foto dị na peeji nke 24]

“Otu puku nrịanrịa chọrọ otu puku ọgwụgwọ,” ka otu onye Rom na-agụ uri dere n’ihe dị ka afọ 2,000 gara aga. Taa, onye ahụ na-agụ uri gaara edeworị sị, ‘Otu puku nrịanrịa chọrọ otu puku mkpụrụ ọgwụ’! N’ezie, o yiri ka e nwere mkpụrụ ọgwụ maka ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nrịanrịa ọ bụla, nke dị adị ma ọ bụ nke e chere na ọ dị. Dị ka Ụlọ Akụ̀ Ụwa si kwuo, e nwere n’ụwa nile ihe dị ka ụdị ọgwụ 100,000, bụ́ ndị e ji ihe karịrị ihe siri ike 5,000 mee.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 25]

Ụzọ Isi Jiri Nghọta Na-eji Ọgwụ Eme Ihe

1. Ejila ọgwụ ndị oge ha gafeworo mee ihe.

2. Zụọ site n’ebe a ma ama. Azụla n’aka ndị na-agba mgbere n’okporo ámá.

3. Jide n’aka na ị ghọtara ma na-agbaso ntụziaka.

4. Ejila ọgwụ e depụtaara onye ọzọ na-eme ihe.

5. Esila ọnwụ na ọ ga-abụrịrị ọgwụ ọgbụgba. Ọgwụ ndị a ṅụrụ n’ọnụ na-arụ ọrụ ọtụtụ mgbe dị ka ya.

6. Debe ọgwụ n’ebe na-adịghị ekpo ọkụ, n’ebe aka ụmụaka na-agaghị eru ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya