Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
Olee Otú M Pụrụ Isi Nwee Oge Obi Ụtọ?
“Echere m na anyị aghaghị ime ọtụtụ ihe mkpori ndụ. Anyị na-eme ezi mgbalị ịnọkọ ọnụ n’ọgbakọ anyị. Anyị aghaghị ikpori ndụ dị mma. Ihe ka ọtụtụ n’ụmụaka nọ n’ụwa apụghị ikwu nke ahụ.”—Jennifer.
NTỤRỤNDỤ—ọ dị onye ọ bụla mkpa site n’oge ruo n’oge. Akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia na-asị na ntụrụndụ pụrụ ọbụna ịtụnye “ụtụ dị mkpa n’ahụ ike uche na anụ ahụ mmadụ.” Leenụ, Bible n’onwe ya na-ekwu na e nwere “mgbe ịchị ọchị,” ya bụ, mgbe ime onwe onye obi ụtọ!—Eklisiastis 3:1, 4.a
Na Bekee, e nwetara okwu e nwere maka “ntụrụndụ” site n’okwu Latin nke pụtara “ike ihe ọhụrụ, imeghachi, inye ume ọhụrụ.” (Webster’s New Collegiate Dictionary) N’ụzọ dị mwute, ọtụtụ n’ihe ndị na-eto eto na-eme maka “mkpori ndụ”—dị ka nnọkọ na-enweghị nchịkwa ma ọ bụ iji ọgwụ na ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, ma ọ bụ mmekọahụ ahụ rụrụ arụ—adịghị enye ume ọhụrụ ma ọlị, kama ha na-ebibi ihe. N’ihi ya, ịchọta ihe omume ntụrụndụ ndị na-enye obi ụtọ ma dị mma pụrụ ịbụ nnọọ ihe ịma aka. Ma dị ka Jennifer, bụ́ onye e hotara ná mmalite, na-egosi, a pụrụ ime ya!
Imekọ Ihe Ọnụ
N’oge na-adịbeghị anya Teta! gbara ọtụtụ ndị na-eto eto ajụjụ ọnụ n’isiokwu a. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ sịrị na ọ na-amasị ha isoro ndị ọzọ na-eto eto nọkọọ. Ọ̀ dị gị otú ahụ—ma na-achọpụtakarị na a dịghị akpọ gị? Mgbe ahụ, gịnị ma i bute ụzọ? Dị ka ihe atụ, otu nwa agbọghọ South Africa aha ya bụ Leigh na-asị: “Ọ bụrụ na ikiri otu ihe nkiri agụsie m agụụ ike, ana m akpọ otu n’ime ndị enyi m na fon, anyị na-agbasakwa okwu ahụ n’etiti ndị enyi anyị ndị ọzọ.” Ha na-agakarị n’oge ihe nkiri ahụ nke a na-egosi n’oge. E mesịa, ndị mụrụ ha na-abịa buru ha, ha nile na-agakọkwa rie ihe n’ụlọ nri dị n’ebe ahụ.
Ihe omume egwuregwu na-abụkwa oge maka mmega ahụ na-enye ahụ ike na mkpakọrịta dị mma. (1 Timoti 4:8) Roelien na-eto eto na-asị: “Ana m ebu ụzọ soro ezinụlọ m kparịta ebe m chọrọ ịga, mgbe ahụkwa anyị na-akpọ ìgwè dị nta ka ha sonyere anyị.” N’ezie, ndị ntorobịa bụ ndị Kraịst achọpụtawo ọtụtụ egwuregwu na-akpali akpali ma dị mma, ndị ha pụrụ isoro ndị ọzọ kere òkè na ha: ịgba n’elu ice, ịgba ịnyịnya ígwè, ịgba mwe mwe ọsọ, ịpịa tennis, baseball, ịgba bọl, na ịkụ volleyball, n’ikwu nanị ole na ole.
Ee e, ọ dịghị gị mkpa imefu ego buru ibu ma ọ bụ itinye ego ná ngwá ọrụ ndị mara mma n’anya iji nwee oge obi ụtọ. “Nne na nna m, ndị enyi m, na mụ etinyewo ọtụtụ hour na-enye obi ụtọ n’ime njem n’ugwu na ebe ọzara ndị dị anyị nso,” ka otu nwa agbọghọ onye Kraịst nọ n’afọ iri na ụma na-ekwu. “Nanị isoro ezi ndị enyi na-anara ikuku ndụ n’èzí na-enye obi ụtọ nke ukwuu!”
Nnọkọ Oriri na Ọṅụṅụ Ndị Na-ewuli Elu
Otú ọ dị, nye ọtụtụ ndị ntorobịa, ikpori ndụ pụtara ịga nnọkọ oriri na ọṅụṅụ. “Ọ na-enye anyị obi ụtọ ịkpọ ụfọdụ ndị enyi òkù iri ihe na igere egwú,” ka Aveda na-eto eto na-ekwu. Nnọkọ oriri na ọṅụṅụ nwere ọnọdụ ha n’etiti ndị Kraịst. Jisọs Kraịst n’onwe ya gara oriri ndị pụrụ iche, agbamakwụkwọ, na nnọkọ oriri na ọṅụṅụ ndị ọzọ. (Luk 5:27-29; Jọn 2:1-10) Ndị Kraịst oge mbụ nwekwara oge ndị ha bịakọrọ ọnụ maka ihe oriri na mkpakọrịta na-ewuli elu.—Tụlee Jud 12.
Ọ bụrụ na nne na nna gị ekwere ka ị hazie otu nnọkọ, gịnị ka ị pụrụ ime iji zere nsogbu na iji jide n’aka na onye ọ bụla nwere oge obi ụtọ? Atụmatụ e ji nlezianya mee bụ azịza ya. (Ilu 21:5) Iji maa atụ: Ọ bụ ihe ezi uche ịkpọ nanị ole n’ime ndị enyi gị a pụrụ ịchịkwa nke ọma. Ọ na-esi ike tupu nnọkọ ndị ka nta aghọọ “oriri oké mkpọtụ,” ma ọ bụ “nnọkọ na-enweghị nchịkwa.”—Ndị Galetia 5:21; Byington.
A dọrọ ndị Kraịst na narị afọ mbụ aka ná ntị izere isoro ndị “na-adịghị agazi ije” na-akpakọrịta. (2 Ndị Tesalọnaịka 3:11-15) Otu ụzọ dokwara anya isi tisaa nnọkọ taa bụ ịkpọ ndị ntorobịa a matara dị ka ndị aghara na ndị a na-apụghị ịchịkwa achịkwa. Ọ bụ ezie na i kwesịrị ilezi anya banyere ndị ị na-akpọ òkù, akpọla nanị otu ìgwè ahụ nke ndị enyi. “Dị obodobo n’obi,” gbalịakwa ịmatakwu ndị ọzọ, tinyere ndị agadi, n’ime ọgbakọ.—2 Ndị Kọrint 6:13.
Ị̀ ga-enye ihe oriri ndị dị mfe? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ bụghị iwu na ha ga-aba ụba ma ọ bụ dị oké ọnụ ahịa tupu ndị ọbịa gị enwee oge obi ụtọ. (Luk 10:38-42) “Mgbe ụfọdụ anyị na-enwe abalị achịcha e ghere eghe,” ka Sanchia, bụ́ nwa agbọghọ sitere South Africa na-ekwu. Mgbe mgbe, ndị ọbịa ga-ewepụta onwe ha iweta ihe ole na ole.
Gịnị bụ ụfọdụ ihe ndị ị pụrụ ime ná nnọkọ—e wezụga nanị ikiri TV, igere egwú, ma ọ bụ ịkparịta ụka? “Anyị na-ahazikarị uhuruchi ahụ tupu oge eruo,” ka Sanchia na-ekwu. “Anyị egwuriwo egwú ma ọ bụ nwee otu onye ga-apịrị anyị piano, ka anyị wee nwee ike ịbụkọ abụ ọnụ.” Otu onye ntorobịa bụ́ onye Africa aha ya bụ Masane na-asị: “Mgbe ụfọdụ anyị na-atụ kaadị, zụọ draft [checker], na okwè.”
Jennifer, e hotara ná mmalite, gwara Teta! sị: “Anyị nwere otu okenye n’ọgbakọ anyị nke na-akpọ anyị òkù maka igwu egwuregwu Bible. Ị ghaghị inwe ezi ihe ọmụma Bible ka i wee nwee ike ime ya nke ọma.” Onye ahụ nọchitere anya Teta! jụrụ ndị ntorobịa ọzọ, sị: “Ùnu echeghị na igwu egwuregwu Bible adịghị adaba?” Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ha nile zara n’olu dara ụda, sị, “Ee e!”
“Ọ bụ ihe ịma aka,” ka otu nwa agbọghọ nọ n’afọ iri na ụma kwuru. “Ọ bụ ikpori ndụ!” ka onye ọzọ kwuru. Mgbe a na-egwu egwuregwu Bible maka ikpori ndụ, ọ bụrụkwa na a chịkwara mmụọ nke ịsọrịta mpi, ha pụrụ inye obi ụtọ, na-akụzikwa ihe!—Lee “Ime Ka Nnọkọ Oriri Na-enye Obi Ụtọ ma Na-abakwa Uru,” ná mbipụta Teta! (Bekee) nke June 22, 1972.
Mkpori Ndụ Ezinụlọ
N’oge Bible ọ dịghị esi ike ịhụ ka ezinụlọ dị iche iche na-enwekọ ụdị ụfọdụ nke ntụrụndụ ọnụ. (Luk 15:25) Otú ọ dị, ndị na-eto eto dere akwụkwọ bụ́ The Kids’ Book About Parents na-ekwu na “ndị mụrụ ụmụ na ụmụaka na-eji ọrụ n’aka nke ukwuu n’ụbọchị ndị a nke na ọ dịghị onye nwere ohere ime atụmatụ ihe omume dị iche iche . . . Anyị chere na ọ dị ndị mụrụ ụmụ na ụmụaka mkpa ijide n’aka na ha na-eji oge ụfọdụ na-anọkọ kwa izu, na-eme ihe omume ndị bụ nanị mkpori ndụ.”
“Friday bụ ụbọchị ezinụlọ anyị,” ka otu onye ntorobịa bụ́ onye Africa aha ya bụ Paki na-ekwu. “Anyị na-egwukọkarị egwuregwu.” Ka anyị gharakwa ichefu ụmụnne gị. Bronwyn na-eto eto na-asị: “M na-anụ ụtọ isoro nwanne m nwanyị nke nta na-ese ihe ma na-eme ihe nkà ndị ọzọ.” Ị̀ pụrụ ibute ụzọ ma tụọ aro ihe omume mkpori ndụ ụfọdụ ị ga-esoro ezinụlọ gị mee?
Mgbe Ị Nọ Nanị Gị
Gịnị ma ị nọrọ nanị gị? Nke ahụ apụtaghị na ị ghaghị inwe ike ọgwụgwụ na owu ọmụma. E nwere ọtụtụ ụzọ na-arụpụta ihe, dị ụtọ nke iji oge ndị dị otú ahụ eme ihe. Dị ka ihe atụ, ihe omume ntụrụndụ. Eri oge Bible ndị ikom na ndị inyom ahụwo ịmụ egwú dị ka ihe na-enye afọ ojuju. (Jenesis 4:21; 1 Samuel 16:16, 18) “Ana m apị piano,” ka Rachel na-ekwu. “Ọ bụ ihe ị pụrụ ime mgbe i nwere ike ọgwụgwụ.” Ọ bụrụ na egwú adịghị amasị gị, ị pụrụ ịnụ ụtọ ịmụ ịkwa ákwà, ịkọ ugbo, ịchịkọta stamp, ma ọ bụ ịmụ asụsụ ala ọzọ. Dị ka ihe ntụkwasị, ị pụrụ ọbụna ịzụlite nkà ụfọdụ ndị pụrụ ịba uru n’afọ ndị dị n’ihu.
Bible na-agwa anyị na ndị ikom okwukwe, dị ka Aịsak, wepụtara oge mkpapụ iche maka ntụgharị uche. (Jenesis 24:63) Otu nwa okoro bụ́ onye Australia aha ya bụ Hans na-asị: “Site n’oge ruo n’oge, m na-apụ nnọọ gaa n’ebe dị jụụ n’ebe a gbara ogige ma nọdụ ala ikiri anyanwụ na-ada ada. Nke a na-enye m ọṅụ dị ukwuu ma na-enyere m aka inwe mmetụta nke ịnọkwu Chineke m, bụ́ Jehova nso.”
‘Ihe Ụtọ’ n’Ozi Jehova
Bible buru amụma na Kraịst ga-achọta ‘ihe ụtọ’ n’ijere Jehova Chineke ozi. (Aịsaịa 11:3) Ọ bụkwa ezie na ijere Chineke ozi dị nsọ abụghị ntụrụndụ n’ezie, ọ pụrụ ịbụ ihe na-enye ume ọhụrụ na obi ụtọ.—Matiu 11:28-30.
Hans, e hotara ná mmalite, na-echeta ahụmahụ ọzọ na-enye ọṅụ. Ọ na-asị: “Ọ na-amasị mụ na ndị enyi m icheta ngwụsị izu ndị ahụ anyị ji rụọ ọrụ n’ebe ihe owuwu nke otu Ụlọ Mgbakọ [maka ofufe]. Anyị mụtara otú e si arụkọ ọrụ ọnụ, anyị matakwara onwe anyị nke ọma karị. N’ileghachi anya azụ, anyị na-enwe mmetụta afọ ojuju na anyị mere ihe bara uru nke bụkwa mkpori ndụ.”
Akaebe nke ndị ntorobịa ndị Kraịst a na-eme ka otu eziokwu pụta ìhè: Ọ bụghị iwu na inwe oge obi ụtọ ga-akwa gị. Gbasoo ụkpụrụ Bible. Na-echepụta ihe! Na-ebute ụzọ ndị dị mma! Ị ga-achọpụta na ị ga-enwe obi ụtọ n’ụzọ ndị pụrụ iwuli gị elu, n’abụghị ịkwada gị.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . Gịnị Mere Ndị Ntorobịa Ndị Ọzọ Ji Ekpori Ndụ Otú A?” ná mbipụta anyị nke August 8, 1996.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 29]
“Nanị isoro ezi ndị enyi na-anara ikuku ndụ n’èzí na-enye obi ụtọ nke ukwuu!”
[Foto dị na peeji nke 30]
Ọ bụghị iwu na ị ga-emefurịrị nnukwu ego iji soro ndị enyi gị nwee oge obi ụtọ